2 Ihe E Mere
3 N’ikpeazụ, Sọlọmọn malitere iwu ụlọ Jehova+ na Jeruselem, n’Ugwu Moraya,+ bụ́ ebe Jehova pụtara ìhè n’ihu Devid nna ya,+ n’ebe Devid kwadebere nke dị n’ebe nzọcha mkpụrụ nke Ọnan+ onye Jibọs. 2 O wee malite iwu ya n’ọnwa nke abụọ n’ụbọchị nke abụọ, n’afọ nke anọ nke ọchịchị ya.+ 3 Nke a bụ ntọala Sọlọmọn tọrọ maka ụlọ ezi Chineke. Ọ dị kubit iri isii n’ogologo, ma e jiri ihe e jibu atụ̀ ihe tụọ ya, dịrịkwa kubit iri abụọ n’obosara.+ 4 Ihe owuwu ụzọ mbata*+ nke dị n’ihu ụlọ ahụ dị kubit iri abụọ n’ogologo, n’ihu ebe obosara ụlọ ahụ, ọ dịkwa otu narị kubit na iri abụọ n’ịdị elu. O wee jiri ọlaedo a na-agwaghị agwa machie ya n’ime. 5 O ji osisi junipa kụchie nnukwu ụlọ ahụ,+ were ọlaedo dị mma+ machie ya, ọ tụkwara nkwụ+ na ụdọ ígwè+ n’ahụ́ ya. 6 O jikwa nkume dị oké ọnụ ahịa machie ụlọ ahụ ka ọ maa mma;+ ọlaedo+ ya bụ ọlaedo si n’obodo ọlaedo. 7 O wee jiri ọlaedo+ machie ụlọ ahụ, ntụhie ya, ọnụ ụzọ ya, ahụ́ ya na ibo ya; ọ tụkwara cherọb n’ahụ́ ụlọ ahụ.+
8 O wee wuo ụlọ nke nwere Ebe Kasị Nsọ,+ ogologo ya dị kubit iri abụọ, otú ahụkwa ka obosara ya hà, obosara ya dịkwa kubit iri abụọ;+ o wee jiri ọlaedo dị mma nke dị narị talent isii machie ya. 9 Ntu+ ya dị shekel ọlaedo iri ise n’ịdị arọ; o jikwa ọlaedo machie ọnụ ụlọ ndị dị n’elu ya.
10 O wee kpụọ cherọb+ abụọ n’ime ụlọ ahụ nke nwere Ebe Kasị Nsọ dị ka e si akpụ ihe oyiyi ma were ọlaedo machie ha.+ 11 Nku cherọb ndị ahụ+ dị kubit iri abụọ n’ogologo, otu nku nke dị kubit ise na-eru n’ahụ́ ụlọ ahụ, nku nke ọzọ nke dịkwa kubit ise na-emetụ nku cherọb nke ọzọ.+ 12 Nku cherọb nke ọzọ nke dị kubit ise na-eru n’ahụ́ ụlọ ahụ, nku nke ọzọ nke dịkwa kubit ise na-emetụ nku cherọb nke ọzọ.+ 13 Nku cherọb ndị a gbasara agbasa wee dị kubit iri abụọ; ha guzo ọtọ ma chee ihu n’ime.
14 O jikwa eri na-acha anụnụ anụnụ+ na ajị anụ e sijiri odo odo na ákwà ọma na-acha uhie uhie mee ákwà mgbochi+ ya, ọ kpakwara cherọb n’elu ya.+
15 O wee rụọ ogidi abụọ+ n’ihu ụlọ ahụ, ha dị kubit iri atọ na ise n’ogologo, ihe a kpụkwasịrị n’elu+ nke ọ bụla n’ime ya dị kubit ise. 16 Ọ rụkwara ụdọ ígwè+ yiri ihe olu wee tinye ha n’elu ogidi ndị ahụ. Ọ kpụkwara otu narị mkpụrụ pọmigranet+ wee ganye ha n’ụdọ ígwè ndị ahụ. 17 O wee guzobe ogidi ndị ahụ n’ihu ụlọ nsọ ahụ, o guzobere otu n’aka nri, guzobe nke ọzọ n’aka ekpe, o wee kpọọ nke dị n’aka nri Jekin, kpọọkwa nke dị n’aka ekpe Boaz.+