Jeremaya
25 Chineke gwara Jeremaya okwu gbasara ndị Juda niile n’afọ nke anọ n’ọchịchị Jehoyakim+ nwa Josaya bụ́ eze Juda. Afọ ahụ bụkwa afọ nke mbụ n’ọchịchị Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn. 2 Jeremaya onye amụma kwuru gbasara* ndị Juda niile na ndị niile bi na Jeruselem, sị:
3 “Jehova na-agwa m okwu, mụ ana-agwa unu ihe ọ na-agwa m ugboro ugboro,* ma unu anaghị ege ntị.+ Ihe a na-eme kemgbe afọ iri abụọ na atọ, malite n’afọ nke iri na atọ n’ọchịchị Josaya+ nwa Emọn, bụ́ eze Juda. 4 Jehova nọkwa na-ezitere unu ndị ohu ya niile, bụ́ ndị amụma, ugboro ugboro,* ma unu anaghị ege ha ntị. Unu anaghịkwa atọ ntị n’ala ịnụ ihe ha na-agwa unu.+ 5 Ha na-asị, ‘Biko, ka onye ọ bụla n’ime unu hapụ ụzọ ọjọọ ya na omume ọjọọ ya,+ ka unu wee bitee aka n’ala Jehova nyere unu na nna nna unu hà kemgbe ọtụtụ afọ. 6 Unu esokwala chi ọzọ dị iche iche, unu efekwala ha, unu akpọkwarala ha isiala, ka unu wee ghara iji ọrụ aka unu kpasuo Chineke iwe. N’ihi na ịkpasu ya iwe ga-eme ka o mee ka ọdachi dakwasị unu.’
7 “Jehova kwuru, sị: ‘Ma, unu anaghị ege m ntị. Kama, unu na-eji ọrụ aka unu akpasu m iwe. Ọdachi ga-adakwasị unu n’ihi ihe a unu na-eme.’+
8 “N’ihi ya, Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: ‘“Ebe ọ bụ na unu anaghị eme ihe m kwuru, 9 m ga-ezi ozi ka a kpọta ezinụlọ niile si n’ebe ugwu.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. O kwukwara, sị, “M ga-agwa Nebukadneza* eze Babịlọn, bụ́ ohu m,+ ka ha bịa lụso obodo a+ na ndị bi na ya na mba ndị a niile gbara ya gburugburu agha.+ M ga-ebibi ha, ha abụrụ ihe na-awụ akpata oyi na ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị. M ga-ala ha n’iyi. Ha agaghịkwa adịzi. 10 M ga-eme ka ha kwụsị iti mkpu ọṅụ na mkpu ndị obi dị ụtọ ha na-eti,+ meekwa ka a ghara ịnụ olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ+ na ụda nkume e ji egwe nri. M ga-emekwa ka a gharazie ịna-ahụ ìhè ọkụ.* 11 Ala a niile ga-abụzi ala e bibiri ebibi na ihe na-awụ akpata oyi. Mba ndị a ga-ejekwara eze Babịlọn ozi ruo afọ iri asaa.”’+
12 “Jehova kwuru, sị, ‘Ma, afọ iri asaa gachaa,+ m ga-eme ka eze Babịlọn na mba ahụ, ya bụ, ndị Kaldia, zaa ajụjụ* maka mmehie ha.+ Ala ha ga-atọgbọrọkwa nkịtị ruo mgbe ebighị ebi.+ 13 M ga-eme ka ihe niile m kwuru na m ga-eme ala ahụ mezuo n’isi ya, ya bụ, ihe niile e dere n’akwụkwọ a, nke Jeremaya buru amụma na a ga-eme mba dị iche iche. 14 Ọtụtụ mba na ndị eze ukwu+ ga-eji ha mere ndị ohu.+ M ga-akwụ ha ụgwọ ihe ha mere, kwụọkwa ha ụgwọ ọrụ aka ha.’”+
15 Jehova bụ́ Chineke Izrel gwara m, sị: “Nara m iko mmanya a nke iwe m dị ọkụ, meekwa ka mba niile m ga-eziga gị ṅụọ ihe dị n’ime ya. 16 Ha ga-aṅụ ya, na-adagharị, na-emekwa ka ndị ara n’ihi agha m ga-eme ka a lụso ha.”+
17 M wee nara Jehova iko ahụ, meekwa ka mba niile Jehova zigara m ṅụọ mmanya dị na ya.+ 18 Ndị mbụ ṅụrụ ya bụ Jeruselem na obodo ndị dị na Juda,+ ma ndị eze ha ma ndị isi ha. Mmanya a ha ṅụrụ ga-eme ka ha laa n’iyi, bụrụ ihe na-awụ akpata oyi na ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị nakwa ihe a bụrụ ọnụ.+ Ihe a ga-emezukwa n’egbughị oge. 19 Ndị ọzọ ṅụrụ ya bụ Fero bụ́ eze Ijipt, ndị na-ejere ya ozi, ndị o mere ndị isi, na ndị obodo ya niile.+ 20 Ndị ọzọkwa bụ ndị niile si esi bịa biri n’Ijipt, ndị eze niile na-achị Ọz, ndị eze niile na-achị ndị Filistia,+ ya bụ, ndị Ashkelọn,+ ndị Gaza, ndị Ekrọn, na ndị fọdụrụ n’Ashdọd. 21 Ndị ọzọ bụ ndị Ịdọm,+ ndị Moab,+ na ndị Amọn.+ 22 Ndị ọzọkwa bụ ndị eze niile na-achị Taya, ndị eze niile na-achị Saịdọn,+ na ndị eze na-achị ndị bi n’agwaetiti dị n’akụkụ oké osimiri. 23 Ndị ọzọ bụ ndị Didan,+ ndị Tima, ndị Bọz, na ndị niile na-akpụ ajị ndị dị n’akụkụ ntị ha abụọ.+ 24 Ndị ọzọkwa bụ ndị eze niile na-achị ndị Arab+ na ndị eze niile na-achị ndị si ebe dị iche iche bi n’ala ịkpa. 25 Ndị ọzọ bụ ndị eze niile na-achị ndị Zimraị, ndị eze niile na-achị ndị Ịlam,+ na ndị eze niile na-achị ndị Midia.+ 26 Ndị ọzọkwa bụ ndị eze niile na-achị ebe ugwu, ma ndị nọ nso ma ndị nọ ebe dị anya, n’otu n’otu, na alaeze niile ọzọ dị n’ụwa. Eze na-achị Shishak*+ ga-aṅụkwa mmanya ahụ mgbe ndị ọzọ a niile ṅụchara.
27 “Gwakwa ha, sị, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “Ṅụọnụ mmanya a, ṅụfeenụ ya ókè, gbọọnụ agbọ, daakwanụ n’ala ka unu ghara inwe ike ibili+ n’ihi agha m ga-eme ka a lụso unu.”’ 28 Ọ bụrụkwa na ha ajụ ịnara gị iko ahụ, jụkwa ịṅụ mmanya dị n’ime ya, sị ha, ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “Unu ga-aṅụrịrị ya. 29 Ebe ọ bụ na obodo m ga-ebu ụzọ mee ka ọdachi dakwasị bụ obodo a na-anọ eto aha m,+ m̀ ga-ahapụ ịta unu ahụhụ?”’+
“Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị ‘Agaghị m ahapụ ịta unu ahụhụ, n’ihi na e nwere mma agha m na-akpọ ka ọ bịa gbuo ndị niile bi n’ụwa.’
30 “Buokwara ndị a amụma, sị ha,
‘Jehova ga-esi n’elu bigbọọ.
Ọ ga-esi n’ebe dị nsọ o bi mee ka a nụ olu ya.
Ọ ga-ebigbọ maka iwe ọ na-ewesa ụlọ ya dị n’ụwa.
Ọ ga-eji oké olu bụọ abụ yiri nke ndị na-azọchapụta mmanya
Iji gosi na o meriela ndị niile bi n’ụwa.’
31 Jehova kwukwara, sị, ‘Mkpọtụ a ga-eme ga-eru ebe ụwa sọtụrụ,
N’ihi na Jehova na mba niile nwere okwu.
Ọ ga-eji aka ya kpee mmadụ niile* ikpe.+
Ọ ga-emekwa ka e jiri mma agha gbuo ndị ajọ omume.’
32 Jehova nke ụsụụ ndị agha sịrị:
‘Ọdachi ga-esi n’otu mba ruo mba ọzọ.+
A ga-esikwa n’ebe ndị dị n’ime ime ụwa mee ka oké ifufe fewe.+
33 N’ụbọchị ahụ, ndị Jehova gburu ga-atọgbọrọ malite n’otu nsọtụ ụwa ruo na nsọtụ ọzọ nke ụwa. A gaghị eruru ha uju. A gaghịkwa achịkọta ha ma ọ bụ lie ha. Ha ga-aghọ nsị anụ n’elu ala.’
34 Ndị ọzụzụ atụrụ, beenụ ákwá, tiekwanụ mkpu ákwá.
Ndị a ma ama, bụ́ ndị so n’ìgwè atụrụ, tụrụọnụ onwe unu n’ala,
N’ihi na ụbọchị a ga-egbu unu na ụbọchị a ga-achụsasị unu eruola,
Unu ga-ada n’ala ka arịa dị oké ọnụ.
35 Ndị ọzụzụ atụrụ enweghị ebe ha ga-agbaba.
Ndị a ma ama, bụ́ ndị so n’ìgwè atụrụ, agaghịkwa agbapụli.
36 Geenụ ntị! Ndị ọzụzụ atụrụ na-eti mkpu,
Ndị a ma ama, bụ́ ndị so n’ìgwè atụrụ, na-etikwa mkpu ákwá,
N’ihi na Jehova na-ala ebe atụrụ na-ata ahịhịa n’iyi.
37 N’ihi ezigbo iwe Jehova na-ewe,
A gaghịzi enwe ihe dị ndụ n’ebe dị iche iche ahụ́ na-eru ndị mmadụ ala.
38 Ọ pụtala ka ọdụm nke si n’ọgba ya pụta,+
Ala ha aghọọ ihe na-awụ akpata oyi
N’ihi na o ji mma agha mesie ha ike.
O wesakwara ha ezigbo iwe.