Ilu
Nwa ma ihe na-eme nna ya obi ụtọ,+
Ma nwa nzuzu na-eme ka nne ya na-eru uju.
3 Jehova agaghị ekwe ka agụụ gụgbuo onye ezi omume,+
Ma ọ ga-eme ka ndị ajọ omume ghara inweta ihe na-agụsi ha ike.
5 Nwa na-aghọta ihe na-achịkọta ihe ubi n’oge okpomọkụ,
Ma nwa iberiibe na-anọ n’ezigbo ụra n’oge a na-ewe ihe ubi.+
10 Onye na-atabi anya iji ghọgbuo mmadụ na-eme ka ndị ọ na-aghọgbu ruwe uju,+
Onye na-ekwu okwu nzuzu ga-alakwa n’iyi.+
11 Okwu* onye ezi omume na-eme ka mmadụ dị ndụ;+
Ma okwu onye ajọ omume na-eme ka a ghara ịmata ihe ọjọọ dị ya n’obi.+
13 Ihe onye na-aghọta ihe na-ekwu na-egosi na ọ ma ihe,+
Ma e mere ụtarị maka azụ onye na-enweghị uche.+
15 Akụ̀ onye bara ọgaranya nwere bụụrụ ya obodo a rụsiri ike.
Ịda ogbenye na-ala ndị ogbenye n’iyi.+
16 Ihe onye ezi omume na-eme ga-eme ka ọ dị ndụ,
Ma ihe onye ajọ omume na-eme ga-eme ka ọ na-eme mmehie.+
17 Onye na-anabata aka ná ntị a dọrọ ya na-eme ka ndị ọzọ dị ndụ,*
Ma onye na-anaghị eji mba a baara ya kpọrọ ihe na-edufu ndị ọzọ.
18 Onye na-eme ka a ghara ịmata na ọ kpọrọ mmadụ asị na-agha ụgha.+
Onye na-akọsa akụkọ ọjọọ* banyere ndị ọzọ dị nzuzu.
19 Mgbe mmadụ na-ekwu ọtụtụ okwu, ọ ga-emerịrị mmehie,+
Ma onye na-ejide ọnụ ya aka na-egosi na o nwere uche.+
21 Ihe onye ezi omume na-ekwu na-abara ọtụtụ ndị uru,*+
Ma onye nzuzu na-anwụ maka na o nweghị uche.+
25 Mgbe oké ifufe ga-efe, onye ajọ omume ga-ala n’iyi,+
Ma onye ezi omume dị ka ntọala ga-adịru mgbe ebighị ebi.+
26 Otú ahụ mmanya gbara ụka si egbu ezé, anwụrụ ọkụ ana-afụkwa ụfụ n’anya,
Ka ihe onye umengwụ na-eme si agbakasị onye dunyere ya ozi* ahụ́.
27 Ịtụ egwu Jehova na-eme ka mmadụ dị ogologo ndụ,+
Ma a ga-eme ka ndị ajọ omume ghara ịdịte ndụ aka.+
28 Ihe ndị ezi omume na-atụ anya ya* ga-eme ka ha ṅụrịa ọṅụ,+
Ma ihe ndị ajọ omume na-atụ anya ya agaghị enwe isi.+
31 Ihe juru onye ezi omume ọnụ bụ okwu amamihe,
Ma a ga-ebepụ ire onye na-ekwu okwu ọjọọ.
32 Onye ezi omume na-ekwu ihe dị mma,
Ma ihe juru ndị ajọ omume ọnụ bụ okwu ọjọọ.