1 Samuel 26:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Devid wee jụọ Ahimelek onye Het+ nakwa Abishaị+ nwa Zeruya,+ nwanne Joab, sị: “Ònye ga-eso m gbadaa n’ebe Sọl nọ n’ụlọikwuu ya?” Abishaị wee zaa, sị: “Mụ onwe m ga-eso gị gbadaa.”+ 2 Samuel 2:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Ụmụ ndị ikom atọ nke Zeruya+ nọ n’ebe ahụ, Joab+ na Abishaị+ na Asahel;+ Asahel nwere ụkwụ ọsọ, dị ka nne mgbada+ nke bi n’ọhịa. 2 Samuel 23:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Ma Abishaị+ nwanne Joab nwa Zeruya+ bụ onyeisi ndị ikom iri atọ ahụ, o ji ube ya gbuo narị mmadụ atọ, aha ya na-edekwa ude dị ka nke mmadụ atọ ahụ.+ 1 Ihe E Mere 2:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Ụmụnne ha ndị nwaanyị bụ Zeruya na Abigel;+ ụmụ Zeruya bụ Abishaị+ na Joab+ na Asahel,+ mmadụ atọ.
6 Devid wee jụọ Ahimelek onye Het+ nakwa Abishaị+ nwa Zeruya,+ nwanne Joab, sị: “Ònye ga-eso m gbadaa n’ebe Sọl nọ n’ụlọikwuu ya?” Abishaị wee zaa, sị: “Mụ onwe m ga-eso gị gbadaa.”+
18 Ụmụ ndị ikom atọ nke Zeruya+ nọ n’ebe ahụ, Joab+ na Abishaị+ na Asahel;+ Asahel nwere ụkwụ ọsọ, dị ka nne mgbada+ nke bi n’ọhịa.
18 Ma Abishaị+ nwanne Joab nwa Zeruya+ bụ onyeisi ndị ikom iri atọ ahụ, o ji ube ya gbuo narị mmadụ atọ, aha ya na-edekwa ude dị ka nke mmadụ atọ ahụ.+
16 Ụmụnne ha ndị nwaanyị bụ Zeruya na Abigel;+ ụmụ Zeruya bụ Abishaị+ na Joab+ na Asahel,+ mmadụ atọ.