Abụ Solomọn
6 “Nwaanyị kacha ụmụ nwaanyị niile mma,
Olee ebe onye ị hụrụ n’anya gara?
Olee ebe onye ị hụrụ n’anya gawara?
Ka anyị soro gị chọwa ya.”
2 “Onye m hụrụ n’anya gawara n’ubi ya,
N’ebe a kụrụ ahịhịa ndị na-esi ísì ọma.
Ọ gara ka ọ zụọ atụrụ n’ubi
Nakwa ka ọ kụta okooko lili.+
Ọ na-azụ atụrụ n’ebe okooko lili dị.”+
4 “Onye m hụrụ n’anya,+ ị mara mma ka Teza.*+
Ị mara ezigbo mma ka Jeruselem.+
Ị mara nnọọ mma ka ndị agha gbakọtara ka ha gaa agha.+
Ntutu isi gị dị ka ìgwè ewu
Ndị si na Gilied na-agbadata.+
6 Ezé gị dị ọcha ka ìgwè atụrụ
Ndị si n’ebe a sara ha ahụ́ na-apụta.
Ha niile na-amụ ejima ejima.
E nwebeghị nke ọ bụla n’ime ha nwa ya nwụrụ.
7 Ntì gị abụọ i kpuchiri ákwà
Dị ka pomigranet a pịwara abụọ.
8 M nwere ndị nwunye iri isii
Na ndị iko nwaanyị iri asatọ
Na ụmụ agbọghọ ndị ọzọ a na-enweghị ike ịgụta ọnụ.+
9 Ma naanị otu onye bụ nduru m,+ onye na-enweghị ntụpọ.
Ọ bụ ọpụrụiche n’anya nne ya.
Ọ bụ ya ka onye mụrụ ya kacha hụ n’anya.
Ụmụ agbọghọ hụrụ ya kpọọ ya onye obi ụtọ.
Ndị nwunye eze na ndị iko eze jakwara ya mma.
10 ‘Ònye bụ nwaanyị a nke na-enwu* ka ìhè na-apụta mgbe chi na-abọ,
Nke mara mma ka ọnwa gbazuru agbazu,
Nke na-egbuke egbuke ka anyanwụ,
Nke makwara nnọọ mma ka ndị agha gbakọtara ka ha gaa agha?’”+
11 “Agbadara m n’ubi osisi ụkpa+
Ka m hụ ihe ndị puru ọhụrụ na ndagwurugwu,
Ka m hụ ma osisi vaịn ò puola,
Ma osisi pomigranet ọ̀ maala ifuru.
12 Tupu m mara ihe na-eme,
Agụụ ịhụ ihe ndị a mere ka m nọrọzie
N’ebe ụgbọ ịnyịnya ndị a ma ama n’obodo anyị dị.”
13 “Lọghachi, lọghachi, nwa agbọghọ Shulem!
Lọghachi, lọghachi,
Ka anyị kirie gị!”
“Gịnị mere unu ji na-ekiri nwa agbọghọ Shulem?”+
“O yiri ìgwè abụọ na-agba egwú.”*