Ntụziaka e nyere onye nduzi. Abụ, abụ olu ụtọ.
66 Tikuonụ Chineke mkpu mmeri, unu niile ndị bi n’ụwa.+
2 Bụọnụ abụ olu ụtọ iji too aha ya.+
Nyenụ ya otuto dị ebube.+
3 Sịnụ Chineke: “Lee ka ọrụ gị niile si dị egwu!+
Ndị iro gị ga-eji egwu bịakwute gị n’ihi ịdị ukwuu nke ike gị.+
4 Ndị niile bi n’ụwa ga-akpọrọ gị isiala,+
Ha ga-abụkukwa gị abụ olu ụtọ, ha ga-abụku aha gị abụ olu ụtọ.”+ Sila.
5 Bịanụ hụrụ ọrụ dị iche iche nke Chineke.+
Otú o si emeso ụmụ mmadụ dị egwu.+
6 O mere ka oké osimiri ghọọ ala akọrọ;+
Ha wee jiri ụkwụ si n’etiti osimiri gafere.+
Anyị malitere ịṅụrị ọṅụ n’ime ya n’ebe ahụ.+
7 O ji ike ya na-achị achị ruo mgbe ebighị ebi.+
Anya ya dị n’ebe mba niile nọ.+
Ka ndị isi ike ghara ibuli onwe ha elu.+ Sila.
8 Gọzienụ Chineke anyị, unu ndị dị iche iche,+
Meekwanụ ka a nụ olu otuto a na-enye ya.+
9 Ọ na-edebe mkpụrụ obi anyị n’etiti ndị dị ndụ,+
O kweghịkwa ka ụkwụ anyị maa jijiji.+
10 N’ihi na i nyochawo anyị, Chineke;+
Ị nụchawo anyị dị ka e si anụcha ọlaọcha.+
11 I mewo ka anyị banye n’ụgbụ e ji achụ nta;+
I mewo ka nsogbu na-anyịji anyị úkwù.
12 I mewo ka ịnyịnya mmadụ efu wụfee anyị n’isi;+
Anyị agabigawo ọkụ na mmiri,+
I wee kpọpụta anyị mee ka anyị nwere onwe anyị.+
13 M ga-eji àjà a na-esurecha n’ọkụ bata n’ime ụlọ gị;+
M ga-emezu nkwa m kwere gị,+
14 Nke m meghere egbugbere ọnụ m kwupụta,+
Nke ọnụ m kwupụtara mgbe m nọ n’oké ihe isi ike.+
15 M ga-eji anụ mara abụba chụọrọ gị àjà a na-esurecha n’ọkụ,+
Jirikwa ebule chụọrọ gị àjà.
M ga-achụ oké ehi na mkpi n’àjà.+ Sila.
16 Bịanụ gee ntị, unu niile ndị na-atụ egwu Chineke, m ga-akọ+
Ihe o mewooro mkpụrụ obi m.+
17 M ji ọnụ m kpọkuo ya,+
M jikwa ire m too ya.+
18 Ọ bụrụ na m na-eche ihe ọjọọ n’obi m,
Jehova agaghị anụ olu m.+
19 N’ezie, Chineke anụwo;+
Ọ ṅawokwa ntị n’ekpere m.+
20 Ka Chineke bụrụ onye a gọziri agọzi, bụ́ onye na-elegharaghị ekpere m anya,
O wepụghịkwa obiọma ya n’ebe m nọ.+