19 Kwakọta ngwongwo ị ga-ebu mgbe a ga-adọrọ gị n’agha,+ gị ada+ bụ́ Ijipt, bụ́ nwaanyị bi n’ime ya. N’ihi na Nọf+ ga-aghọ ihe ijuanya, a ga-agbakwa ya ọkụ ka a ghara inwe onye bi ya.+
13 “Nke a bụ ihe Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘M ga-ebibikwa arụsị ha ndị na-asọ oyi ka nsị,+ bibiekwa chi dị iche iche na-abaghị uru ndị dị na Nọf.+ A gakwaghị enwe onyeisi n’ala Ijipt; m ga-emekwa ka ụjọ dịrị n’ala Ijipt.+