20 “Jehova ga-eme ka ọbụbụ ọnụ,+ ọgba aghara+ na ịba mba+ dakwasị gị n’ihe ọ bụla ị na-eme bụ́ nke ị na-agbalị ime, ruo mgbe e kpochapụrụ gị, i wee laa n’iyi ọsọ ọsọ, n’ihi omume ọjọọ gị, ebe ọ bụ na ị hapụwo m.+
16 Ma ha ji ndị ozi nke ezi Chineke na-eme ihe ọchị,+ na-eledakwa okwu ya anya+ ma na-akwa+ ndị amụma ya emo, ruo mgbe ọnụma+ Jehova bịakwasịrị ndị ya, ruo mgbe ọ na-enweghị ihe ga-egbochi ya.+
11 Ọnụma juru m obi dị ka o juru Jehova. Ike agwụwo m idi ya.”+
“Wụkwasị ya nwatakịrị nke nọ n’okporo ámá+ na ìgwè ụmụ okorobịa ndị bụ́ ezigbo enyi n’otu mgbe ahụ; n’ihi na a ga-ejide ha, nwoke na nwunye ya, agadi nwoke na onye nọworo ndụ ruo ọtụtụ afọ.+
31 N’ihi ya, m ga-awụkwasị ha ọnụma m.+ M ga-eji ọkụ nke oké iwe m kpochapụ ha.+ M ga-eme ka ha jiri isi ha buru ihe ha metara,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.”
12 O wee mezuo ihe o kwuru gaje ime anyị+ na ndị ikpe anyị bụ́ ndị kpere anyị ikpe,+ site n’ime ka oké ọdachi dakwasị anyị, nke dakwasịrị Jeruselem, bụ́ ụdị na-emetụbeghị n’okpuru eluigwe.+
6 Otú ọ dị, ọ̀ bụ na okwu m na ụkpụrụ m ndị m nyere ndị ohu m, bụ́ ndị amụma,+ n’iwu emezughị n’isi nna unu hà?’+ Ha wee lọghachi, sị: ‘Ihe Jehova bu n’obi ime anyị+ dị ka ụzọ anyị na omume anyị si dị, ọ bụ ya ka o mere anyị.’”+