Joshụa
21 Ndị isi ọnụmara ọ bụla n’ebo Livaị wee bịakwute Elieza+ onye nchụàjà, Joshụa nwa Nọn, na ndị isi n’ezinụlọ ọ bụla n’ebo dị iche iche n’Izrel. 2 Ha bịakwutere ha na Shaịlo+ n’ala Kenan, gwa ha, sị: “Jehova gwara Mosis ka o kwuo ka e nye anyị obodo anyị ga-ebi, nakwa ala ebe anụmanụ anyị ga na-ata ahịhịa.”+ 3 Ndị Izrel wee mee ihe Jehova kwuru, nye ndị Livaị obodo dị iche iche+ na ala ebe anụmanụ ha ga na-ata ahịhịa.+
4 Nza nke mbụ e fere bụ maka ezinụlọ ụmụ Kohat.+ Mgbe e fere ya, e si n’ebo Juda,+ n’ebo Simiọn,+ nakwa n’ebo Benjamin+ nye ụmụ Erọn onye nchụàjà, bụ́ ndị Livaị, obodo iri na atọ.
5 E sikwa n’ala ezinụlọ niile nke ebo Ifrem,+ ebo Dan, na ọkara ebo Manase+ nye ụmụ Kohat fọrọnụ obodo iri.
6 E sikwa n’ala ezinụlọ niile nke ebo Ịsaka, ebo Asha, ebo Naftalaị, na ọkara ebo Manase ndị bi na Beshan,+ nye ụmụ Geshọn+ obodo iri na atọ.
7 E si n’ebo Ruben, n’ebo Gad, nakwa n’ebo Zebulọn+ nye ụmụ Meraraị+ obodo iri na abụọ, n’ezinụlọ n’ezinụlọ.
8 Otú a ka ndị Izrel si fee nza, nye ndị Livaị obodo ndị a na ala ebe anụmanụ ha ga na-ata ahịhịa, otú Jehova gwara Mosis ka ha mee.+
9 Ha si n’ebo Juda na n’ebo Simiọn nye ha obodo ndị a a kpọrọ aha ebe a.+ 10 E nyere ha ụmụ Erọn, ndị si n’ezinụlọ ụmụ Kohat, bụ́ ụmụ Livaị, n’ihi na ọ bụ ha ka nza nke mbụ dabaara. 11 Ha nyere ha Kiriat-aba+ (Aba a bụ nna Anak), ya bụ, Hebrọn,+ nke dị n’ala Juda bụ́ ugwu ugwu, nakwa ala dị iche iche ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. 12 Ma, ha nyere Keleb nwa Jefune ala obodo ahụ na ógbè ya niile ka ha bụrụ nke ya.+
13 Ha nyekwara ụmụ Erọn onye nchụàjà obodo onye gburu mmadụ ga-agbaba.+ Ha nyere ha Hebrọn+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Libna+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 14 Jatia+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, Eshtemoa+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 15 Holọn+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, Diba+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 16 Eyin+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, Jọta+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, na Bet-shimesh na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. E si n’ebo abụọ ahụ nye ha obodo itoolu a.
17 E sikwa n’ebo Benjamin nye ha Gibiọn+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, Giba na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa,+ 18 Anatọt+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Almọn na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo anọ.
19 Obodo niile e nyere ụmụ Erọn onye nchụàjà dị iri na atọ, ha na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa.+
20 E fekwara nza, si n’ebo Ifrem nye ndị fọrọ n’ezinụlọ ụmụ Kohat, bụ́ ndị Livaị, obodo ụfọdụ. 21 Ha nyere ha obodo onye gburu mmadụ ga-agbaba.+ Ha nyere ha Shikem+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nke dị n’ala Ifrem bụ́ ugwu ugwu, Giza+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 22 Kibzeyim na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Bet-horọn+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo anọ.
23 E sikwa n’ebo Dan nye ha Elteke na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, Gibetọn na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 24 Aịjalọn+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Gat-rimọn na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo anọ.
25 E sikwa n’ọkara ebo Manase nye ha Teanak+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa nakwa Gat-rimọn na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo abụọ.
26 Obodo niile na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa ndị ezinụlọ ụmụ Kohat fọrọnụ nwetara dị iri.
27 E sikwa n’ọkara ebo Manase nye ụmụ Geshọn,+ bụ́ ezinụlọ ụmụ Livaị, obodo onye gburu mmadụ ga-agbaba. E nyere ha Golan,+ nke dị na Beshan, na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa nakwa Bieshtera na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo abụọ.
28 E sikwa n’ebo Ịsaka+ nye ha Kishiọn na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, Daberat+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 29 Jamọt na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa En-ganim na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo anọ.
30 E sikwa n’ebo Asha+ nye ha Maịshal na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, Abdọn na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 31 Helkat+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Rihọb+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo anọ.
32 E sikwa n’ebo Naftalaị nye ha obodo onye gburu mmadụ ga-agbaba.+ E nyere ha Kidesh,+ nke dị na Galili, na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, Hamọt-dọọ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Katan na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo atọ.
33 Obodo niile e nyere ụmụ Geshọn, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, dị obodo iri na atọ, ha na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa.
34 Ha sikwa n’ebo Zebulọn+ nye ezinụlọ ụmụ Meraraị,+ bụ́ ndị Livaị fọrọnụ, Jọkniam+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, Kata na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 35 Dimna na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Nahalal+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo anọ.
36 Ha sikwa n’ebo Ruben nye ha Biza+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, Jehaz na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa,+ 37 Kedemọt na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Mefat na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo anọ.
38 Ha sikwa n’ebo Gad+ nye ha obodo onye gburu mmadụ ga-agbaba. E nyere ha Remọt, nke dị na Gilied,+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, Mahaneyim+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, 39 Heshbọn+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa, nakwa Jeza+ na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Ha dị obodo anọ.
40 Obodo niile e nyere ụmụ Meraraị, n’ezinụlọ n’ezinụlọ, bụ́ ndị fọrọ n’ezinụlọ ụmụ Livaị, dị obodo iri na abụọ.
41 Obodo niile e si n’ala ndị Izrel ndị ọzọ nye ndị Livaị dị iri anọ na asatọ, ha na ala ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa.+ 42 Nke ọ bụla n’ime obodo ndị a nwere ala dị iche iche ebe anụmanụ ga na-ata ahịhịa. Otú a ka obodo ndị a niile dị.
43 Otú a ka Jehova si nye ndị Izrel ala niile ọ ṅụrụ iyi na ọ ga-enye ndị nna nna ha.+ Ha weghaara ha, birikwa na ha.+ 44 Jehova mekwara ka ha zuru ike n’ebe ọ bụla ha nọ, otú ọ ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na ọ ga-eme.+ O nweghịkwa onye iro ha ọ bụla ha na-emerighị.+ Jehova nyefere ndị iro ha niile n’aka ha.+ 45 O nweghị otu n’ime ọmarịcha nkwa niile Jehova kwere ndị Izrel nke na-emezughị. Ha niile mezuchara.+