Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • nwt Jud 1-25
  • Jud

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jud
  • Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
Jud

AKWỤKWỌ OZI JUD DERE

1 Abụ m Jud, ohu Jizọs Kraịst, bụrụkwa nwanne Jems.+ M na-edetara unu bụ́ ndị a kpọrọ+ akwụkwọ ozi, ndị Chineke Nna hụrụ n’anya, ndị e chebekwara maka Jizọs Kraịst:+

2 Ka Chineke mee ka ebere ya na udo ya na ịhụnanya ya baara unu ụba.

3 Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụ eziokwu na m nọ na-agbalịsi ike ka m detara unu akwụkwọ ozi banyere nzọpụta a na-azọpụta anyị niile,+ ahụrụ m na m kwesịrị idetara unu akwụkwọ ozi ka m gbaa unu ume ka unu lụsie ọgụ ike maka okwukwe+ e nyefere ndị nsọ naanị otu ugboro.* 4 Ihe mere m ji ede ya bụ na ụfọdụ ndị egbebatala n’etiti unu, bụ́ ndị Akwụkwọ Nsọ kwuru ogologo oge gara aga na a ga-ama ha ikpe a. Ha bụ ndị na-anaghị asọpụrụ Chineke, ndị na-akụdo aka n’amara Chineke anyị na-eme ihe ọjọọ n’asọghị anya,*+ ndị na-agọnahụ onye naanị ya bụ nna anyị ukwu na Onyenwe anyị, bụ́ Jizọs Kraịst.+

5 Ọ bụ eziokwu na unu ma ihe niile a nke ọma, achọrọ m ichetara unu na n’agbanyeghị na Jehova* zọpụtara ndị ya n’Ijipt,+ o mechara bibie ndị gosiri na ha enweghị okwukwe.+ 6 E nwekwara ndị mmụọ ozi na-anọgideghị n’ebe e dowere ha ka ha nọrọ, kama ha hapụrụ ebe ha kwesịrị ibi.+ O kere ndị mmụọ ozi a agbụ ebighị ebi ma dowe ha n’oké ọchịchịrị ruo mgbe ọ ga-eme ha ihe o kpebiri ime ha n’oké ụbọchị ahụ.+ 7 Otú ahụ ka ọ dịkwa Sọdọm na Gọmọra na obodo ndị gbara ha gburugburu. Ha nọ na-akwa iko* aghara aghara ma na-enwe mmekọahụ otú na-ekwesịghị ekwesị.+ E ji ọkụ ebighị ebi* taa ha ahụhụ,+ ha wee bụrụ ihe atụ e ji adọ anyị aka ná ntị.

8 N’agbanyeghị ya, ihe ndị gbebatara n’etiti unu na-eche n’obi ha mgbe niile bụ ihe na-adịghị mma.* Ha na-emerụkwa onwe ha na ndị ọzọ,* na-eleda ndị isi anya, na-ekwutọkwa ndị dị ebube.+ 9 Ma mgbe Maịkel+ onyeisi ndị mmụọ ozi+ na Ekwensu sere okwu ma na-arụ ụka banyere ozu Mosis,+ e nweghị mgbe ọ mara Ekwensu ikpe, ọ gwaghịkwa ya okwu ọjọọ,+ kama ọ sịrị: “Ka Jehova* baara gị mba.”+ 10 Ma ndị a na-ekwu okwu ọjọọ banyere ihe niile ha na-aghọtaghị.+ Ha na-ejikwa ihe niile ha ghọtara emerụ onwe ha, ya bụ, ihe ndị ha ghọtara otú ụmụ anụmanụ na-anaghị eche echiche si aghọta ihe.+

11 Ha ga-ata ahụhụ n’ihi na ha sooro ụzọ Ken,+ sorokwa ụzọ ọjọọ Belam+ n’egbughị oge maka na ha chọrọ ka a kwụọ ha ụgwọ. E bibiekwala ha maka na ha kwuru okwu gosiri na ha na-enupụ isi+ ka Kora.+ 12 Ha na-eso unu abịa oriri unu ji egosi na unu hụrụ ibe unu n’anya.+ Ma, ha bụ nkume ndị zoro ezo n’ala ala mmiri, ndị ọzụzụ atụrụ ndị na-azụ onwe ha n’atụghị egwu,+ ígwé ojii mmiri na-adịghị nke ifufe na-ebugharị,+ osisi ndị na-anaghị amị mkpụrụ n’oge ha kwesịrị ịmị, bụ́ ndị nwụrụla kpamkpam,* e fopụ ha. 13 Ha bụkwa ajọ ebili mmiri nke na-eme n’oké osimiri, nke na-ebukọrọ ihe ndị kwesịrị imenye ha ihere bupụta n’ikpere mmiri.+ Ha bụkwa kpakpando ndị na-awagharị awagharị, bụ́ ndị e tinyere n’ebe kacha gbaa itiri ruo mgbe ebighị ebi.+

14 Ịnọk,+ onye nke asaa malite n’Adam, bukwara amụma banyere ha mgbe ọ sịrị: “Lee, Jehova* bịara, ya na ọtụtụ iri puku ndị mmụọ ozi* ya+ 15 ikpe mmadụ niile ikpe+ na igosi na ikpe mara ndị niile na-anaghị asọpụrụ Chineke n’ihi ihe ọjọọ niile ha mere n’asọpụrụghị Chineke nakwa n’ihi ihe niile na-awụ akpata oyi ndị mmehie na-anaghị asọpụrụ Chineke kwuru gbasara Chineke.”+

16 Ha bụ ndị ntamu,+ ndị na-eme mkpesa banyere otú ihe dịịrị ha, na-emekwa ihe ọjọọ ndị na-agụ ha agụụ.+ Ha na-etukwa ọnụ ma na-eto ndị ọzọ otuto na-esighị ha n’obi* ka ha nweta ihe ha chọrọ.+

17 Ma ununwa, ndị m hụrụ n’anya, chetanụ ihe ndịozi Onyenwe anyị Jizọs Kraịst kwuru na mbụ.* 18 Ha na-adị agwa unu, sị: “N’oge ikpeazụ, a ga-enwe ndị na-achị ihe dị mma ọchị, ndị na-eme ihe ọjọọ na-agụ ha agụụ.”+ 19 Ha bụ ndị na-akpata nkewa,+ ndị na-akpa àgwà ka anụmanụ,* ndị na-enweghị mmụọ Chineke.* 20 Ma unu, ndị m hụrụ n’anya, na-emenụ ka okwukwe unu nke kacha nsọ sie ike, ka mmụọ nsọ na-edukwa unu mgbe unu na-ekpe ekpere,+ 21 ka unu wee na-eme ihe ga-eme ka Chineke na-ahụ unu n’anya,+ ebe unu na-echere ebere Onyenwe anyị Jizọs Kraịst nke ga-eme ka unu nweta ndụ ebighị ebi.+ 22 Na-emekwaranụ ụfọdụ ndị nwere obi abụọ+ ebere;+ 23 dọpụtanụ ha+ n’ọkụ ka a ghara ibibi ha. Ma na-emerenụ ndị ọzọ ebere, na-atụkwanụ egwu mgbe unu na-emere ha ebere ka ha ghara iji mmehie ha tetọọ unu.+ Kpọọnụ mmehie ha asị.*

24 Onye ahụ nke ga-echebeli unu ka unu ghara ịda, onye ga-emelikwa ka unu nwee oké ọṅụ nakwa ka unu guzoro ma bụrụ ndị na-enweghị ntụpọ+ n’ihu Chineke anyị dị ebube,* 25 onye naanị ya bụ Chineke, Onye si n’aka Jizọs Kraịst Onyenwe anyị zọpụta anyị, ka e too ya. Ka ebube ya, ike ya, na ọchịchị ya dịgide malite na mgbe ebighị ebi niile gara aga ruo ugbu a, ruokwa mgbe niile ebighị ebi. Amen.

Ma ọ bụ “otu ugboro, nke ga-adịrukwa ebighị ebi.”

Ma ọ bụ “na-eme ihe ọjọọ n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.

Gụọ A5.

Gụọ Nkọwa Okwu, “Ịkwa iko.”

Ọ pụtara mbibi ebighị ebi. Gụọ Nkọwa Okwu, “Ọdọ ọkụ.”

Ma ọ bụ “ndị gbebatara n’etiti unu na-arọ nrọ.”

Na Grik, “na-emerụkwa anụ ahụ́.”

Gụọ A5.

Na Grik, “nwụrụla ugboro abụọ.”

Gụọ A5.

Ma ọ bụ “ọtụtụ iri puku ndị nsọ.”

Ma ọ bụ “na-eto mmadụ n’ihi onye ọ bụ.”

Ma ọ bụ “buru n’amụma.”

Ma ọ bụ “ndị ahụ́ ha na-achị.”

Na Grik, “ndị na-enweghị mmụọ.”

Na Grik, “Kpọọnụ uwe anụ ahụ́ tetọrọ asị.”

Ma ọ bụ “n’ihu ya nke dị ebube.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya