21 Lee nnọọ ka obodo nke kwesịrị ntụkwasị obi+ si ghọọ nwaanyị akwụna!+ Ikpe ziri ezi jupụtaburu n’ime ya;+ ezi omume bibu n’ime ya,+ ma ugbu a, ọ bụ ndị na-egbu ọchụ bi na ya.+
8 N’azụ ibo ụzọ na awara ụzọ ka i debere ihe ncheta gị.+ N’ihi na ị hapụrụ m, gbara ọtọ gbagoo; i mere ka ihe ndina gị saa mbara.+ I mere ka gị na ha gbaa ndụ maka ọdịmma nke gị. Ọ na-atọgbu gị atọgbu ka gị na ha dinaa.+ Ị hụrụ ihe ha ji bụrụ nwoke.
20 “‘N’ihi na m kụrisịrị yok gị mgbe dị anya gara aga;+ m dọbisịrị agbụ e kere gị. Ma ị sịrị: “Agaghị m ejere gị ozi,” n’ihi na ọ bụ n’ugwu ọ bụla dị elu nakwa n’okpuru osisi ọ bụla jupụtara n’akwụkwọ ndụ+ ka ị na-edina jaghee ụkwụ+ gị wee na-agba akwụna.+
2 Jehova malitere ikwu okwu site n’ọnụ Hosia, Jehova wee sị Hosia: “Gaa+ lụrụ nwaanyị nke ga-akwa iko, mụọkwa ụmụ a kwatara n’iko, n’ihi na ọ bụ ịkwa iko mere ala a ji kwụsị iso Jehova.”+
4 Ndị na-akwa iko,+ ùnu amaghị na ịbụ enyi ụwa bụ ịbụ onye iro Chineke?+ Ya mere, onye ọ bụla nke chọrọ ịbụ enyi+ ụwa na-eme onwe ya onye iro Chineke.+