Ndị Ikpe
16 Otu ụbọchị, Samsịn gara Gaza. Ọ hụrụ otu akwụna n’ebe ahụ wee banye n’ụlọ ya. 2 A gwara ndị Gaza, sị: “Samsịn abatala ebe a.” Ha wee gbaa ya gburugburu ma chebiri ya n’ọnụ ụzọ ámá obodo n’abalị ahụ niile. Ha nọ jụụ n’abalị ahụ niile, na-asị: “Chi bọọ, anyị ga-egbu ya.”
3 Ma, Samsịn dinaara ala n’ebe ahụ ruo n’etiti abalị. O wee bilie n’etiti abalị jide ibo ọnụ ụzọ ámá obodo ahụ na idé abụọ dị n’akụkụ ya ma fopụ ha, ha na ihe e ji tụchie ya. Ọ tụkwasịrị ha n’ubu ya ma buru ha gbagoo n’elu ugwu chere Hebrọn ihu.
4 Mgbe e mechara, ọ hụrụ otu nwaanyị bi na Ndagwurugwu Sorek n’anya. Aha nwaanyị ahụ bụ Delaịla.+ 5 Ndị isi ndị Filistia wee bịakwute Delaịla, sị ya: “Ghọgbuo ya+ ka ị chọpụta ihe na-enye ya nnukwu ike a o nwere na otú anyị nwere ike isi merie ya, kee ya agbụ ma mee ka ọ ghara ịkpakwa ike. Onye ọ bụla n’ime anyị ga-akwụ gị otu puku na otu narị (1,100) mkpụrụ ego ọlaọcha.”
6 Delaịla mechara sị Samsịn: “Biko, gwa m ebe nnukwu ike a i nwere si na ihe e nwere ike iji kee gị agbụ wee merie gị.” 7 Samsịn sịrị ya: “Ọ bụrụ na e jiri akwara asaa e ji ekwe ụta, bụ́ ndị na-akpọbeghị nkụ, kee m agbụ, ike ga-agwụ m, mụ adị ka nwoke ọ bụla ọzọ.” 8 Ndị isi ndị Filistia wee chịtara ya akwara asaa e ji ekwe ụta, bụ́ ndị na-akpọbeghị nkụ, ya ejiri ha kee ya agbụ. 9 Ha zoro n’ime ime ụlọ chebiri ya. Delaịla wee kpọọ ya, sị: “Samsịn, ndị Filistia abịala!” O wee dọbisịa akwara ndị ahụ. Ha dọbiri ngwa ngwa otú eriri si adọbi ma a ṅaa ya n’ọkụ.+ A mataghị ihe na-enye ya ike.
10 Delaịla wee sị Samsịn: “Lee, ị ghọgbuola m,* ghaakwara m ụgha. Ugbu a, biko, gwa m ihe e nwere ike iji kee gị agbụ.” 11 O wee sị ya: “Ọ bụrụ na e jiri ụdọ ọhụrụ a na-ejibeghị rụọ ọrụ kee m agbụ, ike ga-agwụ m, mụ adị ka nwoke ọ bụla ọzọ.” 12 Delaịla wee chịrị ụdọ ọhụrụ kee ya ma kpọọ ya, sị: “Samsịn, ndị Filistia abịala!” (Ka ihe a na-eme, ndị mmadụ zoro n’ime ime ụlọ chebiri ya.) O wee dọbie ụdọ ndị ahụ e kere ya n’aka ka eriri nkịtị.+
13 Mgbe e mechara, Delaịla sịrị Samsịn: “Ị ka na-aghọ m aghụghọ ma na-aghara m ụgha ruo ugbu a.+ Gwa m ihe e nwere ike iji kee gị.” O wee sị ya: “Ọ bụ ma i jiri owu e ji akpa ákwà kekọta ntutu isi m dị ùkwù asaa.” 14 O wee jiri osisi* jikọta ha ma kpọọ ya, sị: “Samsịn, ndị Filistia abịala!” O wee si n’ụra teta, fopụ osisi ahụ, dọpụsịakwa owu ahụ e ji akpa ákwà.
15 Delaịla sịziri ya: “Gịnị mere i ji asị na ị hụrụ m n’anya+ mgbe obi gị na-adịghị n’ebe m nọ? Ị ghọọla m aghụghọ ugboro atọ a, ị gwabeghịkwa m ebe nnukwu ike gị si.”+ 16 Ebe ọ bụ na Delaịla nọ na-agwakasị ya okwu ahụ́ kwa ụbọchị, na-enyekwa ya nsogbu, ike gwụrụ ya.*+ 17 N’ikpeazụ, Samsịn gwara ya ihe niile dị ya n’obi, sị: “Agụba emetụbeghị m n’isi n’ihi na m bụ onye Naziraịt nke Chineke malite mgbe a mụrụ m.*+ Ọ bụrụ na a kpụọ m isi, ike m ga-apụ m n’ahụ́, ike ga-agwụkwa m, mụ adịrị ka ụmụ nwoke niile ọzọ.”
18 Mgbe Delaịla hụrụ na ọ gwala ya ihe niile dị ya n’obi, ọ kpọrọ ndị isi ndị Filistia ozugbo,+ sị ha: “Gbagotenụ ugbu a maka na ọ gwala m ihe niile dị ya n’obi.” Ndị isi ndị Filistia wee gbagote bịakwute ya, ha wetakwara ego ha ga-enye ya. 19 Delaịla mere ka ọ rahụ ụra n’ikpere ụkwụ ya. O wee kpọọ otu nwoke ma gwa ya ka ọ kpụpụ ntutu isi ya dị úkwù asaa. Mgbe a kpụchara ya isi, nwaanyị ahụ malitere igosi na ya ka ya ike n’ihi na ike ya nọ na-apụ ya n’ahụ́. 20 Delaịla kpọziri ya, sị: “Samsịn, ndị Filistia abịala!” O tetara n’ụra, sị: “M ga-apụ otú m na-emebu+ ma gbụrụ onwe m.” Ma ọ maghị na Jehova ahapụla ya. 21 Ndị Filistia jidere ya ghụpụ ya anya abụọ. Ha wee kpọrọ ya gbadaa Gaza tụọ ya ịga abụọ e ji ọla kọpa mee. O wee bụrụ onye na-egwe ọka* n’ụlọ mkpọrọ. 22 Ma ntutu isi ya malitekwara ito mgbe a kpụchara ya isi.+
23 Ndị isi ndị Filistia zukọtara ka ha chụọrọ chi ha bụ́ Degọn+ nnukwu àjà nakwa ka ha mee ememme, n’ihi na ha nọ na-asị: “Chi anyị enyefeela Samsịn onye iro anyị n’aka anyị!” 24 Mgbe ha hụrụ Samsịn, ha toro chi ha, sị: “Chi anyị enyefeela onye iro anyị n’aka anyị, onye mebisịrị ala anyị+ ma gbuo ọtụtụ n’ime anyị.”+
25 Ebe ọ bụ na obi dị ha ụtọ, ha sịrị: “Kpọọnụ Samsịn ka anyị jiri ya metụ ihe ọchị.” Ha wee kpọpụta Samsịn n’ụlọ mkpọrọ ka ha jiri ya mee ihe ọchị. Ha mere ka o guzoro n’etiti ogidi abụọ. 26 Samsịn wee gwa nwata nwoke se ya n’aka, sị: “Mee ka m metụ ogidi ndị ji ụlọ a aka, ka m dabere na ha.” 27 (Ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị juru n’ụlọ ahụ. Ndị niile bụ́ ndị isi ndị Filistia nọ n’ebe ahụ. Ihe dị ka puku mmadụ atọ (3,000), ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, nọkwa n’elu ụlọ ahụ na-ekiri Samsịn mgbe ha ji ya na-eme ihe ọchị.)
28 Samsịn+ wee rịọ Jehova, sị: “Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, biko, cheta m, biko, Chineke, nye m ike+ naanị otu ugboro a ka m bọọ ọbọ n’isi ndị Filistia maka otu n’ime anya m abụọ.”+
29 Samsịn wee jidesie aka ike n’ogidi abụọ ahụ dị n’etiti ụlọ ahụ, bụ́ ndị ji ụlọ ahụ, gbadosie ụkwụ ike n’ala ma were aka nri ya jide otu ogidi, were aka ekpe ya jide nke ọzọ. 30 Samsịn tiri mkpu sị: “Ka m* soro ndị Filistia nwụọ!” O wee jiri ike ya niile kwaa ogidi ndị ahụ aka. Ụlọ ahụ dagidere ndị isi ahụ na ndị niile nọ n’ime ya.+ Ndị o gburu mgbe ọ na-anwụ wee karịa ndị o gburu mgbe ọ nọ ndụ.+
31 Mgbe e mechara, ụmụnne ya na ndị niile bụ́ ndị ezinụlọ nna ya gbadatara ka ha buru ya. Ha buuru ya wee lie ya n’agbata Zora+ na Eshtaọl, n’ebe e liri Manoa+ nna ya. Ọ bụ afọ iri abụọ ka Samsịn kpere Izrel ikpe.+