2 Ọ gbagowo n’Ụlọ Nsọ nakwa na Daịbọn,+ n’ebe ndị dị elu, ịkwa ákwá. Moab na-eti mkpu ákwá n’ihi Nibo+ nakwa n’ihi Medeba.+ Isi ndị niile nọ n’ime ya kwọchara akwọcha;+ a kpụrụ ajị agba ọ bụla akpụ.
12 “Ọkaakaa Onyenwe anyị,+ bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ga-akpọ òkù n’ụbọchị ahụ ka a kwaa ákwá,+ ka e ruo uju, ka a kwọchaa isi, ka e keekwa ákwà iru uju n’úkwù.+