27 Manase+ ewegharaghị Bet-shian+ na obodo nta ya niile nakwa Teanak+ na obodo nta ya niile nakwa ndị bi na Dọọ+ na obodo nta ya niile nakwa ndị bi na Ibliam+ na obodo nta ya niile nakwa ndị bi na Megido+ na obodo nta ya niile, kama ndị Kenan gbara isi akwara biri n’ala a.+
12 Beana nwa Ahaịlọd, onye na-elekọta obodo Teanak+ na Megido+ na Bet-shian+ dum, nke dị n’akụkụ Zaretan+ na ndịda ndịda Jezril,+ malite na Bet-shian ruo Ebel-mehola,+ ruokwa n’ógbè Jọkmiam;+
27 Ehazaya+ eze Juda hụrụ ihe merenụ wee si n’ụzọ e si aga n’ụlọ ubi gbaa ọsọ.+ (E mesịa, Jihu chụwara ya wee sị: “Ma onye nke a! Gbatuonụ ya!” Ha wee gbatuo ya mgbe ọ nọ n’ụgbọ ịnyịnya na-agbago Gọọ, nke dị n’akụkụ Ibliam.+ O wee gbagide ruo Megido+ ma nwụọ n’ebe ahụ.+
30 Ndị na-ejere ya ozi wee buru ya n’ozu n’ụgbọ ịnyịnya, si na Megido buru ya lọta Jeruselem+ wee lie ya n’ili ya. Ndị ala ahụ wee kpọrọ Jehoahaz+ nwa Josaya, tee ya mmanụ ma mee ya eze n’ọnọdụ nna ya.