19 “Ana m eke mkpụrụ egbugbere ọnụ.+ Onye nọ n’ebe dị anya na onye nọ nso ga-enwe udo nke na-agaghị akwụsị akwụsị,”+ ka Jehova kwuru, “m ga-agwọkwa ya.”+
25 “‘“Mụ na ha ga-agba ọgbụgba ndụ udo,+ m ga-emekwa ka ajọ anụ ọhịa ghara ịdịkwa n’ala ha,+ ha ga-ebikwa n’ala ịkpa n’obi iru ala, hiekwa ụra n’oké ọhịa.+
18 Mụ na anụ ọhịa+ na anụ ufe nke eluigwe na ihe na-akpụ akpụ n’ala ga-agba ndụ n’ụbọchị ahụ n’ihi ha, m ga-emekwa ka ụta na mma agha na agha ghara ịdịkwa n’ala ha,+ m ga-emekwa ka ha dinara ala n’obi iru ala.+
19 ya bụ, na Chineke si n’aka Kraịst+ na-eme ka ya+ na ụwa+ dị ná mma, n’agụrụghị ha njehie ha,+ o nyefekwara n’aka anyị okwu+ nke ime ka a dị ná mma.+