Matiu
15 Mgbe ahụ, ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ si Jeruselem+ bịakwute Jizọs, na-asị: 2 “Gịnị mere ndị na-eso ụzọ gị ji emebi ọdịnala ndị oge gboo? Dị ka ihe atụ, ha anaghị akwọ aka mgbe ha chọrọ iri nri.”+
3 Ọ zara ha, sị: “Gịnị mere unu onwe unu ji emebi iwu Chineke n’ihi ọdịnala unu?+ 4 Dị ka ihe atụ, Chineke sịrị, ‘Sọpụrụ nna gị na nne gị’;+ ọ sịkwara, ‘Ka e gbuo onye kwujọrọ nna ya ma ọ bụ nne ya.’+ 5 Ma unu sịrị, ‘Onye ọ bụla nke na-agwa nna ya ma ọ bụ nne ya, sị: “Ihe ọ bụla m nwere nke i nwere ike isi na ya rite uru bụ onyinye a raara nye Chineke,” 6 ọ gaghị asọpụrụ nna ya ma ọlị.’+ Ya mere, unu emewo ka okwu Chineke ghara ịdị irè n’ihi ọdịnala unu.+ 7 Unu ndị ihu abụọ,+ Aịzaya+ buru amụma n’ụzọ kwesịrị ekwesị banyere unu, mgbe ọ sịrị, 8 ‘Ndị a ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m, ma obi ha dị nnọọ anya n’ebe m nọ.+ 9 Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m ofufe, n’ihi na ozizi ha na-ezi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.’”+ 10 O wee kpọọ ìgwè mmadụ ahụ ka ha bịa nso, o wee sị ha: “Geenụ ntị ma ghọta ihe ọ pụtara:+ 11 Ọ bụghị ihe na-abanye n’ọnụ mmadụ na-emerụ ya; kama ọ bụ ihe na-esi n’ọnụ mmadụ apụta na-emerụ ya.”+
12 Mgbe ahụ, ndị na-eso ụzọ ya bịara sị ya: “Ị̀ maara na ndị Farisii sụrụ ngọngọ mgbe ha nụrụ ihe i kwuru?”+ 13 Ọ zara ha, sị: “A ga-efopụ ihe ọkụkụ ọ bụla nke Nna m nke eluigwe na-akụghị.+ 14 Hapụnụ ha. Ha bụ ndị ndú kpuru ìsì. Ọ bụrụkwa na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu.”+ 15 Pita zara ya, sị: “Mee ka ihe atụ ahụ doo anyị anya.”+ 16 O wee sị: “Unu onwe unu kwa, ùnu ka nọ n’enweghị nghọta?+ 17 Ọ̀ bụ na unu amaghị na ihe ọ bụla nke na-abanye n’ọnụ na-agafere wee banye n’eriri afọ, e wee nyụpụ ya n’olulu nsị? 18 Otú ọ dị, ihe ndị na-esi n’ọnụ apụta na-esi n’obi, ọ bụ ihe ndị ahụ na-emerụ mmadụ.+ 19 Dị ka ihe atụ, n’obi ka echiche ọjọọ,+ igbu ọchụ, ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye, ịkwa iko, izu ohi, ịgba akaebe ụgha, nkwulu, si apụta.+ 20 Ọ bụ ihe ndị a na-emerụ mmadụ; ma iji aka a na-akwọghị akwọ rie nri adịghị emerụ mmadụ.”+
21 Mgbe Jizọs si n’ebe ahụ pụọ, ọ banyere ná mpaghara ndị dị na Taya na Saịdọn.+ 22 Ma, lee! otu nwaanyị Finishia+ nke si n’ógbè ndị ahụ bịakwutere ya wee tisie mkpu ike, sị: “Meere m ebere,+ Onyenwe anyị, Nwa Devid. Mmụọ ọjọọ ji nwa m nwaanyị aka ọjọọ.” 23 Ma ọ zaghị nwaanyị ahụ ihe ọ bụla. Ya mere, ndị na-eso ụzọ ya bịara wee malite ịrịọ ya, sị: “Sị ya lawa; n’ihi na ọ na-ebe ákwá na-esogharị anyị.” 24 O wee zaa, sị: “E ziteghị m ijekwuru ndị ọ bụla ma ọ́ bụghị atụrụ furu efu nke ụlọ Izrel.”+ 25 Mgbe nwaanyị ahụ bịara, ọ malitere ịkpọrọ ya isiala, sị: “Onyenwe anyị, nyere m aka!”+ 26 Ọ zara, sị: “O zighị ezi iwere nri ụmụaka tụpụrụ ụmụ nkịta.” 27 O wee sị: “Ee, Onyenwe anyị; ma n’ezie, ụmụ nkịta na-eri irighiri ihe na-esi na tebụl nna ha ukwu na-adapụsị.”+ 28 Mgbe ahụ, Jizọs zara ya, sị: “Nwaanyị, i nwere okwukwe dị ukwuu; ya meere gị dị ka i si chọọ.” E wee gwọọ nwa ya nwaanyị malite n’oge awa ahụ gaa n’ihu.+
29 Mgbe Jizọs si n’ebe ahụ gafere n’obodo ọzọ, ebe ọzọ ọ bịara bụ n’akụkụ oké osimiri Galili.+ Mgbe ọ rịgooro n’elu ugwu,+ ọ nọdụrụ ala n’ebe ahụ. 30 Oké ìgwè mmadụ wee kpọrọ ndị dara ngwọrọ, ndị nwere nkwarụ, ndị ìsì, ndị ogbi, na ọtụtụ ndị na-arịa ihe ndị ọzọ, bịakwute ya. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ha na-atọgbọ ha n’ụkwụ ya, o wee gwọọ ha;+ 31 nke mere na o juru ìgwè mmadụ ahụ anya ka ha hụrụ ndị ogbi ka ha na-ekwu okwu na ndị ngwọrọ ka ha na-eje ije na ndị ìsì ka ha na-ahụ ụzọ, ha wee nye Chineke nke Izrel otuto.+
32 Ma Jizọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya, wee sị:+ “Enwere m ọmịiko+ n’ebe ìgwè mmadụ a nọ, n’ihi na ka ọ dị ugbu a, o ruworị ụbọchị atọ mụ na ha nọ, ha enweghịkwa ihe ha ga-eri; achọghịkwa m ịsị ha lawa n’agụụ. Ha nwere ike ịda mbà n’okporo ụzọ.” 33 Otú ọ dị, ndị na-eso ụzọ ya sịrị ya: “N’ebe a ndị mmadụ na-adịghị anọkarị, ebee ka anyị ga-enweta achịcha ga-ezu inyeju ìgwè mmadụ há otú a afọ?”+ 34 Jizọs wee sị ha: “Ogbe achịcha ole ka unu nwere?” Ha wee sị: “Asaa, na obere azụ̀ ole na ole.” 35 Ya mere, mgbe o nyesịrị ìgwè mmadụ ahụ ntụziaka ka ha nọdụ n’ala, 36 o buuru ogbe achịcha asaa ahụ na azụ̀ ndị ahụ. Mgbe o kelesịrị Chineke, ọ nyawara ha wee malite ikesara ha ndị na-eso ụzọ ya, ndị na-eso ụzọ ya wee kesaara ha ìgwè mmadụ ahụ.+ 37 Ha niile wee rie, rijuo afọ. Ha wee tụtụkọta ihe ha rifọrọ, o juru nkata asaa.+ 38 Ma ndị riri ya dị puku ndị ikom anọ, ma e wezụga ndị inyom na ụmụntakịrị. 39 N’ikpeazụ, mgbe ọ sịrị ìgwè mmadụ ahụ lawa, ọ banyere n’ụgbọ mmiri wee bata n’ógbè Magadan.+