Jeremaya
38 Shefataya nwa Matan na Gedalaya nwa Pash-họ na Jukal+ nwa Shelemaya na Pash-họ+ nwa Malkaịja nụrụ ihe Jeremaya nọ na-agwa mmadụ niile. Ọ nọ na-agwa ha, sị: 2 “Jehova kwuru, sị, ‘Mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-egbu onye nọgidere n’obodo a.+ Ma onye chịliiri ndị Kaldia aka elu* ga-adị ndụ, sikwa otú ahụ zọọ onwe ya ndụ,* ya abụrụ ụgwọ ọrụ ya.’*+ 3 Jehova kwuru, sị, ‘A ga-enyeferịrị obodo a n’aka ndị agha eze Babịlọn. Eze Babịlọn ga-ewegharakwa ya.’”+
4 Ndị isi wee gwa eze, sị: “Biko, ka e gbuo nwoke a,+ n’ihi na o ji ihe ndị a ọ na-ekwu na-akụda ndị agha fọdụrụ n’obodo a na mmadụ niile aka. N’ihi na ọ chọghị ka udo dịrị ha, kama ọ chọrọ ka ọdachi dakwasị ha.” 5 Eze Zedekaya asị ha: “Ọ nọ unu n’aka. Agaghị m egbochi unu ime ya ihe ọ bụla unu chọrọ.”
6 Ha kpụụrụ Jeremaya tụba n’olulu Malkaịja nwa eze, nke dị n’Ogige Ndị Nche.+ Ha ji ụdọ seda ya n’olulu ahụ. Mmiri adịghị n’olulu ahụ. Naanị apịtị dị na ya. Jeremaya mikpukwara n’apịtị ahụ.
7 Ibed-melek+ onye Etiopia, bụ́ ọnaozi* nke bi n’ụlọ* eze, nụrụ na ha atụbala Jeremaya n’olulu. N’oge ahụ, eze nọ ọdụ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Benjamin.+ 8 Ibed-melek wee si n’ụlọ* eze gaa ebe ahụ eze nọ ma gwa ya, sị: 9 “Onyenwe m eze, ihe a ndị a mere Jeremaya onye amụma jọgburu onwe ya. Ha tụbara ya n’olulu ka agụụ gụgbuo ya ebe ahụ, n’ihi na nri adịghịzi n’obodo a.”+
10 Eze gwaziri Ibed-melek onye Etiopia, sị: “Kpọrọ mmadụ iri atọ ebe a, gaa kpọpụta Jeremaya onye amụma n’olulu ahụ ka ọ ghara ịnwụ ebe ahụ.” 11 Ibed-melek wee kpọrọ ndị ahụ banye n’ụlọ* eze, ha agaa n’okpuru ebe a na-edowe akụ̀,+ chịrị nkịrịka ákwà na iberibe ákwà ndị kara nkà ebe ahụ ma kegide ha n’ụdọ sedatara ya Jeremaya n’olulu ahụ. 12 Ibed-melek onye Etiopia wee gwa Jeremaya, sị: “Biko, tinye nkịrịka ákwà ndị a na iberibe ákwà ndị a e kegidere n’ụdọ a na mkpaabụ gị abụọ.” Jeremaya mekwara otú ahụ. 13 Ha jikwa ụdọ ahụ dọpụta Jeremaya n’olulu ahụ. Jeremaya nọgidekwara n’Ogige Ndị Nche.+
14 Eze Zedekaya ziri ozi, a kpọtara ya Jeremaya onye amụma ebe a na-akpọ ụzọ mbanye nke atọ, nke dị n’ụlọ Jehova, eze agwa Jeremaya, sị: “E nwere ihe m chọrọ ịjụ gị. Ezorola m ihe ọ bụla.” 15 Jeremaya asị Zedekaya: “Ọ bụrụ na mụ agwa gị, ị ga-egbu m. Ọ bụrụkwa na mụ enye gị ndụmọdụ, ị gaghị ege m ntị.” 16 Eze Zedekaya wee ṅụọrọ Jeremaya iyi na nzuzo, sị: “Eji m Jehova, bụ́ Chineke dị ndụ, onye nyere anyị ndụ a anyị dị, na-aṅụ iyi na agaghị m egbu gị. Agaghịkwa m enyefe gị n’aka ndị a na-achọ igbu gị.”*
17 Jeremaya gwaziri Zedekaya, sị: “Jehova, Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Ọ bụrụ na ị chịliere ndị ahụ eze Babịlọn mere ndị isi aka elu,* ị* ga-adịrị ndụ na-aga. A gaghị agba obodo a ọkụ. E nweghịkwa ihe ga-eme gị na ezinụlọ gị.+ 18 Ma, ọ bụrụ na ị chịlirighị ndị ahụ eze Babịlọn mere ndị isi aka elu,* a ga-enyefe obodo a n’aka ndị Kaldia. Ha ga-agba ya ọkụ.+ Ị gaghịkwa agbapụ n’aka ha.’”+
19 Eze Zedekaya wee gwa Jeremaya, sị: “M na-atụ ndị Juu gbakwuuru ndị Kaldia ụjọ, n’ihi na ọ bụrụ na e nyefee m n’aka ha, ha nwere ike imenyụ m anya.” 20 Ma Jeremaya sịrị: “A gaghị enyefe gị n’aka ha. Biko, mee ihe a m na-agwa gị Jehova kwuru. I mee ya, ihe ga-agaziri gị. Ị* ga-adịrịkwa ndụ na-aga. 21 Ma ị jụ ịchịliri ha aka elu,* ihe a Jehova gosiri m n’ọhụụ ga-eme: 22 A ga-akpọrọ ụmụ nwaanyị niile fọrọ n’ụlọ* eze Juda kpọtara ndị eze Babịlọn mere ndị isi,+ ụmụ nwaanyị ahụ ana-asịkwa,
Ha emeela ka ụkwụ gị mikpuo n’apịtị.
Ha agbaghachikwala azụ.’
23 Ha ga-akpọnye ndị Kaldia ndị nwunye gị niile na ụmụ gị. Ị gaghị agbapụnahụ ha, kama, eze Babịlọn ga-akpara gị aka.+ A ga-agbakwa obodo a ọkụ n’ihi gị.”+
24 Zedekaya gwaziri Jeremaya, sị: “Agwakwala onye ọ bụla ihe ndị a, ka ị ghara ịnwụ. 25 Ọ bụrụ na ndị isi anụ na mụ na gị kwurịtara okwu, ha abịa sị gị, ‘Biko, gwa anyị ihe ị gwara eze. Ezorola anyị ihe ọ bụla. Anyị agaghị egbu gị.+ Gịnị ka eze gwara gị?’ 26 Sị ha, ‘M nọ na-arịọ eze ka ọ ghara ịkpọghachi m n’ụlọ Jehonatan ka m ghara ịnwụ ebe ahụ.’”+
27 Mgbe e mechara, ndị isi niile bịakwutere Jeremaya ma jụwa ya ajụjụ. Ya agwa ha ihe niile eze gwara ya kwuo. N’ihi ya, ha agwaghị ya ihe ọ bụla, maka na e nweghị onye n’ime ha nụrụ ihe ya na eze kwurịtara. 28 Jeremaya bigidere n’Ogige Ndị Nche+ ruo ụbọchị e weghaara Jeruselem. Ọ nọ ebe ahụ e weghara Jeruselem.+