Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Emọs 1:1-9:15
  • Emọs

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Emọs
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Emọs

EMỌS

1 Ihe a gwara Emọs* n’ọhụụ gbasara Izrel. Emọs so ná ndị Tekoa+ na-azụ atụrụ. A gwara ya ihe a n’oge Eze Ọzaya+ na-achị Juda nakwa n’oge Jeroboam+ nwa Joash+ bụ eze Izrel. Ọ hụrụ ọhụụ a afọ abụọ tupu e nwee ala ọma jijiji.+ 2 Ọ sịrị:

“Jehova ga-esi na Zayọn bigbọọ.

Ọ ga-esikwa na Jeruselem mee ka a nụ olu ya.

Ala anụmanụ na-ata ahịhịa, nke ndị ọzụzụ atụrụ na-edu atụrụ ha aga, ga-eru uju.

Ahịhịa ndị dị n’elu elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa.”+

 3 “Jehova kwuru, sị:

‘“N’ihi isi ndị Damaskọs nupụrụ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,

N’ihi na ha ji ígwè e ji eticha ọka tipịa Gilied.+

 4 M ga-eme ka ọkụ gbaa ụlọ Hazel,+

Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile nke Ben-hedad.+

 5 M ga-agbaji ihe e ji atụchi Damaskọs.+

M ga-ebibi ndị bi na Bikat-evin,

Bibiekwa onye nọ na Bet-iden na-achị.*

A ga-adọrọkwa ndị Siria n’agha laa Kia.”+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.’

 6 Jehova kwukwara, sị:

‘“N’ihi isi ndị Gaza nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,

N’ihi na ha kpọọrọ ndị niile a dọọrọ n’agha+ kpọnye Ịdọm.

 7 M ga-eme ka ọkụ gbaa mgbidi Gaza,+

Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu ya niile.

 8 M ga-ebibi ndị bi n’Ashdọd,+

Bibiekwa onye nọ n’Ashkelọn+ na-achị.*

M ga-ata Ekrọn+ ahụhụ.

Ndị Filistia fọrọnụ ga-alakwa n’iyi.”+ Ọ bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.’

 9 Jehova kwukwara, sị:

‘N’ihi isi ndị Taya nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,

N’ihi na ha kpọọrọ ndị niile a dọọrọ n’agha kpọnye Ịdọm,

Nakwa n’ihi na ha echetaghị ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne.+

10 N’ihi ya, m ga-eme ka ọkụ gbaa mgbidi Taya.

Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu ya niile.’+

11 Jehova kwuru, sị:

‘N’ihi isi ndị Ịdọm nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,

N’ihi na ha ji mma agha chụọ ụmụnne ha ọsọ,+

Nakwa n’ihi na ha emereghị ha ebere.

Ha ji iwe na-adọri ha n’akwụsịghị akwụsị,

Ha bukwaara ha iwe n’obi mgbe niile.+

12 N’ihi ya, m ga-eme ka ọkụ gbaa Timan.+

Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile nke Bọzra.’+

13 Jehova kwuru, sị:

‘“N’ihi isi ndị Amọn nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,

N’ihi na ha bọwara ụmụ nwaanyị Gilied dị ime afọ iji nwetakwuo ala.+

14 N’ihi ya, m ga-amụnye mgbidi Raba+ ọkụ.

Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu ya niile.

A ga-eti mkpu agha n’ụbọchị agha.

Oké ifufe ga-efekwa n’ụbọchị oké ifufe mmiri.

15 A ga-adọrọ eze ha n’agha, dọrọkwa ndị o mere ndị isi.”*+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.’

2 “Jehova kwuru, sị:

‘“N’ihi isi ndị Moab nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,

N’ihi na ha gbara ọkpụkpụ eze Ịdọm ọkụ, ya aghọọ ntụ.

 2 N’ihi ya, m ga-eme ka ọkụ gbaa Moab.

Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile nke Kiriọt.+

Moab ga-anwụkwa n’oge ọgba aghara,

Mgbe a na-eti mkpu agha, na-afụkwa opi.+

 3 M ga-ewepụ onye na-achị* ya.

M ga-egbu ya na ndị niile o mere ndị isi.”*+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’

 4 Jehova kwukwara, sị:

‘N’ihi isi ndị Juda nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,

N’ihi na ha jụrụ iwu Jehova

Nakwa n’ihi na ha esoghị ntụziaka ya.+

Ma ihe mere ka ha kpafuo bụ ụgha e ji mara ndị nna nna ha.+

 5 N’ihi ya, m ga-eme ka ọkụ gbaa Juda.

Ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile dị na Jeruselem.’+

 6 Jehova kwuru, sị:

‘N’ihi isi ndị Izrel nupụrụ+ ugboro ugboro,* m gaghị ahapụ ime ha ihe m kpebiri ime ha,

N’ihi na ha rere onye ezi omume iji nweta ọlaọcha,

Reekwa ogbenye iji nweta akpụkpọ ụkwụ.+

 7 Ha na-azọgide isi ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha n’ájá.+

Ha anaghị emeso ndị dị umeala n’obi otú ha kwesịrị isi emeso ha.+

Nna na nwa ya na-akwaso otu nwa agbọghọ iko,

Na-emebi aha nsọ m.

 8 Ha na-anara mmadụ uwe n’ibé ma ha binye onye ahụ ego,+ yirikwa ya gbatịa onwe ha n’akụkụ ebe ịchụàjà ọ bụla.+

Mmanya ha natara ndị ha riri iwu ka ha na-aṅụ n’ụlọ chi ha.’

 9 ‘Ma, ọ bụ m kpochapụrụ ndị Amọraịt n’ihu ha,+

Ndị toro ogologo ka osisi sida, ndị sikwara ike ka osisi ook.

M bibiri mkpụrụ ha ndị dị n’elu ha nakwa mgbọrọgwụ ha ndị dị n’ime ala.+

10 M si n’Ijipt kpọpụta unu.+

Emekwara m ka unu gaa ije afọ iri anọ n’ala ịkpa,+

Ka unu wee weghara ala ndị Amọraịt.

11 M họpụtara ụfọdụ n’ime ụmụ unu ka ha bụrụ ndị amụma,+

Họpụtakwa ụfọdụ n’ime ụmụ okorobịa unu ka ha bụrụ ndị Naziraịt.+

Ndị Izrel, ọ̀ bụ ụgha?’ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.

12 ‘Ma unu nọ na-enye ndị Naziraịt mmanya ka ha ṅụọ.+

Unu nyekwara ndị amụma iwu, sị: “Unu ebula amụma.”+

13 N’ihi ya, m ga-egwepịa unu n’ala unu

Otú ụgbọala e bujuru ọka si egwepịa ihe dị n’okpuru ya.

14 Onye na-awụ ajọ ọsọ agaghị enwe ebe ọ ga-agbaga.+

Ike agaghị adị onye siri ike.

O nweghịkwa onye agha ga-azọli onwe ya ndụ.*

15 Onye na-agba ụta agaghị eguzoli.

Onye na-awụ ajọ ọsọ agaghị enwe ike ịgbalaga.

Onye na-agba ịnyịnya agaghị azọli onwe ya ndụ.*

16 Onye agha nke kachadị akata obi

Ga-agbara ọtọ gbalaga n’ụbọchị ahụ.’+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.”

3 “Ndị Izrel, nụrụnụ ihe a Jehova kwuru gbasara unu, gbasara ezinụlọ niile o si n’Ijipt kpọpụta. Ọ sịrị:

 2 ‘Naanị unu ka m ma n’ezinụlọ niile dị n’ụwa.+

Ọ bụ ya mere m ga-eji kpọọ unu ka unu zaa ajụjụ maka mmehie niile unu mere.+

 3 Mmadụ abụọ hà ga-eso gaa ihe ma ọ bụrụ na ha ebughị ụzọ kpaa ebe ha ga-ezukọ?*

 4 Ọdụm ọ̀ ga-agbọ ụja n’oké ọhịa ma ọ bụrụ na ọ hụghị anụ ọ ga-eri?

Ọdụm ọ̀ ga-aba mba n’ebe o zoro ma ọ bụrụ na ọ nwụdeghị ihe ọ bụla?

 5 Nnụnụ ọ̀ ga-ama n’ọnyà dị n’ala ma ọ bụrụ na e siirighị ya ọnyà?*

Ọnyà ọ̀ ga-akụchi ma ọ bụrụ na ọ mataghị ihe ọ bụla?

 6 Ọ bụrụ na a fụọ opi n’obodo, ọ̀ bụ na ndị mmadụ anaghị ama jijiji?

Ọ bụrụ na e nwee ọdachi n’obodo, ọ́ bụghị Jehova kpatara ya?

 7 N’ihi na Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova agaghị eme ihe ọ bụla

Ma ọ bụrụ na o bughị ụzọ mee ka ndị amụma ya mara ihe ọ na-achọghị ka ndị ọzọ mara.+

 8 Ọdụm agbọọla ụja,+ olee onye na-agaghị atụ egwu?

Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ekwuola okwu, olee onye na-agaghị ebu amụma?’+

 9 ‘Kwusaanụ ya n’ụlọ elu niile dị n’Ashdọd

Nakwa n’ụlọ elu niile dị n’Ijipt.

Sịnụ: “Zukọtanụ n’elu ugwu niile dị na Sameria.+

Hụnụ ọgba aghara juru na ya,

Hụkwanụ otú e si na-erigbu ndị mmadụ na ya.+

10 N’ihi na ha amaghị otú e si eme ihe ziri ezi.” Ihe a ka Jehova kwuru.

“Ha na-eji ihe ndị mmadụ ha bukọọrọ n’ike akwaju ụlọ elu ha.”’

11 N’ihi ya, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị,

‘Onye iro ga-agba ala gị gburugburu.+

Ọ ga-emekwa ka ike gwụ gị.

A ga-ebukọrọkwa ihe ndị dị n’ụlọ elu gị niile.’+

12 Jehova kwuru, sị,

‘Otú ahụ onye ọzụzụ atụrụ na-anapụta ụkwụ abụọ ma ọ bụ otu ibe ntị atụrụ ya n’ọnụ ọdụm,

Otú ahụ ka a ga-anapụta ụmụ Izrel,

Ya bụ, ndị nọ ọdụ ugbu a na Sameria n’elu oche mara mma nakwa n’elu àkwà* mara mma.’*+

13 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha, kwuru, sị, ‘Nụrụnụ, dọọkwanụ ụlọ Jekọb aka ná ntị.’*

14 ‘N’ihi na n’ụbọchị m ga-akpọ Izrel ka ha zaa ajụjụ maka isi ha nupụrụ,*+

M ga-ebibikwa ebe ịchụàjà ndị dị na Betel.+

M ga-egbujipụ mpi ndị dị n’ebe ịchụàjà ahụ, ha adaa n’ala.+

15 M ga-akwatu ụlọ a na-anọ n’oge oyi nakwa ụlọ a na-anọ n’oge okpomọkụ.’

‘Ụlọ ndị e ji ọdụ́ rụọ ga-ala n’iyi.+

A ga-ebibikwa nnukwu ụlọ dị iche iche.’*+ Ihe a ka Jehova kwuru.”

4 “Ụmụ nwaanyị ndị bi n’ugwu Sameria,+ nụrụnụ ihe m na-ekwu.

Unu dị ka ehi Beshan.

Unu na-erigbu ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha,+ na-echikwa ndị ogbenye ọnụ n’ala.

Unu na-asịkwa ndị di unu,* ‘Nyenụ anyị mmanya ka anyị ṅụọ.’

 2 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, onye dị nsọ, aṅụọla iyi,* sị,

‘“Oge na-abịa mgbe a ga-eji nko onye na-egbu anụ kolie unu elu,

Jirikwa nko azụ̀ kolie ndị fọdụrụ n’ime unu elu.

 3 Onye ọ bụla n’ime unu ga-esi n’ebe a kwaturu akwatu ná mgbidi, nke dị ya n’ihu, pụọ.

A ga-achụgakwa unu Hamọn.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’

 4 ‘Bịanụ na Betel mebie iwu.*+

Bịakwanụ na Gilgal mebie iwu ọtụtụ ugboro.+

Wetanụ àjà unu+ n’ụtụtụ.

Wetakwanụ otu ụzọ n’ụzọ iri unu+ n’ụbọchị nke atọ.

 5 Jirinụ achịcha koro eko chụọ àjà iji kelee Chineke.+

Kọsaanụ onyinye si unu n’obi unu na-enye,

N’ihi na ọ bụ ihe na-adị unu mma, unu ndị Izrel.’ Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ihe a.

 6 ‘M mere ka unu gbara ọnụ* n’obodo unu niile,

Meekwa ka nri kọọ n’ụlọ niile unu bi.+

Ma unu alọghachikwuteghị m.’+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.

 7 ‘M mekwara ka mmiri ghara izoro unu mgbe ọ fọrọ ọnwa atọ ka e wee ihe ubi.+

M mekwara ka mmiri zoo n’otu obodo, ma emeghị m ka o zoo n’obodo ọzọ.

Mmiri zoro n’otu ibé ala,

Ma ibé ala mmiri na-ezoghị na ya kpọrọ nkụ.

 8 Ndị si n’obodo abụọ ma ọ bụ atọ nọ na-adagharị na-aga n’otu obodo ka ha ṅụọ mmiri.+

Ha aṅụjughịkwa afọ.

Ma unu alọghachikwuteghị m.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.

 9 ‘Emere m ka ihe unu kụrụ kpọnwụọ, maakwa ebu.+

Unu mere ka ubi vaịn unu na ubi unu ndị ọzọ dị ọtụtụ,

Ma igurube ripịara osisi fig unu na osisi oliv unu.+

Ma unu alọghachikwuteghị m.’+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.

10 ‘Eziteere m unu ọrịa na-efe efe, ụdị nke rịara Ijipt.+

Eji m mma agha gbuo ụmụ okorobịa unu,+ kpụrụkwa ịnyịnya unu.+

Emekwara m ka ísì ọjọọ nke na-esi n’ebe unu mara ụlọikwuu siba unu n’imi.+

Ma unu alọghachikwuteghị m.’ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.

11 ‘M bibiri ala unu,

Otú mụnwa, bụ́ Chineke, bibiri Sọdọm na Gọmọra.+

Unu wee dị ka nkụ a lọpụtara n’ọkụ.

Ma unu alọghachikwuteghị m.’+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.

12 N’ihi ya, Izrel, m ga-ata gị ahụhụ ọzọ.

Izrel, ebe ọ bụ na m ga-eme gị ihe a,

Jikere ka gị na Chineke gị hụ.

13 N’ihi na ọ bụ ya bụ Onye kere ugwu niile+ na Onye kere ifufe.+

Ọ na-agwa ụmụ mmadụ ihe dị ya n’obi.

Ọ na-eme ka chi bọrọ abọ ghọọ ọchịchịrị.+

Ọ na-aga ije n’ebe ndị dị elu n’ụwa.+

Jehova, bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ aha ya.”

5 “Ndị Izrel, nụrụnụ ihe a m ji abụ iru uju na-agwa unu:

 2 ‘Izrel adaala.*

Ọ gaghị ebiliteli ọzọ.

A gbahapụla ya n’ala ya.

O nweghị onye ga-ekulite ya.’

3 “N’ihi na ihe a ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru:

‘Otu narị ndị agha ga-afọdụrụ obodo chị otu puku ndị agha gaa agha.

Ọ bụkwa ndị agha iri ga-afọdụrụ obodo chị otu narị ndị agha gaa agha. Ihe a ga-eme ndị Izrel.’+

4 “N’ihi na Jehova gwara ndị Izrel, sị:

‘Chọọnụ m ka unu wee dịrị ndụ.+

 5 Unu achọla Betel.+

Unu agakwala Gilgal+ ma ọ bụ banye Bia-shiba,+

N’ihi na o nweghị ihe ga-eme ka a ghara ịdọrọ Gilgal n’agha.+

Betel agaghịzikwa adị.*

 6 Chọọnụ Jehova, ka unu wee dịrị ndụ,+

Ka ọ ghara irepịa ndị si n’ezinụlọ Josef otú ọkụ si erepịa ihe,

Repịakwa Betel n’enweghị onye ga-emenyụ ya.

 7 Unu na-eme ka ikpe ziri ezi ghọọ ahịhịa na-elu ilu.

O nweghịkwa ihe unu ji ezi omume kpọrọ.+

 8 Jehova bụ aha Onye kere ìgwè kpakpando Kaịma*

Na ìgwè kpakpando Kisịl,*+

Onye na-agbanwe oké ọchịchịrị ka ọ ghọọ ụtụtụ,+

Onye mere ehihie ka ọ gbaa ọchịchịrị dị ka abalị,

Onye na-eme ka oké osimiri gbakọta

Ka ọ wụsa ya n’elu ala.+

 9 Ọ ga-eme ka e bibie onye siri ike n’otu ntabi anya,

Bibiekwa ebe ndị a rụsiri ike.

10 Ha kpọrọ ndị na-adọ ndị mmadụ aka ná ntị n’ọnụ ụzọ ámá obodo asị.

Ha kpọkwara ndị na-ekwu eziokwu asị.+

11 N’ihi na unu na-achọ ka ogbenye nye unu ego maka ubi.*

Unu na-anarakwa ya ọka* ka ọ bụrụ ụtụ ọ tụrụ.+

Unu agaghị anọgide na-ebi n’ụlọ unu ji nkume a wara awa rụọ.+

Unu agaghịkwa aṅụ mmanya si n’ubi vaịn unu ndị mara mma.+

12 N’ihi na ama m ugboro ole unu nupụrụ isi*

Nakwa otú mmehie unu jọruru ná njọ.

Unu na-enye ndị ezi omume nsogbu.

Unu na-anara aka azụ.*

Unu anaghịkwa ekwe ka ndị ogbenye nọ n’ọnụ ụzọ ámá obodo nweta ihe ruuru ha.+

13 N’ihi ya, ndị na-aghọta ihe ga-agba nkịtị n’oge ahụ,

N’ihi na ọ ga-abụ oge ọdachi.+

14 Chọọnụ ezi ihe, unu achọla ihe ọjọọ,+

Ka unu wee dịrị ndụ.+

Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha ga-anọnyekwara unu,

Otú unu kwuru na ọ na-eme.+

15 Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, hụkwanụ ezi ihe n’anya.+

Kpeekwanụ ikpe ziri ezi n’ọnụ ụzọ ámá obodo.+

Ikekwe Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha

Ga-emere ndị fọdụrụ n’ụlọ Josef amara.’+

16 “N’ihi ya, Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Jehova, kwuru, sị:

‘A ga na-eti mkpu arịrị n’ámá niile.

Ha ga na-etikwa n’okporo ámá niile, sị: “Ewoo, ewoo!”

Ha ga-akpọ ndị ọrụ ubi ka ha ruo uju,

Gookwa ndị ọrụ ha bụ ibe ákwá ka ha bee ákwá arịrị.’

17 Jehova kwukwara, sị, ‘A ga na-eti mkpu arịrị n’ubi vaịn ọ bụla,+

N’ihi na m ga-esi n’etiti unu gafee.’

18 ‘Ndị agụụ ụbọchị Jehova na-agụsi ike ga-ata ahụhụ.+

Gịnị ka unu na-atụ anya ga-eme n’ụbọchị Jehova?+

Ọ ga-abụ ụbọchị ọchịchịrị, ọ bụghị ụbọchị ìhè.+

19 Ọ ga-adị ka mgbe ọdụm na-achụ mmadụ ọsọ, onye ahụ ana-agba zute anụ ọhịa bea.

Mgbe ọ gbabakwara n’ụlọ ya tụkwasị aka n’ahụ́ ụlọ, agwọ ataa ya.

20 Ọ̀ bụ na ụbọchị Jehova agaghị abụ ọchịchịrị, kama ịbụ ìhè?

Ọ̀ bụkwa na itiri agaghị agba na ya, kama ìhè ịdị?

21 Akpọrọ m ememme niile unu asị. Ha na-asọ m oyi.+

Ísì anụ unu na-achụ n’àjà ná nzukọ ukwu unu anaghị amasị m.

22 Ọ bụrụgodị na unu achụọrọ m àjà a na-esucha ọkụ, nyekwa m onyinye,

Ha agaghị atọ m ụtọ,+

M gaghịkwa anabata àjà udo unu ji anụ gbara agba na-achụ.+

23 Kwụsịnụ ịbụ abụ unu ji na-eme mkpọtụ.

Ka m gharakwa ịnụ ụda egwú dị ụtọ unu ji ụbọ akwara unu na-akpọ.+

24 Meenụ ka ikpe ziri ezi na-asọ ka mmiri,+

Ka ezi omume dịkwa ka iyi na-anaghị ata ata.

25 Ndị Izrel, ò nwere mgbe unu chụụrụ m àjà

Ma ọ bụ nye m onyinye n’afọ iri anọ unu nọrọ n’ala ịkpa?+

26 Ugbu a, unu ga-eburu Sakọt bụ́ eze unu pụọ, burukwa Kaịwan.*

Ihe ndị a bụ arụsị ndị unu mere, bụrụkwa chi kpakpando, ndị unu meere onwe unu.

27 M ga-emekwa ka a dọrọ unu n’agha gaa n’ebe dị anya karịa Damaskọs.’+ Onye aha ya bụ Jehova, bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha,+ kwuru ihe a.”

6 “Ndị tụkwasịrị onwe ha obi na Zayọn ga-ata ahụhụ,

Ha na ndị chere na o nweghị ihe ga-eme ha n’ugwu Sameria.+

Ha bụ ndị a na-anụ aha ha ná mba ndị a kacha mara,

Ndị ụlọ Izrel na-agakwuru.

 2 Gaanụ Kalne ka unu hụ ihe na-eme.

Sikwanụ ebe ahụ gaa Hemat+ bụ́ Obodo Ukwu.

Gbadaanụ Gat nke dị na Filistia.

Ọ̀ bụ ha ka alaeze ndị a* mma?

Ka ala ha ọ̀ ka ala unu?

 3 Ùnu na-ewepụ ụbọchị ọdachi n’obi unu?+

Ùnu na-eme ka tigbuo zọgbuo na-achị unu?+

 4 Unu na-edina n’àkwà* ndị e ji ọdụ́ rụọ,+ na-agbatịkwa onwe unu n’àkwà* unu.+

Unu na-esi n’ìgwè atụrụ were ụmụ ebule rie, na-erikwa ụmụ ehi* gbara agba.+

 5 Unu na-abụ abụ na-abaghị uru mgbe unu na-anụ ụda ụbọ akwara,+

Na-arụkwa ngwá egwú otú Devid rụrụ.+

 6 Unu ji efere na-aṅụ mmanya.+

Unu na-etekwa onwe unu mmanụ kacha mma.

Ma ọdachi dakwasịrị Josef+ emetụghị unu n’ahụ́.*

 7 N’ihi ya, unu ga-abụ ndị mbụ a ga-adọrọ n’agha.+

Unu ga-akwụsịkwa oriri oké mkpọtụ unu na-eri na-agbatị onwe unu n’àkwà.*

 8 ‘Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ejirila onwe ya* ṅụọ iyi.’+ Ihe a ka Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha kwuru,

‘“Mpako Jekọb dị+ na-asọ m oyi,

Akpọkwara m ụlọ elu ya niile asị.+

M ga-enyefekwa obodo ya na ihe juru na ya n’aka ndị iro ya.+

9 “‘“Ọ bụrụkwa na ụmụ nwoke iri afọdụ n’otu ụlọ, ha ga-anwụ. 10 Onye ikwu* ha ga-abịa bupụ ha ma kpọọ ha ọkụ otu otu. Ọ ga-esi n’ụlọ ahụ chịpụta ọkpụkpụ ha. Ọ ga-asịkwa onye ọ bụla nọ n’ime ime ụlọ ahụ, ‘Ò nwere onye ọzọ gị na ya nọ?’ Onye ahụ ga-asịkwa ya, ‘O nweghị.’ Ọ ga-asịzi, ‘Gba nkịtị, n’ihi na ugbu a abụghị oge e ji akpọ aha Jehova.’”

11 Jehova nye iwu,+

A ga-akụ nnukwu ụlọ righirighi,

Kụriekwa obere ụlọ.+

12 Ịnyịnya ọ̀ na-agba ọsọ n’elu nnukwu nkume?

Ka mmadụ ọ̀ ga-eji ehi kọọ ihe na ya?

Unu emeela ka ikpe ziri ezi ghọọ ahịhịa na-egbu mmadụ,

Meekwa ka mkpụrụ ezi omume ghọọ ahịhịa na-elu ilu.+

13 Unu na-aṅụrị ọṅụ n’ihi ihe na-abaghị uru,

Unu na-asịkwa: “Ọ́ bụghị anyị mere onwe anyị ka anyị dị ike?”*+

14 N’ihi ya, ndị Izrel, m ga-eme ka otu mba bịa lụso unu agha.+

Ha ga-emegbukwa unu malite na Libo-hemat*+ ruo na Ndagwurugwu* Araba.’ Ọ bụ ihe Jehova bụ́ Chineke nke ụsụụ ndị agha kwuru.”

7 Ihe a ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gosiri m: O mere ka ìgwè igurube pụta n’oge mkpụrụ ndị a ghara n’ikpeazụ* malitere ipulite. Ha bụ mkpụrụ ndị a ghara n’ikpeazụ mgbe e gbutechaara eze ahịhịa. 2 Mgbe igurube ndị ahụ tachara ahịhịa dị n’ala a, m sịrị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, biko, gbaghara.+ Ebe ọ bụ na Jekọb esighị ike, olee otú ọ ga-esi dịrị ndụ?”*+

3 N’ihi ya, Jehova gbanwere obi ya n’ihe a.*+ Jehova kwuru, sị: “Ọ gaghị eme.”

4 Ihe a ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gosiri m: Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru ka e jiri ọkụ taa ala ahụ ahụhụ. Ọkụ wee repịa nnukwu ogbu mmiri, repịakwa ibé ala ahụ. 5 M wee sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, biko, o zuola.+ Ebe ọ bụ na Jekọb esighị ike, olee otú ọ ga-esi dịrị ndụ?”*+

6 N’ihi ya, Jehova gbanwere obi ya n’ihe a.*+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị: “Nke ahụkwa agaghị eme.”

7 Ihe a ka o gosiri m: Jehova guzo ná mgbidi, e jikwa eriri e ji ama ma ihe ọ̀ kwụ ọtọ tụọ mgbidi ahụ mgbe a na-arụ ya. O jikwa eriri ahụ n’aka. 8 Jehova wee sị m: “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” M wee sị: “Eriri e ji ama ma ihe ọ̀ kwụ ọtọ.” Jehova asịzie: “Ana m etinye eriri a n’ebe ndị Izrel bụ́ ndị m nọ. M gaghịzi agbaghara ha.+ 9 Ebe ndị dị elu Aịzik rụrụ+ ga-aghọ ikpo nkume. A ga-alakwa ụlọ nsọ dị iche iche dị n’Izrel n’iyi.+ M ga-ejikwa mma agha bibie ezinụlọ Jeroboam.”+

10 Amazaya onye nchụàjà Betel+ zigaara Jeroboam+ eze Izrel ozi a: “Emọs nọ n’ihu ndị Izrel na-agba izu ihe a ga-eme gị.+ Ihe niile o kwuru na-agba ndị bi n’ala a agba ná ntị.+ 11 Ihe a bụ ihe Emọs kwuru, ‘A ga-eji mma agha gbuo Jeroboam. E nweghịkwa ihe ga-eme ka a ghara isi n’ala ndị Izrel dọrọ ha n’agha.’”+

12 Amazaya wee sị Emọs: “Onye ọhụụ, gbara ọsọ gawa Juda. Kpawa afọ gị* ebe ahụ, nọrọkwa ebe ahụ buwe amụma.+ 13 Ebuzila amụma na Betel,+ n’ihi na ọ bụ ụlọ nsọ nke eze+ nakwa ebe ụlọ nsọ nke alaeze dị.”

14 Emọs wee sị Amazaya: “Abụghị m onye amụma na mbụ, abụghịkwa m nwa onye amụma. Kama abụ m onye na-azụ atụrụ+ nakwa onye na-elekọta* mkpụrụ fig nke osisi sịkamọ. 15 Ma, Jehova si ebe m nọ na-azụ atụrụ kpọrọ m. Jehova gwakwara m, sị, ‘Gaa buoro Izrel bụ́ ndị m amụma.’+ 16 Ugbu a, nụrụ ihe Jehova kwuru: ‘Ị na-asị, “Ebula amụma na e nwere ihe a ga-eme Izrel.+ Ekwusakwala na e nwere ihe a ga-eme ezinụlọ Aịzik.”+ 17 N’ihi ya, ihe a ka Jehova kwuru: “Nwunye gị ga-aghọ akwụna n’obodo. A ga-ejikwa mma agha gbuo ụmụ gị ndị nwoke na ụmụ gị ndị nwaanyị. A ga-ejikwa ụdọ e ji atụ̀ ihe kerie ala gị. Ị ga-anwụkwa n’ala na-adịghị ọcha. O nweghịkwa ihe ga-eme ka a ghara isi n’ala ndị Izrel dọrọ ha n’agha.”’”+

8 Ihe a ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova gosiri m: Otu nkata ihe dị na ya bụ mkpụrụ osisi mịrị n’oge ọkọchị. 2 O wee sị: “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” M wee sị: “Ọ bụ nkata ihe dị na ya bụ mkpụrụ osisi mịrị n’oge ọkọchị.” Jehova gwaziri m, sị: “Ọgwụgwụ Izrel bụ́ ndị m eruola. M gaghịzi agbaghara ha.+ 3 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘N’ụbọchị ahụ, abụ a na-abụ n’ụlọ nsọ ga-abụ ibe ákwá arịrị.+ A ga-atụsasị ozu ebe niile+ nke na mkpọtụ ọ bụla agaghị adị.’

 4 Nụrụnụ ihe a, unu ndị na-azọgbu ụmụ ogbenye,

Ndị na-ekpochapụkwa ndị dị umeala n’obi n’ụwa,+

 5 Ndị na-asị, ‘Olee mgbe ụbọchị ememme ọnwa ọhụrụ ga-agafe+ ka anyị ree ọka?*

Oleekwa mgbe Ụbọchị Izu Ike+ ga-agafe ka anyị bupụta ọka ree?

Ka anyị wee mee ka efa* e ji atụ̀ ihe dịkwuo ntakịrị,

Meekwa ka shekel* ole a na-ere ihe gbagoo,

Jirikwa ihe wayo e ji atụ̀ ihe ghọgbuo ndị mmadụ.+

 6 Ka anyị wee jiri ọlaọcha zụrụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha,

Jirikwa otu akpụkpọ ụkwụ zụrụ ụmụ ogbenye,+

Ka anyị reekwa ọka na-abaghị uru ọ bụla.’

 7 Jehova, Onye Jekọb ji anya isi,+ ejirila onwe ya ṅụọ iyi, sị,

‘O nweghị mgbe m ga-echefu ihe niile ha mere.+

 8 Ọ bụ nke a mere ala* ga-eji maa jijiji.

Onye ọ bụla bi na ya ga-erukwa uju.+

Ọ́ gaghị eto ka Osimiri Naịl,

Maliekwa elu ma talata ka Osimiri Naịl dị n’Ijipt?’+

 9 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘N’ụbọchị ahụ,

M ga-eme ka anyanwụ daa n’etiti ehihie,

Meekwa ka ọchịchịrị gbaa n’ala a n’ụbọchị ihu ígwé gbachapụrụ agbachapụ.+

10 M ga-eme ka ụbọchị unu ji eme ememme unu ghọọ ụbọchị iru uju,+

Meekwa ka abụ unu niile ghọọ abụ iru uju.

M ga-eme ka mmadụ niile kee ákwà iru uju n’úkwù, meekwa ka isi mmadụ niile kwọchaa.

M ga-eme ka ọ dịrị ka mgbe a na-eruru nwa nwoke a mụrụ naanị ya uju.

N’ikpeazụ, ọ ga-adị ka ụbọchị onye ọ bụla na-ata ahụhụ.’

11 Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, sị, ‘Oge na-abịa

Mgbe m ga-eme ka e nwee agụụ n’ala a.

Ọ bụghị agụụ nri ma ọ bụ agụụ mmiri,

Kama ọ bụ nke ịnụ okwu Jehova.+

12 Ha ga na-adagharị si n’oké osimiri ruo n’oké osimiri,

Sikwa n’ebe ugwu ruo n’ebe ọwụwa anyanwụ.

Ha ga na-awagharị na-achọ okwu Jehova, ma ha agaghị achọta ya.

13 N’oge ahụ, ụmụ agbọghọ mara mma, ndị na-amaghị nwoke, ga-atụbọ,

Ụmụ okorobịa ga-atụbọkwa, n’ihi na akpịrị na-akpọ ha nkụ.

14 Ha bụ ndị ji mmehie Sameria+ na-aṅụ iyi, ndị na-asị:

“Dan, otú ahụ o doro anya na chi gị dị ndụ,”+

Na-asịkwa, “Otú ahụ o doro anya na ụzọ Bia-shiba+ na-adịgide.”

Ha ga-ada, ha agaghị ebili ọzọ.’”+

9 Ahụrụ m Jehova+ ka ọ nọ n’elu ebe ịchụàjà, sị: “Tie ihe n’isi ogidi ji ụlọ, ụlọ ahụ ga-amakwa jijiji. Kụpụ isi ogidi ahụ, m ga-ejikwa mma agha gbuo onye fọdụrụ n’ime ha. O nweghị onye n’ime ha ga-agbapụ. O nweghịkwa onye chọrọ ịgbapụ ga-agbalaga.+

 2 Ọ bụrụ na ha egwuo ala banye n’ime ili,*

Aka m ga-esi ebe ahụ kpụrụ ha.

Ọ bụrụkwa na ha agaa eluigwe,

M ga-esi ebe ahụ chụda ha.

 3 Ọ bụrụ na ha ezoo n’elu ugwu Kamel,

M ga-achọ ha nke ọma n’ebe ahụ, jidekwa ha.+

Ọ bụrụkwa na ha ezoo n’ala ala oké osimiri ka m ghara ịhụ ha,

M ga-agwa agwọ ka ọ taa ha n’ebe ahụ.

 4 Ọ bụrụ na ndị iro ha adọrọ ha n’agha,

M ga-agwa mma agha ka o gbuo ha, ọ ga-egbukwa ha ebe ahụ.+

M ga-eme ka anya m dị n’ebe ha nọ iji mee ha ihe ọjọọ, ọ bụghị imere ha ihe ọma.+

 5 Ọ bụ Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kpara ala* a aka,

O wee gbazee.+ Ndị niile bi na ya ga-erukwa uju.+

Ọ ga-etokwa ka Osimiri Naịl,

Talatakwa ka Osimiri Naịl dị n’Ijipt.+

 6 ‘Jehova bụ aha+

Onye na-arụ ụzọ e si aga n’eluigwe,

Na-arụkwa ihe o ji ekpuchi ụwa,

Onye na-eme ka oké osimiri gbakọta,

Ka ọ wụsa ya n’elu ala.’+

 7 ‘Ndị Izrel, ọ̀ bụ na unu adịghị ka ụmụ Kush n’anya m?’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.

‘Ọ̀ bụ na esighị m n’Ijipt kpọpụta Izrel,+

Si na Krit kpọpụta ndị Filistia,+ sikwa na Kia kpọpụta Siria?’+

 8 ‘Anya Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova na-ele alaeze na-eme mmehie.

Ọ ga-ekpochapụkwa ya n’elu ala.+

Ma, ọ gaghị ekpochapụ ndị si n’ezinụlọ Jekọb kpamkpam.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.

 9 ‘N’ihi na m na-enye iwu

Ka a chụsasịa ndị Izrel ná mba niile,+

Si otú ahụ yọgharịa ha otú mmadụ si ayọgharị myọ,

Ma, otu obere okwute agaghị ada n’ala.

10 A ga-eji mma agha gbuo ndị m niile na-eme mmehie,

Ndị na-asị: “Ọdachi agaghị abịaru anyị nso ma ọ bụ rute anyị.”’

11 ‘N’oge ahụ, m ga-ebulite ụlọ ndò* Devid+ dara ada,

Rụziekwa ebe* ndị a kwadara akwada.

M ga-arụzi ebe ndị e bibiri ebibi na ya.

M ga-arụghachi ha ka ha dịrị otú ha dị ọtụtụ afọ gara aga,+

12 Ka ndị m weghara ihe fọdụrụ n’Ịdọm,+

Wegharakwa mba niile na-aza aha m.’ Ọ bụ Jehova, onye na-eme ihe a, kwuru ya.

13 Jehova kwukwara, sị, ‘Oge na-abịa

Mgbe ọ ga-abụ, tupu e wechaa ihe niile dị n’ubi, oge e ji akọ ihe ga-eru.

Tupu a zọchaa mkpụrụ vaịn niile, oge e ji agha mkpụrụ ga-eru.+

Mmanya dị ụtọ ga-esi n’ugwu ukwu na-atapụta.+

Ugwu nta niile ga na-agbapụtakwa mmanya.*+

14 M ga-akpọlata ndị m Izrel a dọọrọ n’agha.+

Ha ga-arụzikwa obodo ndị tọgbọ chakoo ma biri n’ime ha.+

Ha ga-akọ ubi vaịn ma ṅụọ mmanya si na ha,+

Kọọkwa ubi ma rie mkpụrụ si na ha.’+

15 ‘M ga-akụ ha n’ala ha dị ka mkpụrụ.

A gaghị efopụkwa ha ọzọ

N’ala ha nke m nyere ha.’+ Ọ bụ Jehova bụ́ Chineke unu kwuru ihe a.”

Emọs pụtara “Onye Bụ́ Ibu” ma ọ bụ “Iburu Ibu.”

Na Hibru, “isi Damaskọs nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”

Na Hibru, “onye ji mkpanaka eze na Bet-iden.”

Na Hibru, “isi Gaza nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”

Na Hibru, “onye ji mkpanaka eze n’Ashkelọn.”

Na Hibru, “isi Taya nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”

Na Hibru, “isi Ịdọm nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”

Na Hibru, “isi Amọn nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”

O nwere ike ịbụ, “ụmụ eze.”

Na Hibru, “isi Moab nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”

Na Hibru, “onyeikpe.”

O nwere ike ịbụ, “ụmụ eze.”

Na Hibru, “isi Juda nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”

Na Hibru, “isi Izrel nupụrụ ugboro atọ na ugboro anọ.”

Ma ọ bụ “ga-azọpụtali mkpụrụ obi ya.”

Ma ọ bụ “azọpụtali mkpụrụ obi ya.”

Ma ọ bụ “ha ebughị ụzọ yie agba.”

O nwere ike ịbụ, “e nweghị ihe e ji rata ya.”

Ma ọ bụ “ihe ndina.”

Ma ọ bụ “n’elu àkwà Damaskọs.”

Ma ọ bụ “kwuokwanụ ihe ọjọọ ụlọ Jekọb mere.”

Ma ọ bụ “ihe ọjọọ ha mere.”

O nwere ike ịbụ, “ọtụtụ ụlọ.”

Ma ọ bụ “ndị nna ukwu unu.”

Na Hibru, “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova aṅụọla iyi n’ịdị nsọ ya.”

Ma ọ bụ “nupụ isi.”

Ma ọ bụ “unu ghara inwe ihe unu ga-eri.”

Na Hibru, “Nwa agbọghọ na-amaghị nwoke, bụ́ Izrel, adaala.”

O nwere ike ịbụ, “Betel ga-aghọkwa ebe a na-eme anwansi.”

O nwere ike ịbụ kpakpando Pledis ndị dị n’ìgwè kpakpando a na-akpọ Tọrọs.

O nwere ike ịbụ ìgwè kpakpando a na-akpọ Ọrayọn.

Ma ọ bụ “tụọ ụtụ maka ala.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Ma ọ bụ “unu mere ihe ọjọọ.”

Ma ọ bụ “Unu na-eri ngarị.”

Arụsị ndị a nwere ike ịbụ kpakpando a na-akpọ Satọn, nke e ji mere chi.

Ọ ga-abụ alaeze Juda na Izrel.

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”

Ma ọ bụ “ụmụ oké ehi.”

Na Hibru, “emeghị ka ha daa ọrịa.”

Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”

Na Hibru, “Nwanne nna.”

Na Hibru, “Ọ́ bụghị ike anyị ka anyị ji nweta mpi?”

Ma ọ bụ “n’ebe e si abanye Hemat.”

Gụọ Nkọwa Okwu.

Ya bụ, mkpụrụ ndị a ghara n’ọnwa Jenụwarị na Febụwarị.

Na Hibru, “bilie?”

Ma ọ bụ “ihe a wutere Jehova.”

Na Hibru, “bilie?”

Ma ọ bụ “ihe a wutere Jehova.”

Na Hibru, “Riwe ihe.”

Ma ọ bụ “onye na-arụpusị.”

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.

Gụọ B14.

Gụọ B14.

Ma ọ bụ “ụwa.”

Ma ọ bụ “Shiol.” Gụọ Nkọwa Okwu.

Ma ọ bụ “ụwa.”

Ma ọ bụ “ụlọikwuu.”

Ma ọ bụ “ebe ha.”

Na Hibru, “ga-agbazekwa.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya