21 iji mezuo ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Jeremaya,+ ruo mgbe ala ahụ debezuru ụbọchị izu ike o ji ụgwọ ya.+ O debere ụbọchị izu ike n’ụbọchị niile ọ tọgbọrọ n’efu ruo mgbe afọ iri asaa zuru.+
1N’afọ mbụ nke ọchịchị Saịrọs+ eze Peshia, ka ihe Jehova kwuru site n’ọnụ Jeremaya+ wee mezuo, Jehova kpaliri+ mmụọ Saịrọs eze Peshia, o wee mee ka a kpọsaa+ n’ebe dum ọ na-achị, deekwa ya n’akwụkwọ,+ sị:
22 ‘“A ga-eburu ha laa Babịlọn,+ ọ bụkwa n’ebe ahụ ka ha ga-adị ruo mgbe m ga-elebara ha anya,”+ ka Jehova kwuru. “M ga-ebugote ha wee bulata ha ebe a.”’”+
2 n’afọ mbụ nke ọchịchị ya, mụ onwe m, Daniel, ghọtara site n’akwụkwọ dị iche iche afọ ole Jeruselem ga-atọgbọrọ n’efu,+ ya bụ, afọ iri asaa,+ nke Jehova gwara Jeremaya onye amụma okwu ya.+
12 Mmụọ ozi Jehova wee sị: “Jehova nke ụsụụ ndị agha, olee mgbe ị ga-anọru tupu i meere Jeruselem na obodo ndị dị na Juda ebere,+ bụ́ ndị ị jụrụ kemgbe afọ iri asaa a?”+
5 “Gwa ndị niile bi n’ala a na ndị nchụàjà, sị, ‘Mgbe unu buru ọnụ+ ma kwaa ákwá arịrị n’ọnwa nke ise nakwa n’ọnwa nke asaa,+ meekwa ya ruo afọ iri asaa,+ ọ̀ bụ m n’ezie ka unu buuru ya?+