Nehemaya
13 N’ụbọchị ahụ, a gụụrụ mmadụ niile akwụkwọ Mosis.+ E wee chọpụta na e dere na ya na e nweghị onye Amọn ma ọ bụ onye Moab+ ga-abata n’ọgbakọ ezi Chineke,+ 2 n’ihi na ha enyeghị ndị Izrel achịcha na mmiri, kama ha goro Belam ka ọ bụọ ha ọnụ.+ Ma, Chineke anyị mere ka ọnụ ọ gaara abụ ha bụrụzie ngọzi.+ 3 Ozugbo ha nụrụ Iwu ahụ, ha si ná ndị Izrel kpọpụwa ndị niile bụ́ ndị mba ọzọ.+
4 Tupu oge a, ọ bụ Elayashib,+ onye ikwu Tobaya,+ bụ onye nchụàjà na-ahụ maka ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe* n’ụlọ* Chineke anyị.+ 5 O doziiri Tobaya otu nnukwu ọnụ ụlọ a na-akwasa ihe,* bụ́ ebe ha na-edowebu ọka e ji achụ àjà, frankinsens, na arịa dị iche iche nakwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọka,* nke mmanya ọhụrụ, na nke mmanụ+ e kwesịrị ịna-enye ndị Livaị,+ ndị na-abụ abụ, na ndị na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá, nakwa onyinye a na-enye maka ndị nchụàjà.+
6 N’oge a niile, anọghị m na Jeruselem n’ihi na m gakwuuru Eze Atazaksis+ nke Babịlọn n’afọ nke iri atọ na abụọ n’ọchịchị ya.+ Mgbe oge ụfọdụ gachara, m rịọrọ eze ka ọ hapụ m ka m laghachi. 7 M wee bịarute Jeruselem hụ ihe ọjọọ Elayashib+ mere n’ihi Tobaya.+ O doziiri ya otu ọnụ ụlọ a na-akwasa ihe n’ogige ụlọ ezi Chineke. 8 Ihe a were m ezigbo iwe, m wee si n’ọnụ ụlọ ahụ a na-akwasa ihe* tụpụsịa ngwongwo Tobaya niile. 9 M nyeziri iwu, ha wee mee ka ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe* dị ọcha. M bughachiri arịa dị iche iche na-adị n’ụlọ ezi Chineke+ n’ebe ahụ, ha na ọka e ji achụ àjà na frankinsens.+
10 M chọpụtakwara na a naghịzi enye ndị Livaị+ òkè ha,+ nke mere na onye nke ọ bụla ná ndị Livaị na ndị na-abụ abụ, bụ́ ndị na-eje ozi, gawara ịrụ ọrụ n’ala nke ya.+ 11 M wee baara ndị osote onye na-achị achị mba,+ sị: “Gịnị mere e ji leghara ụlọ ezi Chineke anya?”+ M kpọkọtaziri ndị Livaị ma mee ka ha laghachi n’ebe e kenyere ha ọrụ. 12 Juda niile webatakwara otu ụzọ n’ụzọ iri+ nke ọka,* nke mmanya ọhụrụ, na nke mmanụ n’ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe.+ 13 M wee nye Shelemaya bụ́ onye nchụàjà, Zedọk bụ́ odeakwụkwọ,* na Pedaya onye Livaị ọrụ ilekọta ọnụ ụlọ ndị a na-akwasa ihe. Henan nwa Zakọ nwa Matanaya na-enyekwara ha aka n’ihi na e weere ụmụ nwoke ahụ ka ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi. Ọrụ ha bụ ikesara ụmụnne ha ihe.
14 Chineke m, biko, cheta m+ n’ihi ihe a. Echefula ihe ndị m mere maka na m hụrụ ụlọ gị na ozi ndị a na-eje na ya n’anya.+
15 N’ụbọchị ndị ahụ, m hụrụ ndị bi na Juda ka ha na-azọchapụta mmanya n’Ụbọchị Izu Ike.+ Ha na-ebubata ikpo ọka,* na-ebukwasị ha n’elu jakị, na-ebutekwa mmanya, mkpụrụ vaịn, mkpụrụ fig, na ụdị ibu ọ bụla na Jeruselem n’Ụbọchị Izu Ike.+ M wee dọọ ha aka ná ntị ka ha kwụsị ire ihe n’ụbọchị ahụ.* 16 Ndị Taya ndị bi n’obodo ahụ na-ebubata azụ̀ na ụdị ngwá ahịa ọ bụla, na-eresị ha ndị Juda n’Ụbọchị Izu Ike n’ime Jeruselem.+ 17 M wee baara ndị a ma ama na Juda mba ma sị ha: “Gịnị bụ ihe ọjọọ a unu na-eme? Unu na-emerụ Ụbọchị Izu Ike. 18 Ọ́ bụghị ihe a ka nna nna unu hà mere, Chineke anyị wee mee ka ọdachi a niile dakwasị anyị, dakwasịkwa obodo a? Ugbu a, unu na-emerụ Ụbọchị Izu Ike,+ na-eme ka iwe dị ọkụ ọ na-ewesa Izrel dịkwuo ọkụ.”
19 Ozugbo ọchịchịrị gbawara n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem tupu Ụbọchị Izu Ike eruo, m nyere iwu ka e mechie ibo ụzọ ya niile. M kwukwara ka ha ghara imeghe ha ruo mgbe Ụbọchị Izu Ike gachara. M dowekwara ụfọdụ n’ime ndị na-ejere m ozi n’ọnụ ụzọ ámá ka a ghara ibubata ibu ọ bụla n’Ụbọchị Izu Ike. 20 Ndị ahịa ahụ na ndị na-ere ụdị ngwá ahịa ọ bụla wee rahụ n’ihu mgbidi Jeruselem otu ugboro ma ọ bụ ugboro abụọ. 21 M wee dọọ ha aka ná ntị ma gwa ha, sị: “Gịnị mere unu ji arahụ n’ihu mgbidi a? Unu mee ya ọzọ, m ga-achụpụ unu n’ike.” Malite n’oge ahụ gawa, ha abịakwaghị n’Ụbọchị Izu Ike.
22 M gwara ndị Livaị ka ha na-eme onwe ha ka ha dị ọcha mgbe niile ma na-abata na-eche nche n’ọnụ ụzọ ámá iji doo Ụbọchị Izu Ike nsọ.+ Chineke m, biko, chetakwa ihe a ma meere m ebere maka na ịhụnanya gị dị ukwuu.+
23 N’oge ahụ, m hụkwara ndị Juu lụrụ* ụmụ nwaanyị+ Ashdọd,+ Amọn, na Moab.+ 24 Ọkara ụmụ ha na-asụ asụsụ ndị Ashdọd, ọkara ana-asụ asụsụ ndị obodo ọzọ dị iche iche. Ma e nweghị otu n’ime ha ma otú e si asụ asụsụ ndị Juu. 25 M wee baara ha mba, bụọ ha ọnụ, tie ụfọdụ n’ime ụmụ nwoke ahụ ihe,+ fopụkwa ntutu isi ha ma mee ka ha jiri aha Chineke ṅụọ iyi. M sịrị ha: “Unu akpọnyela ụmụ ha ndị nwoke ụmụ unu ndị nwaanyị. Unu alụtakwarala ụmụ unu ndị nwoke ụmụ ha ndị nwaanyị. Unu alụkwala ụmụ ha ndị nwaanyị.+ 26 Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe ndị a mere ka Eze Solomọn nke Izrel mehie? E nweghị eze dị ka ya n’ọtụtụ mba.+ Chineke ya hụrụ ya n’anya+ wee mee ya eze Izrel niile. Ma ụmụ nwaanyị ndị mba ọzọ ọ lụrụ mere ka o mehie.+ 27 Ọ̀ bụ na ọ bụghị ihe jọgburu onwe ya na unu kpọchiri ntị na-emebi iwu Chineke anyị wee na-alụrụ ụmụ nwaanyị mba ọzọ?”+
28 Otu n’ime ụmụ nwoke Joyada+ nwa Elayashib,+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà, alụọla nwa Sanbalat+ onye Bet-horọn. N’ihi ya, m chụpụrụ ya.
29 Chineke m, biko, cheta na ha emerụọla ọrụ ndị nchụàjà na ọgbụgba ndụ ndị nchụàjà+ na ndị Livaị.+
30 M wee mee ka ha dị ọcha ka a ghara inwekwa ihe ọ bụla si mba ọzọ ga-eme ka ha rụọ arụọ. M kenyekwara ndị nchụàjà na ndị Livaị ọrụ, onye ọ bụla n’ọrụ nke ya,+ 31 meekwa ndokwa ka a na-ebute nkụ+ n’oge kwesịrị ekwesị nakwa ka a na-eweta mkpụrụ mbụ kara aka.
Chineke m, biko, cheta m ma gọzie m.+