25 N’ihi na taa, ọ gbadawo ka ọ gaa jiri ọtụtụ ehi na anụ ndị mara abụba na atụrụ chụọ àjà,+ ka o wee kpọọkwa ụmụ ndị ikom eze dum na ndị isi ndị agha na Abayata onye nchụàjà;+ ha na-erikwa ihe ma na-aṅụ ihe ọṅụṅụ n’ebe ahụ n’ihu ya, ha na-asịkwa, ‘Eze Adọnaịja, ị ga-adị ndụ!’+
12 O wee kpọpụta nwa+ eze ma kpukwasị ya okpueze,+ dokwasịkwa Ihe Àmà+ ahụ n’isi ya; ha wee mee ya eze+ ma tee ya mmanụ.+ Ha wee malite ịkụ aka,+ na-asị: “Eze, ị ga-adị ndụ!”+
9 Ma ìgwè mmadụ ahụ, ma ndị na-aga ya n’ihu ma ndị na-eso ya n’azụ, nọ na-eti mkpu, sị: “Biko, zọpụta+ Nwa Devid!+ Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ nke na-abịa n’aha Jehova bụ!+ Zọpụta ya, biko, n’ebe kasị elu!”+