16 Manase wụfukwara ọbara na-emeghị ihe ọjọọ+ n’ebe ọ dị nnọọ ukwuu, ruo mgbe o mere ka Jeruselem ju n’ọnụ malite n’otu nsọtụ ruo na nsọtụ nke ọzọ, n’agụnyeghị mmehie ya nke o ji mee ka Juda mehie site n’ime ihe jọrọ njọ n’anya Jehova.+
34 Ọ bụkwa n’uwe mwụda gị ka a hụrụ ọbara nke mkpụrụ obi+ ndị ogbenye aka ha dị ọcha.+ Ọ bụghị n’ihi na ha nọ na-awaba n’ụlọ, ma, ọ bụ n’uwe gị dum ka m hụrụ ya.+
17 ‘Anya gị na obi gị dị naanị n’uru na-ezighị ezi,+ dịrịkwa n’ọbara onye aka ya dị ọcha ka ị wụfuo ya,+ dịrịkwa n’irigbu ndị mmadụ nakwa n’ịpụnara ha ihe ka i wee na-eme ihe ndị a.’
9 O wee sị m: “Njehie ụlọ Izrel na Juda+ dị nnọọ ukwuu,+ ala ha jupụtara n’ịwụfu ọbara,+ obodo ha jupụtakwara n’ihe gbagọrọ agbagọ;+ n’ihi na ha asịwo, ‘Jehova ahapụwo ala a,+ Jehova adịghị ahụ anyị.’+