Akwụkwọ Ozi E Degaara Ndị Hibru
3 N’ihi ya, ụmụnna m ndị dị nsọ, ndị so ná ndị a kpọrọ òkù ịga eluigwe,+ cheenụ echiche banyere onyeozi na nnukwu onye nchụàjà, onye anyị na-ekwusa banyere ya, ya bụ, Jizọs.+ 2 O rubeere Onye họpụtara ya isi+ otú Mosis rubere isi mgbe ọ na-eje ozi n’ụlọ Onye ahụ.+ 3 N’ihi na e weere na o* ruru eru ka e nye ya otuto+ karịa Mosis, ebe ọ bụ na a na-akwanyere onye rụrụ ụlọ ùgwù karịa ụlọ ọ rụrụ. 4 N’eziokwu, ụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya, ma onye rụrụ ihe niile bụ Chineke. 5 Mgbe Mosis na-eje ozi n’ụlọ Onye ahụ, o rubere isi ka onye ozi. Ozi o jere gbara akaebe banyere ihe ndị a ga-emecha kwuo okwu ha. 6 Ma Kraịst rubere isi ka ọkpara+ na-elekọta ụlọ Chineke. Anyị bụ ụlọ Onye ahụ+ ma ọ bụrụ na anyị ejiri obi ike na-ekwu okwu ma na-enwe olileanya ahụ anyị ji anya isi ruo n’ọgwụgwụ.
7 N’ihi ya, dị ka e si n’ike mmụọ nsọ kwuo,+ sị: “Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya, 8 unu akpọchila obi unu otú nna nna unu hà mere mgbe ha kpasuru m ezigbo iwe, otú ha mere n’ụbọchị ha nwara m n’ala ịkpa,+ 9 bụ́ ebe nna nna unu hà nọ nwaa m ọnwụnwa, leekwa m ule n’agbanyeghị na ha hụrụ ihe ndị m mere ruo afọ iri anọ.+ 10 Ọ bụ ya mere ihe ọgbọ a ji wee m iwe. M wee sị: ‘Ha na-eme isi ike, na-eme naanị ihe dị ha n’obi, ha amatabeghịkwa m.’ 11 M wee jiri iwe ṅụọ iyi, sị: ‘Ha agaghị eso m zuo ike.’”+
12 Ụmụnna m, lezienụ anya ka onye ọ bụla n’ime unu ghara ịhapụ Chineke dị ndụ,+ nke ga-eme ka onye ahụ nwee ajọ obi na-enweghị okwukwe. 13 Ma, na-agbanụ ibe unu ume kwa ụbọchị ebe ọ bụ na anyị ka bi n’oge ahụ a kpọrọ “Taa,”+ ka onye ọ bụla n’ime unu wee ghara ikwe ka ike dị aghụghọ nke mmehie mee ka obi ya kpọchie. 14 N’ihi na, n’eziokwu, anyị ga-eketa ihe Kraịst ketara naanị ma anyị na-enwe obi ike anyị nwere ná mmalite ruo n’ọgwụgwụ.+ 15 Dị ka e kwuru, sị: “Taa, ọ bụrụ na unu egee ntị n’olu ya, unu akpọchila obi unu otú nna nna unu hà mere mgbe ha kpasuru m ezigbo iwe.”+
16 N’ihi na olee ndị nụrụ olu ya ma kpasuo ya oké iwe? Ọ̀ bụ na ọ bụghị ndị niile Mosis si n’Ijipt dupụta?+ 17 Oleekwa ndị nọ na-akpasu Chineke iwe ruo afọ iri anọ?+ Ọ̀ bụ na ọ bụghị ndị ahụ mere mmehie, ndị nwụrụ n’ala ikpa?+ 18 Oleekwa ndị ọ ṅụrụ iyi na ha agaghị eso ya zuo ike? Ọ̀ bụ na ọ bụghị ndị ahụ nupụrụ isi? 19 N’ihi ya, anyị ahụla na ha enweghị ike iso ya zuo ike maka na ha enweghị okwukwe.+