Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • 2 Ndị Eze 16
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ

      • Ehaz malitere ịchị Juda (1-6)

      • Ehaz nyere ndị Asiria onyinye (7-9)

      • Ehaz rụrụ ụdị ebe ịchụàjà ọ hụrụ ndị na-ekpere arụsị rụrụ (10-18)

      • Ehaz nwụrụ (19, 20)

2 Ndị Eze 16:1

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 1:1; 7:1; Ho 1:1; Maị 1:1; Mt 1:9

2 Ndị Eze 16:2

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 28:1-4

2 Ndị Eze 16:3

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 12:28-30; 16:33
  • +Le 20:2, 3; 2Ih 33:1, 6; Jer 7:31
  • +Di 12:29-31

Akwụkwọ Dị Iche Iche

  • Akwụkwọ E Ji Eme Nchọnchọ

    Amụma Aịsaịa I, p. 8-9

    Ụlọ Nche,

    7/15/1997, p. 14

2 Ndị Eze 16:4

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Ọg 33:52
  • +Di 12:2

2 Ndị Eze 16:5

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 15:37; 2Ih 28:5, 6

2 Ndị Eze 16:6

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “ndị Juda.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 14:21, 22

2 Ndị Eze 16:7

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 15:29

2 Ndị Eze 16:8

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Ma ọ bụ “n’obí.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 15:18, 19

2 Ndị Eze 16:9

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Em 1:4, 5
  • +Aịz 9:11

2 Ndị Eze 16:10

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Di 12:30

2 Ndị Eze 16:11

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 8:2
  • +Jer 23:11; Ezi 22:26

2 Ndị Eze 16:12

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 28:22, 23, 25

2 Ndị Eze 16:14

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 4:1

2 Ndị Eze 16:15

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +Aịz 8:2
  • +2Ih 28:23
  • +Ọp 29:39-41

2 Ndị Eze 16:16

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 16:11

2 Ndị Eze 16:17

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +1Ez 7:27, 28
  • +1Ez 7:38; 2Ih 4:6
  • +1Ez 7:23, 25
  • +2Ih 28:24; 29:19

2 Ndị Eze 16:19

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ih 28:26, 27

2 Ndị Eze 16:20

Ihe Ndị E Dere n'Ala Peeji

  • *

    Hezekaya pụtara “Jehova Na-eme Ka E Nweta Ike.”

Amaokwu Ndị Ọzọ Yiri nke A

  • +2Ez 18:1; 2Ih 29:1; Aịz 1:1; Ho 1:1; Mt 1:9

Baịbụl Ndị Ọzọ ọ gbara

Pịa amaokwu nke ọ bụla ka o bupụtara gị amaokwu Baịbụl ndị ọzọ yiri ya.

Amaokwu ndị Ọzọ

2 Eze 16:1Aịz 1:1; 7:1; Ho 1:1; Maị 1:1; Mt 1:9
2 Eze 16:22Ih 28:1-4
2 Eze 16:31Ez 12:28-30; 16:33
2 Eze 16:3Le 20:2, 3; 2Ih 33:1, 6; Jer 7:31
2 Eze 16:3Di 12:29-31
2 Eze 16:4Ọg 33:52
2 Eze 16:4Di 12:2
2 Eze 16:52Ez 15:37; 2Ih 28:5, 6
2 Eze 16:62Ez 14:21, 22
2 Eze 16:72Ez 15:29
2 Eze 16:81Ez 15:18, 19
2 Eze 16:9Em 1:4, 5
2 Eze 16:9Aịz 9:11
2 Eze 16:10Di 12:30
2 Eze 16:11Aịz 8:2
2 Eze 16:11Jer 23:11; Ezi 22:26
2 Eze 16:122Ih 28:22, 23, 25
2 Eze 16:142Ih 4:1
2 Eze 16:15Aịz 8:2
2 Eze 16:152Ih 28:23
2 Eze 16:15Ọp 29:39-41
2 Eze 16:162Ez 16:11
2 Eze 16:171Ez 7:27, 28
2 Eze 16:171Ez 7:38; 2Ih 4:6
2 Eze 16:171Ez 7:23, 25
2 Eze 16:172Ih 28:24; 29:19
2 Eze 16:192Ih 28:26, 27
2 Eze 16:202Ez 18:1; 2Ih 29:1; Aịz 1:1; Ho 1:1; Mt 1:9
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Gụọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ (bi12)
  • 1
  • 2
  • 3
  • 4
  • 5
  • 6
  • 7
  • 8
  • 9
  • 10
  • 11
  • 12
  • 13
  • 14
  • 15
  • 16
  • 17
  • 18
  • 19
  • 20
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
2 Ndị Eze 16:1-20

Ndị Eze nke Abụọ

16 N’afọ nke iri na asaa n’ọchịchị Pika nwa Remalaya, Ehaz+ nwa Jotam eze Juda malitere ịchị. 2 Ehaz dị afọ iri abụọ mgbe ọ malitere ịchị. Ọ chịrị afọ iri na isii na Jeruselem. Devid nna nna ya mere ihe dị mma n’anya Jehova bụ́ Chineke ya, ma o meghị ka Devid.+ 3 Kama, ọ kpara àgwà ka ndị eze Izrel.+ Ọ kpọdịrị nwa ya ọkụ iji chụọ àjà.+ Ihe a o mere bụ arụ mba ndị+ Jehova chụpụrụ n’ihi ndị Izrel na-akpa. 4 Ọ nọkwa na-achụ àjà, na-esukwa àjà ọkụ n’ebe ndị dị elu,+ n’ugwu dị iche iche, nakwa n’okpuru nnukwu osisi ọ bụla na-ama pokopoko.+

5 Ọ bụ n’oge ahụ ka Rizin eze Siria na Pika nwa Remalaya eze Izrel bịara ịlụso ndị bi na Jeruselem agha.+ Ha nọchibidoro Ehaz na ndị obodo ya, ma ha emerilighị ha. 6 N’oge ahụ, Rizin eze Siria nyeere ndị Ịdọm aka ha enwetaghachi Ilat.+ O mechakwara chụpụ ndị Juu* n’Ilat, ndị Ịdọm agazie biri na ya ruo taa. 7 N’ihi ya, Ehaz ziri ndị mmadụ ha agaa zie Tiglat-piliza+ eze Asiria, sị: “Abụ m ohu gị, bụrụkwa nwa gị. Bịa napụta m n’aka eze Siria nakwa n’aka eze Izrel, ndị na-alụso m agha.” 8 Ehaz nyeziri eze Asiria aka azụ.+ O nyere ya ọlaọcha na ọlaedo ndị dị n’ụlọ Jehova nakwa ndị nke dị n’ebe a na-edowe akụ̀ n’ụlọ* eze. 9 Eze Asiria mekwara ihe ọ rịọrọ ya. Ọ gara merie Damaskọs, dọrọ ndị bi na ya n’agha laa Kia,+ gbuokwa Rizin.+

10 Eze Ehaz gaziri Damaskọs ka ọ hụ Tiglat-piliza eze Asiria. Mgbe o ruru hụ ebe ịchụàjà dị na Damaskọs, o zigaara Yuraịja onye nchụàjà ebe e sere otú e si rụọ ebe ịchụàjà ahụ.+ 11 Yuraịja+ onye nchụàjà rụkwara ebe ịchụàjà+ dị nnọọ ka nke ahụ e sere ese Eze Ehaz si Damaskọs zitere ya. Ọ rụchara ya tupu Eze Ehaz esi Damaskọs lọta. 12 Mgbe eze lọtara ma hụ ebe ịchụàjà ahụ, ọ gara chụọ àjà n’elu ya.+ 13 Ọ chụkwara àjà a na-esu ọkụ, àjà ọka, na àjà mmanya n’elu ya, fesakwa ọbara anụ o ji chụọ àjà udo na ya. 14 O bupụkwara ebe ịchụàjà ọla kọpa+ na-adị n’ihu ụlọ Jehova, ya bụ, n’agbata ebe ịchụàjà ọhụrụ ahụ na ụlọ Jehova. O bugara ya n’ebe ugwu nke ebe ịchụàjà ọhụrụ ahụ. 15 Eze Ehaz gwara Yuraịja+ onye nchụàjà, sị: “Na-achụ àjà n’elu nnukwu ebe ịchụàjà a,+ ma àjà a na-esu ọkụ a na-achụ n’ụtụtụ, ma àjà ọka a na-achụ ná mgbede,+ ma àjà a na-esu ọkụ eze wetara, ma àjà ọka o wetara. Na-achụkwa àjà ndị ọzọ niile wetara n’elu ya, ma àjà a na-esu ọkụ ma àjà ọka ma àjà mmanya. Na-efesakwa ọbara anụ e ji chụọ àjà a na-esu ọkụ na ọbara anụ e ji chụọ àjà ndị ọzọ niile n’elu ya. E mechaa, m ga-ekwu ihe a ga-ejizi ebe ịchụàjà ahụ e ji ọla kọpa rụọ na-eme.” 16 Yuraịja onye nchụàjà mekwara ihe niile Eze Ehaz gwara ya mee.+

17 Eze Ehaz gbukasịrị akụkụ dị iche iche nke ihe ndị e ji ebu ihe+ ma wepụ efere ndị dị n’elu ha.+ O si n’elu oké ehi ndị e ji ọla kọpa kpụọ+ bupụ nnukwu ite a na-akpọ Oké Osimiri ma busa ya na pevment e ji nkume rụọ.+ 18 O wepụkwara ihe e ji kpuchie elu otu ihe a rụrụ n’akụkụ ụlọ nsọ maka Ụbọchị Izu Ike, mechiekwa ụzọ eze si abata n’ụlọ Jehova. O mere ihe a n’ihi ụjọ ọ na-atụ eze Asiria.

19 E dere akụkọ ndị ọzọ gbasara Ehaz na ihe ndị o mere n’akwụkwọ e dere ihe ndị mere n’oge ndị eze Juda.+ 20 Ehaz mechara nwụọ otú nna nna ya hà nwụrụ. E liri ya ebe e liri nna nna ya hà n’Obodo Devid. Hezekaya*+ nwa ya nọchiri ya, malite ịchị.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya