Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọpụpụ 32:32
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 32 Ma ugbu a, ọ bụrụ na ị ga-agbaghara mmehie ha,+—ma ọ́ bụghị otú ahụ, biko, hichapụ aha+ m n’akwụkwọ+ gị nke i dere.”

  • Abụ Ọma 69:28
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 28 Ka e hichapụ aha ha n’akwụkwọ nke ndị dị ndụ,+

      Ka a gharakwa ide aha ha n’ebe e dere aha ndị ezi omume.+

  • Aịzaya 4:3
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 3 Ọ ga-erukwa na a ga-asị na ndị fọdụrụ na Zayọn na ndị fọrọ na Jeruselem dị nsọ n’ebe ọ nọ,+ onye ọ bụla e dere aha ya ịdị ndụ na Jeruselem.+

  • Daniel 12:1
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 12 “N’oge ahụ, Maịkel+ ga-ebili, bụ́ nnukwu onyeisi+ ahụ nke guzo ọtọ+ n’ihi ụmụ ndị gị.+ A ga-enwekwa oge ahụhụ nke a na-enwetụbeghị kemgbe e nwere mba ruo n’oge ahụ.+ N’oge ahụ, ndị gị ga-alanahụ,+ onye ọ bụla e dere aha ya n’akwụkwọ.+

  • Ndị Filipaị 4:3
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 3 Ee, ana m arịọkwa gị, ezigbo onye so m nyara yok,+ ka ị na-enyere ụmụ nwaanyị ndị a aka, bụ́ ndị mụ na ha gbakọrọ mbọ+ ọnụ n’ozi ọma, ha na Klement na ndị ọrụ ibe m ndị ọzọ,+ ndị aha ha+ dị n’akwụkwọ nke ndụ.+

  • Ndị Hibru 12:23
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 23 ná mgbakọ ezumezu+ nakwa n’ọgbakọ nke ndị e bu ụzọ mụọ,+ bụ́ ndị e dere aha ha+ n’akwụkwọ n’eluigwe, na Chineke bụ́ Onyeikpe nke mmadụ niile,+ na ndụ ime mmụọ+ nke ndị ezi omume ndị e mere ka ha zuo okè,+

  • Mkpughe 3:5
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 5 A ga-esikwa otú ahụ yiwe onye meriri emeri+ uwe elu nke na-acha ọcha;+ m gaghịkwa ehichapụ aha ya ma ọlị n’akwụkwọ nke ndụ,+ kama m ga-ekwupụta aha ya n’ihu Nna m+ na n’ihu ndị mmụọ ozi ya.+

  • Mkpughe 13:8
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 8 Ndị niile bi n’elu ụwa ga-efekwa ya ofufe; ọ dịghị otu n’ime ha e dere aha ya n’akwụkwọ mpịakọta+ nke ndụ nke Nwa Atụrụ ahụ e gburu egbu,+ malite mgbe a tọrọ ntọala ụwa.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya