Ilu
27 Ejila echi anya isi,+ n’ihi na ị maghị ihe chi ga-abọta.+
2 Ka onye bịara abịa too gị, ọ bụghị ọnụ gị; ka onye mba ọzọ tookwa gị, ọ bụghị egbugbere ọnụ gị.+
3 Nkume dị arọ, ájá bụkwa ibu+—ma iwe onye nzuzu na-akpasu mmadụ dị arọ karịa ha abụọ.+
4 Ọnụma nwere obi ọjọọ, iwe na-asọkwa ka idei mmiri,+ ma ònye pụrụ idi ekworo?+
5 Ịba mba+ nke pụtara ìhè dị mma karịa ịhụnanya e zochiri ezochi.
6 Ọnyá onye hụrụ mmadụ n’anya mepụrụ ya si n’ezi obi,+ ma nsusu ọnụ nke onye kpọrọ mmadụ asị bụ ihe a ga-arịọsiri arịrịọ ike.+
7 Mkpụrụ obi afọ juru ga-azọ mmanụ aṅụ ụkwụ, ma ihe ọ bụla nke na-elu ilu na-atọ mkpụrụ obi agụụ na-agụ ụtọ.+
8 Dị nnọọ ka nnụnụ nke na-efepụ n’akwụ́ ya,+ otú ahụ ka nwoke nke na-agbapụ n’ebe obibi ya dị.+
9 Ọ bụ mmanụ na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ+ na-eme ka obi ṅụrịa, otú ahụkwa ka enyi mmadụ si atọ ụtọ n’ihi ndụmọdụ nke si ná mkpụrụ obi.+
10 Ahapụla enyi gị ma ọ bụ enyi nna gị, abanyekwala n’ụlọ nwanne gị n’ụbọchị ọdachi dakwasịrị gị. Onye agbata obi nke nọ nso dị mma karịa nwanne nke nọ n’ebe dị anya.+
11 Mara ihe, nwa m, wee mee ka obi m ṅụrịa,+ ka m wee zaa onye na-akwa m emo okwu.+
12 Onye maara ihe nke hụrụ ọdachi agawo zoo;+ ndị na-amaghị ihe, bụ́ ndị nọ na-aga, atawo ahụhụ si na ya pụta.+
13 Chịrị uwe mmadụ ma ọ bụrụ na ọ nawo onye ọ na-amaghị n’ibé;+ nara ya ihe ibé ma ọ bụrụ na ya na nwaanyị na-akwa iko* na-emekọ ihe.+
14 Onye ji olu dara ụda agọzi mmadụ ibe ya n’isi ụtụtụ, a ga-ewere ya na ọ bụ nkọcha ka ọ na-akọcha ya.+
15 Elu ụlọ nke na-ehi mmiri, nke na-achụpụ mmadụ n’ụbọchị mmiri na-ezo n’akwụsịghị akwụsị, ya na nwunye na-ese okwu bụ otu ihe.+ 16 Onye ọ bụla nke zobere nwaanyị ahụ ezobewo ifufe, ọ bụkwa mmanụ ka aka nri ya metụrụ.
17 Ọ bụ ígwè ka a na-eji amụcha ígwè. Otú ahụ ka ihu mmadụ na-amụcha ihu mmadụ ibe ya.+
18 Onye na-echebe osisi fig ga-eri mkpụrụ ya,+ onye na-eche nna ya ukwu nche ka a ga-akwanyere ùgwù.+
19 Dị ka mmiri si egosi otú ihu mmadụ dị, otú ahụ ka obi mmadụ si egosi otú obi onye ọzọ dị.
20 Afọ adịghị eju+ Shiol na ebe mbibi;+ afọ adịghịkwa eju anya mmadụ.+
21 Ite e ji anụcha ihe bụ maka ọlaọcha,+ ekwú ọkụ bụkwa maka ọlaedo;+ a na-anwale mmadụ site n’otuto a na-enye ya.+
22 Ọ bụrụgodị na i jiri ọdụ sụrie onye nzuzu n’ikwe, sụkọta ya na ọka* a kụjara akụja, nzuzu ya agaghị apụ ya apụ n’ahụ́.+
23 I kwesịrị ịmara ọdịdị ìgwè ewu na atụrụ gị nke ọma. Mee ka obi gị dịrị n’ìgwè anụ ụlọ gị;+ 24 n’ihi na akụ̀ agaghị adịru mgbe ebighị ebi,+ okpueze agaghịkwa adịru ọgbọ niile.
25 Ahịhịa ndụ adịkwaghị, ahịhịa ọhụrụ epuwokwa, a chịkọtawokwa ahịhịa ndụ dị n’ugwu.+ 26 N’ụmụ ebule ka i si enweta uwe gị,+ mkpi bụkwa ihe e ji akwụ ụgwọ ala. 27 E nwere mmiri ara ewu nke ga-ezu maka nri gị, maka nri ezinụlọ gị, nweekwa ihe ụmụ agbọghọ gị ga-eji na-ebi ndụ.+