Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Abụ Solomọn 6
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Abụ Solomọn

    • MGBE NWA AGBỌGHỌ SHULEM NỌ NA JERUSELEM (3:6–8:4)

Abụ Solomọn 6:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +So 1:7; 2:16

Abụ Solomọn 6:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +So 7:10
  • +So 2:16

Abụ Solomọn 6:4

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “Ọmarịcha Obodo.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +So 1:9
  • +1Ez 14:17; 15:33
  • +Ọm 48:2
  • +So 6:10

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    11/15/2006, p. 20

Abụ Solomọn 6:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +So 1:15; 4:9; 7:4
  • +So 4:1-3

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    11/15/2006, p. 19

Abụ Solomọn 6:8

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 11:1

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    12/15/2011, p. 11

Abụ Solomọn 6:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +So 2:14

Abụ Solomọn 6:10

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Na Hibru, “nke na-eledata anya.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +So 6:4

Abụ Solomọn 6:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ek 2:5

Abụ Solomọn 6:13

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “yiri ndị na-agba egwú Mahaneyim.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +So 1:6

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Ụlọ Nche,

    11/15/2006, p. 20

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

Abụ Solo. 6:2So 1:7; 2:16
Abụ Solo. 6:3So 7:10
Abụ Solo. 6:3So 2:16
Abụ Solo. 6:4So 1:9
Abụ Solo. 6:41Ez 14:17; 15:33
Abụ Solo. 6:4Ọm 48:2
Abụ Solo. 6:4So 6:10
Abụ Solo. 6:5So 1:15; 4:9; 7:4
Abụ Solo. 6:5So 4:1-3
Abụ Solo. 6:81Ez 11:1
Abụ Solo. 6:9So 2:14
Abụ Solo. 6:10So 6:4
Abụ Solo. 6:11Ek 2:5
Abụ Solo. 6:13So 1:6
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Abụ Solomọn 6:1-13

Abụ Solomọn

6 “Nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma,

Olee ebe onye ị hụrụ n’anya gara?

Olee ebe onye ị hụrụ n’anya gawara?

Ka anyị soro gị chọwa ya.”

 2 “Onye m hụrụ n’anya gawara n’ubi ya,

N’ebe a kụrụ ahịhịa ndị na-esi ísì ọma.

Ọ gara ka ọ zụọ atụrụ n’ubi

Nakwa ka ọ kụta okooko lili.+

 3 Abụ m nke onye m hụrụ n’anya,

Onye m hụrụ n’anya bụkwa nke m.+

Ọ na-azụ atụrụ n’ebe okooko lili dị.”+

 4 “Onye m hụrụ n’anya,+ ị mara mma ka Teza.*+

Ị mara ezigbo mma ka Jeruselem.+

Ị mara nnọọ mma ka ndị agha gbakọtara ka ha gaa agha.+

 5 Kwụsị ile m anya,+

N’ihi na ọ na-eme ka ahụ́ ghara iru m ala.

Ntutu isi gị dị ka ìgwè ewu

Ndị si na Gilied na-agbadata.+

 6 Ezé gị dị ọcha ka ìgwè atụrụ

Ndị si n’ebe a sara ha ahụ́ na-apụta.

Ha niile na-amụ ejima ejima.

E nwebeghị nke ọ bụla n’ime ha nwa ya nwụrụ.

 7 Ntì gị abụọ i kpuchiri ákwà

Dị ka pomigranet a pịwara abụọ.

 8 M nwere ndị nwunye iri isii

Na ndị iko nwaanyị iri asatọ

Na ụmụ agbọghọ ndị ọzọ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ.+

 9 Ma naanị otu onye bụ nduru m,+ onye na-enweghị ntụpọ.

Ọ bụ ọpụrụiche n’anya nne ya.

Ọ bụ ya ka onye mụrụ ya kacha hụ n’anya.

Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye obi ụtọ.

Ndị nwunye eze na ndị iko eze jakwara ya mma.

10 ‘Ònye bụ nwaanyị a nke na-enwu* ka ìhè na-apụta mgbe chi na-abọ,

Nke mara mma ka ọnwa gbazuru agbazu,

Nke na-egbuke egbuke ka anyanwụ,

Nke makwara nnọọ mma ka ndị agha gbakọtara ka ha gaa agha?’”+

11 “Agbadara m n’ubi osisi ụkpa+

Ka m hụ ihe ndị puru ọhụrụ na ndagwurugwu,

Ka m hụ ma osisi vaịn ò puola,

Ma osisi pomigranet ọ̀ maala ifuru.

12 Tupu m mara ihe na-eme,

Agụụ ịhụ ihe ndị a mere ka m nọrọzie

N’ebe ụgbọ ịnyịnya ndị a ma ama n’obodo anyị dị.”

13 “Lọghachi, lọghachi, nwa agbọghọ Shulem!

Lọghachi, lọghachi,

Ka anyị kirie gị!”

“Gịnị mere unu ji na-ekiri nwa agbọghọ Shulem?”+

“O yiri ìgwè abụọ na-agba egwú.”*

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya