Hagaị
2 N’ọnwa nke asaa, n’abalị iri abụọ na otu n’ọnwa ahụ, Jehova gwara Hagaị+ onye amụma okwu, sị, 2 “Biko, jụọ gọvanọ Juda+ bụ́ Zerubabel+ nwa Shieltiel na nnukwu onye nchụàjà bụ́ Joshụa+ nwa Jehozadak+ nakwa ndị Izrel ndị ọzọ, sị: 3 ‘Ole ndị n’ime unu hụrụ otú ụlọ a* si dị ebube na mbụ? Olee otú ọ dị unu n’anya ugbu a?+ Ọ̀ bụ na ọ dịghị ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ ma e were ya tụnyere nke mbụ ahụ?’+
4 “Jehova kwuru, sị, ‘Ma ugbu a, Zerubabel, dị ike. Dịkwa ike, Joshụa nnukwu onye nchụàjà, nwa Jehozadak.’
“Jehova kwukwara, sị, ‘Dịkwanụ ike, unu niile ndị bi n’ala a,+ rụọkwanụ ọrụ.’
“‘N’ihi na m nọnyeere unu.’+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. 5 ‘Chetanụ ihe m kwere unu ná nkwa mgbe unu si n’Ijipt pụta.+ Mmụọ m ka dịnyekwaara unu.*+ Unu atụla egwu.’”+
6 “N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘N’oge na-adịghị anya, m ka ga-eme ọzọ ka eluigwe na ụwa na oké osimiri na ala nkịtị maa jijiji.’+
7 “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘M ga-eme ka mba niile maa jijiji. Ihe ndị bara ezigbo uru* nke mba niile ga-abata.+ M ga-emekwa ka ebube m jupụta n’ụlọ a.’+
8 “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘Ọlaọcha bụ nke m, ọlaedo bụkwa nke m.’
9 “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘Ụlọ a ga-emecha dị ebube karịa ụlọ nke mbụ ahụ.’+
“‘M ga-emekwa ka udo dị n’ebe a.’+ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.”
10 N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa nke itoolu, n’afọ nke abụọ n’ọchịchị Darayọs, Jehova gwara Hagaị+ onye amụma okwu, sị: 11 “Ọ bụ ihe a ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Biko, jụọ ndị nchụàjà ajụjụ banyere ihe iwu kwuru:+ 12 “Ọ bụrụ na mmadụ eburu anụ dị nsọ n’uwe ya, uwe ya ewee metụ achịcha ma ọ bụ ofe ma ọ bụ mmanya ma ọ bụ mmanụ ma ọ bụ ụdị nri ọ bụla, ọ̀ ga-eme ka ihe ahụ o metụrụ dị nsọ?”’”
Ndị nchụàjà zara, sị: “Mba.”
13 Hagaị jụziri, sị: “Ọ bụrụ na onye na-adịghị ọcha maka na o metụrụ ozu* aka emetụ nke ọ bụla n’ime ihe ndị a aka, ihe o metụrụ aka ọ̀ ga-abụzi ihe na-adịghị ọcha?”+
Ndị nchụàjà zara, sị: “Ọ ga-abụ ihe na-adịghị ọcha.”
14 Hagaị wee, sị: “Jehova kwuru, sị, ‘Ọ bụ otú ahụ ka ndị a dị, otú ahụ ka mba a dịkwa n’ihu m, otú ahụ ka ọrụ aka ha niile dịkwa. Ihe ọ bụla ha na-achụ n’àjà n’ebe ahụ adịghị ọcha.’
15 “‘Ma ugbu a, biko, chebaranụ ihe a echiche malite taa gawa: Tupu a tụkwasị nkume n’elu nkume n’ụlọ nsọ Jehova,+ 16 olee otú ihe dị mgbe ahụ? Mmadụ bịa n’ebe e kposara ọka,* na-atụ anya na ọka ahụ ga-eju akpa iri abụọ, ọ na-eju naanị akpa iri. Mmadụ bịa n’olulu a na-azọchapụta mmanya ka o kuru mmanya ga-eju ite iri ise n’ebe mmanya na-agbanye, ọ na-eju naanị ite iri abụọ.+ 17 M mebiri ihe niile unu rụrụ. M ziteere unu okpomọkụ na akụ́ mmiri ígwé, meekwa ka ihe unu rụtara maa ebu,+ ma e nweghị onye n’ime unu lọghachikwutere m.’ Ọ bụ ihe Jehova kwuru.
18 “‘Biko, chebaranụ ihe a echiche malite taa gawa, malite n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa nke itoolu, malite n’ụbọchị a tọrọ ntọala ụlọ nsọ Jehova.+ Chebaranụ ihe a echiche: 19 Mkpụrụ ọ̀ ka dị n’ebe a na-edowe ihe?*+ Osisi vaịn, osisi fig, osisi pomigranet, na osisi oliv amịbeghị mkpụrụ ruo ugbu a, ka hà amịala? Ma, malite taa, m ga-agọzi unu.’”+
20 Jehova gwara Hagaị okwu nke ugboro abụọ n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa ahụ,+ sị: 21 “Gwa Zerubabel, bụ́ gọvanọ Juda, sị, ‘M ga-eme ka eluigwe na ụwa maa jijiji.+ 22 M ga-akwatu ocheeze nke alaeze dị iche iche, napụkwa alaeze mba dị iche iche ike ha.*+ M ga-akwatu ụgbọ ịnyịnya na ndị na-agba ha, ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-adakwa maka na mma agha onye nke ọ bụla ga-egbu nwanne ya.’”+
23 “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘N’ụbọchị ahụ, m ga-akpọrọ gị, ohu m bụ́ Zerubabel+ nwa Shieltiel.’+ Ọ bụ ihe Jehova kwuru. ‘M ga-emekwa ka ị dị ka mgbaaka e ji aka ihe akara n’ihi na ọ bụ gị ka m họọrọ.’ Ọ bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.”