Ezikiel
7 Jehova gwara m ọzọ, sị: 2 “Nwa nke mmadụ, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru gbasara ala Izrel, sị, ‘Ọgwụgwụ eruola! M ga-ebibi ala a niile. 3 Ọgwụgwụ unu eruola. M ga-ewesa unu iwe, kpee unu ikpe ihe niile unu mere, kwụọkwa unu ụgwọ arụ niile unu kpara. 4 Agaghị m emere unu ebere,* agaghịkwa m enwere unu ọmịiko,+ n’ihi na m ga-akwụ unu ụgwọ ihe niile unu mere. Unu ga-atakwa ahụhụ arụ unu kpara.+ Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova.’+
5 “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova sịrị: ‘E nwere ọdachi na-abịanụ. Ọ bụ ọdachi a na-enwetụbeghị ụdị ya.+ 6 Ọgwụgwụ na-abịa. Ọgwụgwụ ga-abịa. Ọ ga-abịa mee unu ihe na mberede. Ọ na-abịa. 7 Ndị bi n’ala a, oge unu eruola. Oge unu na-abịa. Ụbọchị unu dị nso.+ E nwere ọgba aghara. Ọ bụghịkwa mkpu ọṅụ a na-eti n’ugwu.
8 “‘N’oge na-adịghị anya, m ga-ewesa unu iwe.+ M ga-ewesa unu ezigbo iwe.+ M ga-ekpe unu ikpe maka ihe niile unu mere, kwụọkwa unu ụgwọ arụ niile unu kpara. 9 Agaghị m emere unu ebere. Agaghịkwa m enwere unu ọmịiko.+ M ga-akwụ unu ụgwọ ihe niile unu mere. Unu ga-atakwa ahụhụ arụ unu kpara. Unu ga-amarakwa na m bụ Jehova, nakwa na ọ bụ m na-ata unu ahụhụ.+
10 “‘Ụbọchị ahụ na-abịa.+ Ọ dị nso. Oge unu eruola. Mkpanaka m ga-eji taa unu ahụhụ adịla.* Onye iro adịkwuola mpako.* 11 Tigbuo zọgbuo aghọọla mkpanaka e ji ata ndị ajọ omume ahụhụ.+ Ihe niile gbasara ha ga-ala n’iyi, ma hanwa ma akụ̀ ha ma otú ha si bụrụ ndị a ma ama. 12 Ụbọchị na oge ihe a ga-eme ga-eru. Ka onye na-azụ ihe ghara ịṅụrị ọṅụ, ka onye na-ere ihe ghara iruwe uju, n’ihi na m ga-ewesa ha niile ezigbo iwe.*+ 13 N’ihi na onye rere ala agaghị alaghachi n’ala o rere, ọ bụrụgodị na ọ ka nọ ndụ, maka na ọhụụ a bụ gbasara ihe ga-eme mmadụ niile. E nweghị onye ga-alọghachi. E nweghịkwa onye ga-azọli onwe ya ndụ n’ihi mmehie o mere.
14 “‘Ha afụọla opi.+ Mmadụ niile ejikerekwala, ma e nweghị onye na-aga agha, n’ihi na m na-ewesa mmadụ niile ezigbo iwe.+ 15 Mma agha dị n’èzí.+ Ọrịa na-efe efe na ụnwụ dị n’ime ụlọ. A ga-eji mma agha gbuo onye ọ bụla nọ n’ubi. Ụnwụ na ọrịa na-efe efe ga-egbukwa ndị nọ n’ime obodo.+ 16 Ndị jisiri ike gbapụ ga-agbaga n’ugwu. Ha niile ga-adị ka nduru nọ na ndagwurugwu. Onye nke ọ bụla n’ime ha ga na-ebe ákwá n’ihi mmehie ya.+ 17 Aka ha niile ga-akụda. Ikpere ha niile ga na-agụsịkwa mmiri.*+ 18 Ha eyirila ákwà iru uju,+ na-amakwa jijiji. Ihere ga-eme onye ọ bụla. Isi ọ bụla ga-akwọchakwa akwọcha.*+
19 “‘Ha ga-atụfu ọlaọcha ha n’okporo ámá. Ọlaedo ha ga na-asọkwa ha oyi. Ma ọlaọcha ha ma ọlaedo ha agaghị azọpụtali ha n’ụbọchị oké iwe Jehova.+ Afọ agaghị eju ha.* Ha agaghịkwa enyeju onwe ha afọ, n’ihi na ọ* ghọọla ihe na-eme ka ha mehie.* 20 Ha ji mma ọla ha ji achọ mma mara na-eme ọnụ. Ha jikwa ha* kpụọ arụsị ha niile rụrụ arụ.+ Ọ bụ ya mere m ga-eji mee ka ọ na-asọ ha oyi. 21 M ga-enyefe ya* n’aka ndị mba ọzọ ka ha bukọrọ ya, nyefeekwa ya n’aka ndị ajọ omume nọ n’ụwa ka ha buru ya. Ha ga-emerụkwa akụ̀ ndị a.
22 “‘M ga-agbakụta ha azụ.+ Ha ga-emerụkwa ebe m ji kpọrọ ihe.* Ndị ohi ga-abatakwa n’ime ya merụọ ya.+
23 “‘Rụọ agbụ ígwè,*+ n’ihi na a na-ekpe ndị mmadụ ikpe mkpegbu n’obodo a niile, na-egbukwa ha.+ Tigbuo zọgbuo jukwara n’obodo a.+ 24 M ga-akpọbata ndị kacha njọ ná mba niile.+ Ha ga-ebichikwa n’ụlọ ndị obodo a.+ M ga-emekwa ka ndị dị ike kwụsị nganga ha na-akpa. A ga-emerụkwa ebe nsọ ha.+ 25 Mgbe ha ga-ahụsi anya, ha ga-achọ udo, ma ọ gaghị adị.+ 26 Ọdachi ga-esochi ọdachi, akụkọ esochiekwa akụkọ. Ndị mmadụ agaghị anụ ihe ọ bụla n’ọnụ onye amụma ha chọrọ ka ọ kọọrọ ha ọhụụ.+ Ihe ndị nchụàjà na-akụzi na ndụmọdụ ndị okenye na-enye agaghịkwa aba uru ọ bụla.+ 27 Eze ga na-eru uju.+ Obi ga-agbawa onyeisi. Ụjọ ji ndị obodo a ga-emekwa ka aka ha na-ama jijiji. M ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha mere, kpeekwa ha ikpe otú ha kpere ndị ọzọ. Ha ga-amarakwa na m bụ Jehova.’”+