Levitikọs
21 Jehova wee gwa Mosis, sị: “Gwa ndị nchụàjà, bụ́ ụmụ Erọn okwu, sị ha, ‘Ka onye nchụàjà ọ bụla ghara imerụ onwe ya n’ihi onye nwụrụ anwụ* n’ime ndị Izrel.*+ 2 Ma, o nwere ike imerụ onwe ya n’ihi onye ikwu ya nke ya na ya bụ otu ọbara, ya bụ, nne ya, nna ya, nwa ya nwoke, nwa ya nwaanyị ma ọ bụ nwanne ya nwoke. 3 O nwekwara ike imerụ onwe ya n’ihi nwanne ya nwaanyị ya na ya bi ma ọ bụrụ na nwanne ya nwaanyị ahụ amabeghị nwoke ma ọ bụkwanụ lụọ di. 4 Ọ gaghị emerụ onwe ya wee bụrụ onye na-adịghị nsọ n’ihi nwaanyị otu n’ime ndị Izrel lụrụ. 5 Ha agaghị akpụchapụ isi ha+ ma ọ bụ kpụchapụ ọnụ afụ ọnụ* ha ma ọ bụkwanụ bekasịa ahụ́ ha.+ 6 Ha ga-abụrụ Chineke ha ndị dị nsọ.+ Ha agaghị emebi aha Chineke ha+ n’ihi na ọ bụ ha na-achụrụ Jehova àjà ndị a na-esu ọkụ, bụ́ achịcha* Chineke ha. Ha ga-adị nsọ.+ 7 Ha agaghị alụ akwụna+ ma ọ bụ nwaanyị e merụrụ emerụ ma ọ bụkwanụ nwaanyị di ya gbara alụkwaghịm,+ n’ihi na onye nchụàjà dị nsọ n’anya Chineke ya. 8 Unu ga-ewere ya ka onye dị nsọ+ n’ihi na ọ bụ ya na-ewetara Chineke unu achịcha. Unu ga-ewere ya ka onye dị nsọ n’ihi na mụnwa bụ́ Jehova, onye kpọpụtara unu iche ka unu dị nsọ, dị nsọ.+
9 “‘Ọ bụrụ na nwa nwaanyị onye nchụàjà mụrụ agbaa akwụna wee merụọ onwe ya, ọ bụ nna ya ka o mechuru ihu. A ga-egbu nwa ahụ ma kpọọ ya ọkụ.+
10 “‘Onye bụ́ onyeisi nchụàjà n’ime ụmụnne ya, onye e tere mmanụ,+ onye a họpụtakwara ka o yiri uwe onyeisi nchụàjà,+ agaghị ahapụ isi ya n’edozighị ya edozi. Ọ gaghịkwa adọwa uwe ya.+ 11 Ọ gaghị abịa onye ọ bụla nwụrụ anwụ* nso.+ Ọ gaghịdị emerụ onwe ya n’ihi nne ya ma ọ bụ nna ya. 12 Ọ gaghị apụ n’ụlọikwuu. Ọ gaghịkwa emerụ ụlọikwuu Chineke ya+ n’ihi na ihe àmà nke na-egosi na e nyefeela ya n’aka Chineke, bụ́ mmanụ Chineke ya tere ya,+ dị n’isi ya. Abụ m Jehova.
13 “‘Ọ bụ nwaanyị na-amaghị nwoke ka ọ ga-alụ.+ 14 Ọ gaghị alụ nwaanyị di ya nwụrụ, nwaanyị a gbara alụkwaghịm, nwaanyị e merụrụ emerụ ma ọ bụkwanụ akwụna. Kama ọ ga-esi ná ndị Izrel lụrụ nwaanyị na-amaghị nwoke. 15 Ọ gaghị eme ihe ga-emerụ nwa* ya n’ime ndị Izrel,+ n’ihi na abụ m Jehova, onye mere ka ọ dị nsọ.’”
16 Jehova gwakwara Mosis, sị: 17 “Gwa Erọn, sị, ‘E nweghị nwa* gị nwoke ọ bụla n’ọgbọ ha niile ga-abịa ka ọ chụọrọ Chineke ya achịcha n’àjà ma ọ bụrụ na o nwere nkwarụ. 18 Ọ bụrụ na e nwere nwoke nwere nkwarụ, ọ gaghị abịa ịchụrụ Chineke achịcha n’àjà, ya bụ, nwoke kpuru ìsì ma ọ bụ nwoke dara ngwọrọ ma ọ bụ nwoke ihu ya hịgọrọ ahịgọ* ma ọ bụ nwoke otu aka ya ma ọ bụ otu ụkwụ ya dị ogologo karịa ibe ya, 19 ma ọ bụ nwoke ụkwụ ya ma ọ bụ aka ya gbajiri agbaji, 20 ma ọ bụ nwoke nwere mkpumkpu azụ ma ọ bụ nwoke bụ́ akpụda* ma ọ bụ nke ihe mere n’anya ma ọ bụ nke ụ́gwọ̀ mere n’ahụ́ ma ọ bụ nke nwere ọkpụisi eri ngo ma ọ bụ nke mkpụrụ amụ ya mebiri emebi.+ 21 E nweghị nwoke ọ bụla nwere nkwarụ bụ́ nwa* Erọn onye nchụàjà ga-abịa ịchụ àjà Jehova ndị a na-esu ọkụ. Ebe ọ bụ na o nwere nkwarụ, ọ gaghị abịa ịchụrụ Chineke achịcha n’àjà. 22 O nwere ike iri achịcha Chineke ya, ya bụ, achịcha si n’ihe ndị kacha nsọ+ nakwa n’ihe ndị dị nsọ.+ 23 Ma, ọ gaghị abịa ákwà mgbochi ahụ nso.+ Ọ gaghịkwa abịa nso n’ebe ịchụàjà+ maka na o nwere nkwarụ. Ọ gaghịkwa emerụ ụlọikwuu m+ n’ihi na abụ m Jehova, onye na-eme ka ha dị nsọ.’”+
24 Mosis wee gwa Erọn na ụmụ ya ndị nwoke nakwa ndị Izrel niile ihe ndị a.