17 “E gbuwo mmụọ m,+ e mewokwa ka ụbọchị m nyụọ ka ọkụ;
Ọ bụ m ka e debeere ili.+
2 N’ezie, a na-akwa m emo,+
Anya m dịkwa n’omume nnupụisi ha.
3 Biko, ka ihe ibé m dịrị gị n’aka.+
Olee onye ọzọ ga-anara m n’ibé?+
4 N’ihi na i mechiwo obi ha ka ọ ghara inwe ezi uche.+
Ọ bụ ya mere na ị naghị ebuli ha elu.
5 O nwere ike ịgwa ndị enyi ya ka ha were òkè ha,
Ma anya ụmụ ya agakwaghị ahụ ụzọ.+
6 O mewo ka m bụrụ ihe ndị mmadụ ji atụ ilu,+
M wee ghọọ onye a na-agbụ ọnụ mmiri n’ihu.+
7 Anya m na-ahụ inyoghi inyoghi n’ihi iru uju,+
Ahụ́ m dum dịkwa ka onyinyo.
8 Ndị ziri ezi kporopụrụ anya na-ele m,
Ọbụna onye aka ya dị ọcha na-ewesa onye si n’ezi ofufe dapụ iwe.
9 Onye ezi omume na-anọgidesi ike n’ụzọ ya,+
Onye aka ya dị ọcha+ na-enwewanyekwa ume.+
10 Otú ọ dị, unu niile nweziri ike ịga n’ihu. Biko, kwuwenụ,
N’ihi na ahụghị m onye maara ihe n’etiti unu.+
11 Ụbọchị m agafewo,+ a kụghasịwokwa atụmatụ m,+
Bụ́ ọchịchọ obi m.
12 Ha na-eji abalị mere ehihie, ma na-asị:+
‘Ìhè dị nso n’ihi ọchịchịrị.’
13 Ọ bụrụ na mụ anọgide na-echere, Shiol ga-abụ ụlọ m;+
Ọ bụ n’ọchịchịrị+ ka m ga-agbasa ihe ndina m.
14 M ga-eji oké olu gwa olulu,+ sị, ‘Ị bụ nna m!’
Gwakwa ikpuru,+ sị, ‘Ị bụ nne m na nwanne m nwaanyị!’
15 Oleezi ebe olileanya m dị?+
Olileanya m kwa, ònye na-ahụ ya?
16 Ha ga-agbada ruo n’ọnụ ụzọ Shiol,
Mgbe anyị niile ga-agbadakọta n’ájá.”+