Maịka
7 Nke m agwụla. Adị m ka onye
Ghọrọ mkpụrụ osisi n’oge ọkọchị
Ma tụtụkọta mkpụrụ vaịn fọrọnụ mgbe e wechara ihe ubi,
Ma ọ hụghị ụyọkọ mkpụrụ vaịn ọ ga-aracha.
Ọ hụghịkwa mkpụrụ fig mbụ na-agụ ya agụụ.*
2 Ezigbo mmadụ anọghịzi n’ụwa.
O nweghịkwa mmadụ ọ bụla na-eme ihe dị mma.+
Ha niile na-ezo ka ha gbuo mmadụ.*+
Onye nke ọ bụla na-eji ụgbụ achụ nta nwanne ya.
3 Aka ha ma nnọọ otú e si eme ihe ọjọọ.+
Onyeisi na-ekwu ihe a ga-enye ya.
Onye na-ekpe ikpe na-ekwu ka a kwụọ ya ụgwọ.+
Onye a ma ama na-ekwukwa ihe ọ chọrọ ka e nye ya.*+
Ha na-agbakọkwa aka eme ya.
4 Onye kacha mma n’ime ha yiri ogwu.
Onye kacha ha eme ihe dị mma dị njọ karịa ahịhịa ogwu e ji gbaa ogige.
Ụbọchị ndị nche gị kwuru gbasara ya, nke bụ́ ụbọchị a ga-ekpe gị ikpe, ga-eru.+
Ha agaghịkwa ama ihe ha ga-eme eme.+
5 Unu atụkwasịla enyi unu obi.
Unu atụkwasịkwala enyi ọma unu obi.+
Agwala onye dina gị n’akụkụ ihe ị na-ezo ezo,
6 N’ihi na nwa nwoke na-eleda nna ya anya.
Nwa nwaanyị na-emegide nne ya.+
Nwunye nwa na-emegidekwa nne di ya.+
Ndị ezinụlọ mmadụ bụ ndị iro ya.+
7 Ma mụnwa ga na-ele anya Jehova.+
M ga-echere* Chineke, onye nzọpụta m.+
Chineke m ga-anụ olu m.+
8 Onye iro m, aṅụrịla ọṅụ n’ihi ihe mere m.
Ọ bụ eziokwu na adaala m, m ga-ebili.
Ọ bụ eziokwu na m bi n’ọchịchịrị, Jehova ga-abụrụ m ìhè.
M ga na-edi ya ruo mgbe o kpechitere ọnụ m, kpeekwara m ikpe ziri ezi.
Ọ ga-akpọrọ m bịa n’ìhè.
M ga-elekwasị ezi omume ya anya.
10 Onye iro m ga-ahụ ya.
Ihere ga-emegbukwa onye jụrụ m, sị:
“Olee ebe Jehova Chineke gị nọ?”+
M ga na-ele onye iro m anya.
A ga na-azọ ya ụkwụ otú e si azọ apịtị dị n’okporo ámá.
11 Ọ ga-abụ ụbọchị a ga-eji nkume rụọ mgbidi gị.
N’ụbọchị ahụ, ị ga-enwekwu ala.
12 N’ụbọchị ahụ, ha ga-esi
N’Asiria na obodo ndị dị n’Ijipt bịakwute gị.
Ha ga-esi n’Ijipt ruo n’Osimiri Yufretis.
Ha ga-esi n’otu oké osimiri ruo n’oké osimiri ọzọ, sikwa n’otu ugwu ruo n’ugwu ọzọ.+
14 Jiri mkpara gị zụọ ndị gị, bụ́ ìgwè atụrụ i ketara,+
Ndị naanị ha bi n’oké ọhịa, n’ebe a kụrụ mkpụrụ osisi dị iche iche.
Ka ha taa ahịhịa n’ala Beshan na Gilied+ otú ha tara n’oge ochie.
16 Mba dị iche iche ga-ahụ ya, ihere emee ha n’agbanyeghị na ha dị ike.+
Ha ga-ekpuchi aka n’ọnụ ha.
Ntị ga-echikwa ha.
17 Ha ga-aracha ájá dị ka agwọ.+
Ha ga-esi ná mgbidi ha ndị siri ike mara jijiji pụta dị ka anụ na-arị arị.
Ha ga-amara jijiji bịakwute Jehova bụ́ Chineke anyị.
19 Ọ ga-emere anyị ebere ọzọ.+ Ọ ga-emeri mmehie* anyị.
Ị ga-atụbakwa mmehie anyị niile n’ala ala oké osimiri.+