20 Cherọb ndị ahụ ga-achịli nku ha abụọ elu, nku ha ga-asachi ihe mkpuchi ahụ, otu ga-eche ibe ya ihu.+ Ihu cherọb ndị ahụ ga-ekpudokwa n’ihe mkpuchi ahụ.
2 Devid na ndị niile ya na ha so wee bilie gaa Beli-juda,+ ka ha wee si n’ebe ahụ bupụta igbe+ ezi Chineke, bụ́ nke a kpọkwasịrị aha, ya bụ, aha+ Jehova nke ụsụụ ndị agha,+ onye nọ ọdụ n’elu cherọb.+
15 Hezekaya wee malite ikpe ekpere+ n’ihu Jehova, sị: “Jehova bụ́ Chineke Izrel,+ onye nọ ọdụ n’elu cherọb,+ naanị gị bụ ezi Chineke nke alaeze niile+ nke ụwa.+ Ọ bụ gị kere eluigwe+ na ụwa.+