10 “Unu bụ ndị àmà m,”+ ka Jehova kwuru, “ọbụna ohu m nke m họọrọ,+ ka unu wee mara,+ nweekwa okwukwe n’ebe m nọ,+ ka unu wee ghọtakwa na abụ m otu Onye ahụ.+ Ọ dịghị Chi a kpụrụ tupu mụ onwe m,+ ọ dịghịkwa nke sochiri m.+
6 “Nke a bụ ihe Jehova, bụ́ Eze Izrel,+ Onye Mgbapụta ya,+ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru, ‘Abụ m onye mbụ, abụkwa m onye ikpeazụ,+ ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ ma e wezụga m.+