Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Diuterọnọmi 1:17
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 17 Unu elela mmadụ anya n’ihu mgbe unu na-ekpe ikpe.+ Unu ga-anụrụ ihe onye nta ga-ekwu dịkwa ka unu ga-anụrụ nke onye ukwu.+ Unu atụla ụjọ n’ihi mmadụ,+ n’ihi na ikpe bụ nke Chineke;+ okwu ikpe nke siiri unu oké ike, unu ga-eweta ya n’ihu m, m ga-anụrụkwa ya.’+

  • 2 Samuel 8:15
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 15 Devid wee na-achị Izrel dum;+ Devid nọkwa na-ekpere ndị ya+ niile ikpe ziri ezi, na-emekwara ha ihe ziri ezi.+

  • Abụ Ọma 58:11
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 11 Mmadụ ga-asịkwa:+ “N’ezie, onye ezi omume ga-enweta ụgwọ ọrụ.+

      N’ezie, e nwere Chineke nke na-ekpe ikpe n’ụwa.”+

  • Abụ Ọma 72:2
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    •  2 Ka o jiri ezi omume kpechite ọnụ ndị gị,+

      Ka o jirikwa ikpe ziri ezi kpechite ọnụ ndị gị nọ n’ahụhụ.+

  • Aịzaya 11:4
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 4 Ọ ga na-ekpe ndị ogbenye ikpe ezi omume,+ ọ ga na-enyekwa ịdọ aka ná ntị n’izi ezi n’ihi ndị dị umeala n’obi n’ụwa. Ọ ga-apịa ụwa ụtarị nke si n’ọnụ ya;+ ọ ga-ejikwa mmụọ nke egbugbere ọnụ ya gbuo onye ajọ omume.+

  • Jeremaya 22:3
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 3 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Kpeenụ ikpe ziri ezi, meekwanụ ezi omume, napụtanụ onye a na-apụnara ihe n’aka onye na-erigbu ya; unu emegbula onye mbịarambịa ọ bụla, nwa na-enweghị nna ma ọ bụ nwaanyị di ya nwụrụ.+ Unu emesola ha ihe ike.+ Unu awụfukwala ọbara ọ bụla na-emeghị ihe ọjọọ n’ebe a.+

  • Jọn 7:24
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 24 Kwụsịnụ ile mmadụ anya n’ihu wee na-ekpe ikpe, kama na-ekpenụ ikpe ziri ezi.”+

  • Ndị Hibru 1:9
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 9 Ị hụrụ ezi omume n’anya, ị kpọkwara mmebi iwu asị. Ọ bụ ya mere Chineke, bụ́ Chineke gị, ji were mmanụ aṅụrị tee gị+ karịa ndị ibe gị.”+

  • Mkpughe 19:11
    Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
    • 11 M wee hụ ka e meghere eluigwe, ma, lee! otu ịnyịnya ọcha.+ A na-akpọkwa onye nọ n’elu ya Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi+ na Onye Eziokwu,+ ọ na-ekpekwa ikpe ma na-alụ agha n’ezi omume.+

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya