Hosia
7 “Mgbe ọ bụla m chọrọ ịgwọ Izrel,
Mmehie Ifrem na-apụta ìhè,+
Ihe ọjọọ Sameria na-eme na-apụtakwa ìhè.+
Ha na-aghọ aghụghọ.+
Ha na-abata zuo ohi, na-ebukọrọkwa ihe ndị mmadụ n’èzí.+
2 Ma, obi ha anaghị agwa ha na m ga-echeta ihe ọjọọ niile ha na-eme.+
Ugbu a, omume ọjọọ ha niile agbaala ha gburugburu.
Ha dị n’ihu m.
4 Ha niile bụ ndị na-akwa iko.
Ha dị ka ekwú nke onye na-eme achịcha kwanyere ọkụ,
Nke ọ na-akwụsị ịkwanye ọkụ malite mgbe ọ gwọchara ntụ ọka* ruo mgbe o koro eko.
5 N’ụbọchị eze anyị na-eme ememme, ndị isi* na-arịa ọrịa.
Mmanya na-eme ka iwe ju ha obi.+
Ya na ndị na-akwa emo na-akpa.
6 Obi ha na-ere ọkụ dị ka ọkụ dị n’ekwú* n’ihi na naanị ihe ha na-achọ ime bụ ihe ọjọọ.
N’abalị, onye na-emere ha achịcha na-ehi ụra.
N’ụtụtụ, ọkụ dị n’ekwú ha na-enwusikwa ike.
7 Ha niile dị ọkụ ka ọkụ dị n’ekwú.
Ha na-erepịakwa ndị na-achị ha.*
Ndị eze ha niile adaala.+
O nweghị onye n’ime ha na-akpọku m.+
8 Ifrem na mba dị iche iche na-emekọ ihe.+
Ifrem dị ka keeki a na-atụgharịghị atụgharị.
9 Ndị ala ọzọ anapụla ya ike ya,+ ma ọ maghị.
Isi achaakwala ya awọ́, ma ọ maghị.
10 Ihe Izrel ji anya isi agbaala akaebe na o mere ihe ọjọọ,+
Ma ha alaghachikwurughị Jehova bụ́ Chineke ha.+
Ihe a niile emeghịkwa ka ha chọwa ya.
11 Ifrem dị ka nduru dị nzuzu nke na-enweghị uche.+
Ha akpọkuola Ijipt,+ gakwurukwa Asiria.+
12 Ebe ọ bụla ha na-aga, m ga-eji ụgbụ m jide ha.
M ga-adọdata ha otú e si adọdata nnụnụ.
M ga-ata ha ahụhụ otú ahụ m gwara nzukọ ha.+
13 Ha ga-ata ahụhụ n’ihi na ha si n’aka m gbapụ.
A ga-ebibi ha, n’ihi na ha emehiela m.
Adị m njikere ịgbapụta ha, ma ha aghagidela m ụgha.+
Ha na-egbukasị onwe ha ahụ́ ka e nye ha nri na mmanya ọhụrụ.
Ha na-enupụrụ m isi.
15 N’agbanyeghị na m dọrọ ha aka ná ntị, meekwa ka ha dị ike,
Ha na-enupụrụ m isi, na-akpakwa nkata ime ihe ọjọọ.
16 Ha gbanwere ndụ ha, ma ha amaliteghị ife m otú kwesịrị ekwesị.
Ha dị ka ụta a na-ekwesighị ike.+
A ga-eji mma agha gbuo ndị isi* ha n’ihi na ha ji ire ha ekwu okwu ọjọọ.
N’ihi ya, a ga-akwa ha emo n’Ijipt.”+