Jeremaya
43 O wee ruo na ozugbo Jeremaya gwachara mmadụ niile ahụ ihe niile Jehova bụ́ Chineke ha kwuru, nke Jehova bụ́ Chineke ha gwara ya ka ọ gwa ha, bụ́ okwu a niile,+ 2 Azaraya nwa Hoshaya+ na Johenan+ nwa Kariya na ndị ikom niile dị mpako+ sịrị Jeremaya: “Ọ bụ ụgha ka ị na-agha.+ Ọ bụghị Jehova bụ́ Chineke anyị ziri gị ka ị gwa anyị, sị, ‘Unu abanyela Ijipt gaa biri dị ka ndị ọbịa.’+ 3 Kama ọ bụ Barọk+ nwa Neraya na-akpali gị imegide anyị iji nyefee anyị n’aka ndị Kaldia, ka ha gbuo anyị ma ọ bụ dọrọ anyị n’agha laa Babịlọn.”+
4 Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile na ndị ahụ niile erubeghị isi n’ihe Jehova kwuru,+ ya bụ, ibiri n’ala Juda.+ 5 Johenan nwa Kariya na ndị ọchịagha niile ahụ wee kpọrọ ndị Juda niile fọdụrụ bụ́ ndị si ná mba niile a chụsasịrị ha lọta ka ha wee biri na Juda ruo nwa oge,+ 6 ya bụ, ndị dimkpa na ndị nwunye ha na ụmụntakịrị ha na ụmụ nwaanyị eze mụrụ+ na mkpụrụ obi niile Nebuzaradan+ bụ́ onyeisi ndị nche hapụrụ ka ha na Gedalaya+ nwa Ahaịkam+ nwa Shefan+ nọrọ, tinyere Jeremaya onye amụma na Barọk+ nwa Neraya. 7 N’ikpeazụ, ha batara n’ala Ijipt,+ n’ihi na ha erubeghị isi n’ihe Jehova kwuru; ha wee bịarute Tapanhis.+
8 Okwu Jehova wee ruo Jeremaya ntị na Tapanhis, sị: 9 “Buru nkume ndị buru ibu, nọrọ n’ihu ndị Juu zoo ha n’ụrọ nke dị n’ebe e doro brik, nke dị n’ebe e si abanye n’ụlọ Fero n’obodo Tapanhis.+ 10 Sịkwa ha, ‘Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru: “Lee, m ga-ezi ozi, m ga-akpọrọ Nebukadreza eze Babịlọn,+ bụ́ ohu m,+ m ga-edebe ocheeze ya kpọmkwem n’elu nkume ndị a m zoro, ọ ga-agbasakwa ụlọikwuu ọma ya n’elu ha. 11 Ọ ga-abata bibie ala Ijipt.+ Onye ọ bụla ajọ ọrịa ga-egbu, ajọ ọrịa ga-egbu ya, onye ọ bụla a ga-adọrọ n’agha, a ga-adọrọ ya n’agha, onye ọ bụla mma agha ga-egbu, mma agha ga-egbu ya.+ 12 M ga-amụnye ụlọ chi niile nke Ijipt ọkụ;+ ọ ga-agba ha ọkụ ma buru ha laa, ọ ga-eyiri ala Ijipt, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ na-eyiri uwe mwụda ya,+ ọ ga-esikwa na ya laa n’udo. 13 Ọ ga-akụrisị ogidi niile nke Bet-shimesh, nke dị n’ala Ijipt; ọ ga-agbakwa ụlọ chi niile nke Ijipt ọkụ.”’”