11 M ga-akwụ elu ala ụgwọ ihe ọjọọ ya, kwụọkwa ndị ajọ omume ụgwọ njehie ha.+ M ga-emekwa ka nganga nke ndị mpako kwụsị, m ga-ewedakwa mpako nke ndị na-achị n’aka ike ala.+
12 “‘Ọ ga-erukwa na mgbe afọ iri asaa gasịrị,+ m ga-eme ka eze Babịlọn na mba ahụ,+ ya bụ, ala ndị Kaldia, zaa ajụjụ maka njehie ha,’+ ka Jehova kwuru, ‘m ga-emekwa ka ọ bụrụ ebe tọgbọrọ n’efu ruo mgbe ebighị ebi.+
11 Pịanụ akụ́ unu.+ Burunụ ọta okirikiri unu. Jehova akpaliwo mmụọ nke ndị eze ndị Midia,+ n’ihi na o bu n’obi imegide Babịlọn,+ iji laa ya n’iyi. N’ihi na ọ bụ ịbọ ọbọ Jehova, bụ́ ọbọ ọ ga-abọ n’ihi ụlọ nsọ ya.+