Ilu
20 Mmanya na-eme ka mmadụ na-eme ihe a ga-eji na-achị ya ọchị,*+ mmanya na-emekwa ka mmadụ ghara ịna-ejide onwe ya.+
Onye ọ bụla o mere ka ọ kpafuo amaghị ihe.+
2 Ndị mmadụ na-atụ eze egwu otú ha si atụ egwu ma ọdụm gbọwa ụja.+
Onye ọ bụla nke na-akpasu eze iwe na-akpọ ọnwụ òkù.+
3 Ọ bụrụ na mmadụ na-agbara esemokwu ọsọ, a ga na-akwanyere ya ùgwù,+
Ma onye ọ bụla bụ́ onye nzuzu na-esekarị okwu.+
4 Onye umengwụ anaghị akọ ihe n’oge oyi.
N’ihi ya, ọ ga na-arịọ arịrịọ n’oge a na-ewe ihe ubi, mgbe ọ na-enweghị ihe ọ bụla.*+
5 Ihe mmadụ na-eche n’obi ya dị ka mmiri miri emi,
Ma onye na-aghọta ihe ga-esepụta ya.
6 Ọtụtụ ndị na-ekwu na ha hụrụ ndị ọzọ n’anya,*
Ma o siri ike ịhụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi n’eziokwu.
7 Onye ezi omume na-akwụwa aka ọtọ.+
Ụmụ ya, bụ́ ndị ga-anọchi ya, ga-enwe obi ụtọ.+
9 Ònye ga-ekwu, sị: “Emeela m ka obi m dị ọcha.+
Abụghịzi m onye mmehie”?+
13 Anọla na-ehi naanị ụra, ka i wee ghara ịda ogbenye.+
Meghee anya gị, ị ga-erijukwa nri afọ.+
14 Onye na-azụ ihe na-ekwu, sị: “Ọ dịghị mma, ọ dịghị mma.”
Ma ọ na-ala, gaa nyawa isi.+
15 Mmadụ nwere ike inwe ọlaedo ma ọ bụ nwee ọtụtụ nkume kọral,*
Ma onye na-ekwu okwu otú gosiri na ọ ma ihe bara uru karịa.+
16 Chịrị uwe mmadụ ma ọ bụrụ na ọ nara onye ọ na-amaghị n’ibé.+
Nara ya ihe ibé ma ọ bụrụ nwaanyị na-ebi ndụ rụrụ arụ* ka ọ nara n’ibé.+
18 Atụmatụ na-aga nke ọma ma a gbaa izu.+
Soro ezigbo ntụziaka mgbe ị na-alụ agha.+
19 Onye na-ekwutọ mmadụ na-agagharị na-akọsa ihe a na-achọghị ka ndị ọzọ mara.+
Gị na onye asịrị na-atọ ụtọ* akpala.
22 Asịla: “M ga-emegwara ihe ọjọọ e mere m.”+
Nwee olileanya n’ebe Jehova nọ,+ ọ ga-azọpụta gị.+
23 Jehova kpọrọ ihe na-ezughị ezu e ji atụ̀ ihe* asị.
Ihe e ji atụ̀ ihe nke e ji aghọgbu mmadụ adịghị mma.
24 Ọ bụ Jehova na-eduzi nzọụkwụ mmadụ.+
Ndị mmadụ hà ga-aghọtali ụzọ ha?*
25 Mmadụ na-esiri onwe ya ọnyà ma ọ bụrụ na o kwe Chineke nkwa n’echeghị echiche,*+
Mechazie chebawara nkwa o kwere echiche.+
28 Ịhụnanya na eziokwu na-echebe eze.+
Ịhụnanya na-eme ka ọ chịrị na-aga.+
29 Mma ụmụ okorobịa bụ ike ha.+
Mma ndị agadi bụ isi awọ́ ha.+