Abụ Ọma
Ntụziaka e nyere onye nduzi. “Alala m n’iyi.” Abụ ọma Devid. Miktam.
58 Ebe unu gbachiri nkịtị, ùnu pụrụ ikwu okwu banyere ezi omume?+
Ùnu pụrụ ikpe ikpe ziri ezi, unu ụmụ mmadụ?+
2 Ee e, kama lee otú unu si jiri obi unu dum na-eme ihe doro anya na ọ bụ ajọ omume n’ụwa,+
Na-edozikwa ụzọ maka ihe ọjọọ unu na-eme!+
Ha na-akpọchi ntị dị ka agwọ ubí nke mechiri ntị ya,+
5 Nke na-agaghị anụ olu ndị na-ara ya ụrà,+
Ọ bụrụgodị na onye maara ihe ejiri ọgwụ jide ya.+
8 Ha na-aga ije dị ka eju nke na-achọ ịnwụ anwụ;*
Dị ka ime nke pụrụ nwaanyị, ha agaghị ahụ anyanwụ.+
9 Tupu ọkụ osisi ogwu unu sonyere n’ọkụ emetụ ite unu,+
Ọ ga-ebufu ma osisi ogwu nke dị ndụ ma nke e sonyere n’ọkụ dị ka oké ifufe.+