AKWỤKWỌ OZI NKE ABỤỌ E DEGAARA TIMOTI
1 Abụ m Pọl. Ọ bụkwa uche Chineke ka m bụrụ onyeozi Kraịst Jizọs, ka m nwee ike ịgwa ndị ọzọ gbasara nkwa Chineke kwere inye ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs ndụ.+ 2 M na-edetara gịnwa bụ́ Timoti, nwa m hụrụ n’anya,+ akwụkwọ ozi a:
Ka Chineke bụ́ Nna nakwa Kraịst Jizọs Onyenwe anyị meere gị amara na ebere, meekwa ka udo dịrị gị.
3 Ana m ekele Chineke, onye m na-efe* otú nna nna m hà fere. Akọnuche m anaghịkwa ama m ikpe ka m na-efe ya. Ọ bụ ya mere m ji echeta gị, ehihie na abalị, mgbe ọ bụla m na-arịọsi Chineke arịrịọ ike. 4 M cheta anya mmiri gị, ịhụ gị agụsiwe m ike, ka obi wee bụrụ m sọ aṅụrị. 5 N’ihi na m na-echeta okwukwe na-abụghị nke ihu abụọ i nwere.+ Nne nne gị bụ́ Lọịs na nne gị bụ́ Yunis bu ụzọ nwee ụdị okwukwe a. Obi sikwara m ike na ị ka nwere ya.
6 Ọ bụ ya mere m ji na-echetara gị ka i jiri onyinye Chineke nyere gị mgbe m bikwasịrị gị aka n’isi kpọrọ ihe mgbe niile.+ 7 N’ihi na mmụọ nsọ Chineke nyere anyị anaghị eme ka anyị tụwa ụjọ,+ kama, ọ na-enye anyị ike,+ na-eme ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya, na-emekwa ka anyị na-ele ihe anya otú dị mma. 8 N’ihi ya, ka ihere ịgba àmà banyere Onyenwe anyị ghara ime gị,+ ka ihere gharakwa ime gị maka na a tụrụ m mkpọrọ n’ihi Onyenwe anyị. Kama, ka obi sie gị ike na Chineke ga-enye gị ike+ idi ahụhụ a ga-ata gị+ n’ihi ozi ọma ị na-ezisa. 9 Ọ zọpụtara anyị ma kpọọ anyị ka anyị dịrị nsọ,+ ọ bụghị n’ihi àgwà anyị, kama n’ihi nzube ya na amara ya.+ Ọ dịla ezigbo anya o si n’aka Kraịst Jizọs meere anyị amara a. 10 Ma, ọ bụ ugbu a Kraịst Jizọs, Onye Nzọpụta anyị, pụtara ìhè ka e mere ka amara a e meere anyị doo anya.+ Ọ bụ Jizọs wepụrụ ọnwụ+ ma jiri ozi ọma o zisara+ mee ka anyị mara otú anyị ga-esi dịrị ndụ+ ma ghara ire ure.+ 11 Ọ bụ maka ozi ọma a ka e ji họpụta m ka m na-ekwusa ya, na-akụzi ya, bụrụkwa onyeozi.+
12 Ọ bụkwa n’ihi ozi ọma a ka m ji na-ata ahụhụ ndị a,+ ma ọ naghị eme m ihere.+ N’ihi na ama m onye m kweere na ya, obi sikwara m ike na ọ ga-echebeli ihe m nyefere n’aka ya ruo ụbọchị ikpe.+ 13 Jidesie ụdị eziokwu m kụziiri gị aka ike.+ Na-egosi na i nwere okwukwe, nakwa na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya n’ihi na ị bụ onye na-eso ụzọ Kraịst Jizọs. 14 Ka mmụọ nsọ nyere gị aka ka i jiri ezigbo ihe a e nyefere n’aka gị kpọrọ ihe.+
15 Ị ma na ndị niile nọ ná mpaghara Eshia+ agbakụtala m azụ. Faịjelọs na Hemọjinis so na ha. 16 Ka Onyenwe anyị* meere Onesịfọrọs na ezinụlọ ya+ ebere, n’ihi na ọ gbara m ume ugboro ugboro. Agbụ ígwè e kere m emeghịkwa ya ihere. 17 Ọ bụ ya mere na mgbe ọ bịara Rom, ọ chọsiri m ike wee chọta m. 18 Ka Onyenwe anyị Jehova* meere ya ebere n’ụbọchị ikpe. Ị makwa nke ọma gbasara ihe niile o meere m n’Efesọs.
2 Nwa m,+ ka amara Chineke na-emere ndị na-eso ụzọ Kraịst Jizọs mee ka ị na-enweta ike. 2 Ihe ị nụrụ n’ọnụ m, nke ọtụtụ ndị gbakwara akaebe ya,+ kụziere ya ndị a tụkwasịrị obi, ndị ga-erukwa eru nke ọma ịkụziri ya ndị ọzọ. 3 Na-edi ahụhụ a na-ata gị+ n’ihi na ị bụ ezigbo onye agha+ Kraịst Jizọs. 4 Onye agha anaghị etinye aka n’ọrụ ọzọ e ji akpa ego,* n’ihi na ọ chọrọ ime ihe ga-amasị onye debara aha ya ka ọ bụrụ onye agha. 5 Ọ bụrụkwa n’egwuregwu asọmpi, a naghị enye onye so na ya ihe nrite* ma ọ bụrụ na o rubeghị isi n’iwu na-achị asọmpi ahụ.+ 6 Onye ọrụ ubi nke na-arụsi ọrụ ike kwesịrị ịbụ onye mbụ ga-eri mkpụrụ ọ kụrụ. 7 Na-echebara ihe m na-ekwu echiche mgbe niile. Onyenwe anyị ga-eme ka ị ghọta ihe niile.
8 Cheta na a kpọlitere Jizọs Kraịst n’ọnwụ+ nakwa na ọ bụ nwa Devid.*+ Ozi ọma a ka m na-ezisa.+ 9 Ọ bụ n’ihi ya ka m ji na-ata ahụhụ. Ọ bụkwa ya mere e ji tụọ m mkpọrọ dị ka à ga-asị na m bụ onye omekome.+ Ma, e keghị okwu Chineke agbụ.+ 10 Ọ bụ ihe a mere m ji na-atachi obi n’ihe niile maka ndị Chineke họọrọ,+ ka e wee si n’aka Kraịst Jizọs zọpụtakwa hanwa, ha adịrịkwa ebube ruo mgbe ebighị ebi. 11 E kwesịrị ịtụkwasị okwu a obi: N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị na ya nwụkọrọ ọnwụ, anyị na ya ga-adịkọkwa ndụ.+ 12 Ọ bụrụ na anyị ana-atachi obi, anyị na ya ga-abụ eze, na-achịkwa achị.+ Ọ bụrụ na anyị agọnahụ ya, ọ ga-agọnahụkwa anyị.+ 13 Ọ bụrụgodị na anyị emeghị ihe Chineke kwuru, yanwa ga na-eme ihe o kwuru mgbe niile, n’ihi na o nweghị ike ịgọnahụ onwe ya.
14 Na-echetara ha ihe ndị a, na-agwasi ha ike n’ihu Chineke ka ha ghara iji maka ihe mmadụ kwuru na-ese okwu. Ime otú ahụ abaghị uru ọ bụla n’ihi na ọ na-akpa okwukwe ndị nụrụ ya aka ọjọọ. 15 Gbalịsie ike ka ihe gị dị Chineke mma, ka ị bụrụkwa onye ọrụ nke ihe ọ rụrụ na-anaghị eme ihere, onye na-akụzi eziokwu, na-akọwakwa ya nke ọma.+ 16 Egekwala okwu na-enweghị isi ndị e ji ekwulu Chineke,+ n’ihi na ha ga na-emekwu ka ndị mmadụ ghara ịna-akpa àgwà dị Chineke mma, 17 okwu ndị a ga-agbasakwa ka ọnyá na-aba aba. Haịmeniọs na Faịlitọs so ná ndị na-agbasa ụdị okwu a.+ 18 Mmadụ abụọ a anaghịzi akụzi eziokwu. Ha na-asịkwa na a kpọlitechaala ndị mmadụ n’ọnwụ.+ Ha na-akpakwa okwukwe ụfọdụ ndị aka ọjọọ. 19 Ma, Chineke tọrọ ntọala siri ike, nke kwụkwa chịm. E nwekwara ihe e dere na ntọala a nke dị ka akara. Ihe ahụ bụ, “Jehova* ma ndị bụ́ ndị ya,”+ nakwa, “Ka onye ọ bụla nke na-akpọ aha Jehova*+ ghara ime ajọ omume.”
20 N’ime ụlọ buru ibu, a na-enwe arịa dị iche iche. Ọ bụghị naanị arịa ọlaedo na nke ọlaọcha, kamakwa nke osisi na nke ụrọ. A na-eji ụfọdụ eme ihe bara uru, ma jiri ndị ọzọ eme ihe na-abaghị uru. 21 N’ihi ya, ọ bụrụ na mmadụ ahapụ arịa ndị nke a na-eji eme ihe na-abaghị uru, onye ahụ ga-adị ka arịa e ji eme ihe bara uru, bụrụ onye e doro nsọ, baara onye nwe ya uru, bụrụkwa onye a kwadebere maka ime ihe ọ bụla dị mma. 22 N’ihi ya, gbaara ihe na-agụ ndị na-eto eto agụụ ọsọ. Gbasie mbọ ike na-eme ezi omume, nwee okwukwe, hụ ndị ọzọ n’anya, bụrụkwa onye udo. Ka gị na ndị tụkwasịrị Onyenwe anyị obi, ndị obi ha dịkwa ọcha, na-eme ihe ndị a.
23 Etinyela ọnụ n’arụmụka na-enweghị isi,+ ebe ị ma na ha na-akpata ịlụ ọgụ. 24 Ohu Onyenwe anyị ekwesịghị ịlụ ọgụ, kama o kwesịrị iji nwayọọ* na-emeso mmadụ niile ihe,+ bụrụkwa onye ruru eru ịkụzi ihe, onye na-ejidekwa onwe ya mgbe e mejọrọ ya.+ 25 O kwesịkwara iji nwayọọ na-akụziri ndị isi ike ihe.+ Ikekwe, Chineke ga-eme ka ha chegharịa,* ha amata eziokwu nke ọma,+ 26 ghọta na Ekwensu jidere ha ná ndụ ka ha na-eme uche ya,+ anya edoo ha, ha esi n’ọnyà Ekwensu pụta.
3 Ma mara na oge ikpeazụ+ ga-adị oké egwu, taakwa akpụ. 2 N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-etu ọnụ, ndị mpako, ndị na-ekwulu ndị ọzọ, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-anaghị ekele onye meere ha ihe, ndị na-agharịpụ ndị ọzọ, 3 ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-anaghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla, ndị na-ekwutọ ndị ọzọ, ndị na-anaghị ejideli onwe ha, ndị tigbuo zọgbuo, ndị ihe ọma na-anaghị amasị, 4 ndị na-eme ndị enyi ha ihe ọjọọ, ndị isi ike, ndị onwe ha na-ebu isi, ndị ihe bụ́ mkpa ha bụ ikpori ndụ, ọ bụghị ịhụ Chineke n’anya, 5 ndị na-eme ka hà ji ife Chineke kpọrọ ihe, ma ha anaghị erubere ya isi.+ Na-eze ụdị ndị a eze. 6 Ọ bụ ụdị ndị a na-egbeba n’ezinụlọ dị iche iche na-aghọgbu ụmụ nwaanyị na-esighị ike n’okwukwe, ndị mmehie na-anyịgbu, ndị na-emekwa ihe na-agụ ahụ́ ha agụụ. 7 Ha na-amụ ihe mgbe niile, ma ha enweghị ike ịmata eziokwu nke ọma.
8 Ọ bụ otú Janis na Jambris si megide Mosis ka ndị a* si emegide eziokwu. Uche ha rụrụ arụ kpamkpam. Ihe ha anaghịkwa amasị Chineke n’ihi na ha na-eme ihe dị iche n’ihe Ndị Kraịst kweere. 9 Ma, ihe agaghị agaziri ha, n’ihi na mmadụ niile ga-ama na ha dị nzuzu, otú ahụ mmadụ niile matara na Janis na Jambris dị nzuzu.+ 10 Ma, ị mụtara nnọọ ihe m kụziri. Ị na-ebi ndụ otú m si ebi,+ marakwa ihe m zubere ime na otú m si nwee okwukwe, otú m si enwe ndidi, otú m si hụ ndị ọzọ n’anya, otú m si atachi obi, 11 otú e si kpagbuo m na otú e si taa m ahụhụ, dị ka nke a tara m n’Antiọk,+ n’Aịkoniọm,+ nakwa na Listra.+ Ediri m ahụhụ a niile a tara m, Onyenwe anyị napụtakwara m na ha niile.+ 12 N’eziokwu, a ga-akpagbukwa ndị niile na-ebi ndụ otú na-egosi na ha na-eso ụzọ Kraịst Jizọs, na-efekwa Chineke otú ọ chọrọ.+ 13 Ma ndị ajọ mmadụ na ndị nduhie ga na-akakwu njọ, na-eduhie ndị mmadụ, ndị ọzọ ana-eduhiekwa ha.+
14 Ma gịnwa, ahapụkwala ihe ndị ị mụtara, ndị a kụziiri gị otú mere ka i kwere,+ n’ihi na ị ma ndị i si n’aka ha mụta ha. 15 Chetakwa na i si n’oge ị bụ nwata*+ mara ihe e dere n’Akwụkwọ Nsọ,+ nke ga-emeli ka ị mara ihe, a zọpụtakwa gị n’ihi okwukwe i nwere na Kraịst Jizọs.+ 16 Ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke.+ Ha bakwara uru iji ha akụzi ihe,+ iji ha adọ mmadụ aka ná ntị, iji ha agbazi mmadụ, nakwa iji ha azụ mmadụ ka ọ na-eme ezi omume,+ 17 ka onye nke Chineke wee ruo eruo n’ụzọ niile, bụrụ onye kwadebere nke ọma ime ihe ọ bụla dị mma.
4 Kraịst Jizọs ga-ekpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ+ ikpe+ mgbe ọ ga-apụta ìhè+ nakwa mgbe ọ ga na-achị n’Alaeze ya.+ Ana m agwasi gị ike n’ihu ya na n’ihu Chineke ka ị na-eme ihe a: 2 Kwusaa okwu Chineke.+ Jiri ịnụ ọkụ n’obi na-ekwusa ya ma n’oge dị mma ma n’oge nsogbu. Dọọ onye mejọrọ ihe aka ná ntị.+ Baara ya mba, gbaakwa ya ume. Na-enwe ndidi ka ị na-eme ihe ndị a, na-emekwa ha ka onye bụ́ aka ochie n’ịkụzi ihe.+ 3 N’ihi na a ga-enwe oge ndị mmadụ na-agaghị anabata eziokwu a na-akụziri anyị.+ Kama, ha ga-eme ihe ha chọrọ, kpọkọtara onwe ha ndị ga na-akụziri ha ihe ha chọrọ ịnụ.*+ 4 Ha ga-akwụsịkwa ige eziokwu, gewezie akụkọ ụgha. 5 Ma gịnwa, na-eche echiche nke ọma n’ihe niile. Na-edi ahụhụ ị na-ata.+ Na-ezisa ozi ọma.* Jeruo ozi gị n’isi.+
6 N’ihi na adị m ka àjà e ji mmanya chụọ, nke a wụpụrụ n’ebe ịchụàjà,+ oge m ga-anwụ*+ dịkwa nso. 7 Alụọla m ezigbo ọgụ anyị na-alụ.+ Agbaala m ọsọ ndụ ruo n’isi.+ Akwụsikwara m ike n’okwukwe. 8 Onyenwe anyị, onye na-ekpe ikpe ziri ezi,+ ejikerela ugbu a inye m okpueze a na-enye ndị ezi omume.+ Ọ ga-eji ya kwụọ m ụgwọ n’ụbọchị ikpe.+ Ma, ọ bụghị naanị m ka ọ ga-enye ya, ọ ga-enyekwa ya ndị niile na-atụsi anya ike ka ọ pụta ìhè.
9 Gbalịsie ike ka ị bịa hụ m ngwa ngwa. 10 N’ihi na Dimas+ ahapụla m gawa Tesalonaịka maka na ọ hụrụ ụwa a* n’anya. Kresens agaakwala Galeshia, Taịtọs agaa Dalmeshia. 11 Ọ bụ naanị Luk ka mụ na ya nọ. Gị na Mak soro bịa, n’ihi na ọ ga-enyere m aka n’ozi m na-ejere Chineke. 12 Ma, ezigara m Tikikọs+ Efesọs. 13 Ị bịawa, chịtara m uwe mgbokwasị m hapụrụ na Troas n’ụlọ Kapọs, wetakwa akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ, karịchaa, akpụkpọ anụ ndị ahụ e dere ihe na ha.
14 Alegzanda onye na-akpụ ọla kọpa mere m ọtụtụ ihe ọjọọ. Jehova* ga-akwụ ya ụgwọ ihe ndị o mere.+ 15 I kwesịkwara ịna-eze ya eze, n’ihi na otú o si gbaa ihe anyị kwuru ụkwụ enweghị atụ.
16 Mgbe mbụ m gara zara ọnụ m n’ihu ndị ọchịchị, o nweghị onye bịara kwado m. Ha niile hapụrụ m. Ka Chineke ghara ịgụkọrọ ha ya. 17 Ma Onyenwe anyị nyeere m aka ma nye m ike, ka e wee si n’aka m kwusaa ozi ọma ahụ ruo n’isi, ka mba niile nụkwa ya.+ Ọ napụtakwara m n’ọnụ ọdụm.+ 18 Onyenwe anyị ga-anapụta m n’ihe ọjọọ niile. Ọ ga-azọpụta m, kpọbatakwa m n’Alaeze eluigwe ya.+ Ka a na-eto ya ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.
19 Keleere m Priska na Akwịla+ nakwa Onesịfọrọs na ezinụlọ ya.+
20 Erastọs+ ka nọ na Kọrịnt, ma, ọ bụ na Maịlitọs ka m hapụrụ Trọfimọs+ n’ihi na ahụ́ adịghị ya. 21 Gbalịsie ike ka i rute tupu oge oyi.
Yubulọs na-ekele gị. Pudens na Laịnọs na Klọdia na ụmụnna niile na-ekelekwa gị.
22 Ka Onyenwe anyị nọnyere gị maka àgwà ọma ị na-akpa. Ka o meekwara unu amara.
Na Grik, “m na-ejere ozi dị nsọ.”
Ya bụ, Jehova.
Gụọ A5.
O nwere ike ịbụ, “n’ihe ndị mmadụ na-eme kwa ụbọchị.”
Na Grik, “okpu mmeri.”
Na Grik, “o si ná mkpụrụ Devid.”
Gụọ A5.
Gụọ A5.
Ma ọ bụ “akọ.”
Ma ọ bụ “gbanwee obi ha.”
Ndị a na-ekwu okwu ha bụ ndị ahụ na-aga aghọgbu ụmụ nwaanyị na-esighị ike n’okwukwe.
Na Grik, “nwa ọhụrụ.”
Ma ọ bụ “ihe na-atọ ha ụtọ ná ntị.”
Ma ọ bụ “Na-arụ ọrụ onye na-ezisa ozi ọma.”
Ma ọ bụ “oge a ga-ahapụ m.”
Ma ọ bụ “oge a.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A5.