Jeremaya
49 Jehova kwuru gbasara ndị Amọn,+ sị:
“Ọ̀ bụ na Izrel amụghị ụmụ?
Ka ọ̀ bụ na o nweghị onye ga-eketa ihe ya?
Gịnị mere Malkam+ ji weghara ala Gad?+
Gịnịkwa mere ndị na-efe ya ji biri n’obodo ndị dị n’Izrel?”
2 “Jehova kwuru, sị, ‘Oge na-abịa
Mgbe m ga-eme ka a nụ ụda opi agha* ndị na-alụso Raba+ bụ́ obodo ndị Amọn+ agha.
Obodo ahụ ga-aghọ ebe e bibiri ebibi,
A ga-agbakwa ime obodo ndị dị ya nso* ọkụ.’
Jehova kwukwara, sị, ‘Izrel ga-eweghara ala a napụrụ ya.’+
3 ‘Heshbọn, besiwe ákwá ike, n’ihi na e bibiela E-aị.
Ime obodo ndị dị Raba nso, tienụ mkpu ákwá.
Yirinụ ákwà iru uju.
Besienụ ákwá ike. Wagharịanụ n’ogige anụ ụlọ ndị e ji nkume gbaa,*
N’ihi na a ga-adọrọ Malkam n’agha,
Ya na ndị nchụàjà ya na ndị isi na-efe ya.+
4 Obodo ndị bi na ya na-anaghị erube isi,
Gịnị mere unu ji jiri ndagwurugwu unu ndị mmiri na-asọ na-etu ọnụ?
Unu tụkwasịrị akụ̀ unu obi,
Na-asị, “Ònye ga-abịa lụso anyị agha?”’”
5 “Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, kwuru, sị,
‘M ga-eme ka ndị niile gbara unu gburugburu mee unu ihe dị egwu.
A ga-achụsasị unu.
E nweghịkwa onye ga-akpọkọta ndị gbara ọsọ.’”
6 “Jehova kwukwara, sị, ‘Ma e mechaa, m ga-akpọkọta ndị Amọn a dọọrọ n’agha.’”
7 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru banyere Ịdọm, sị:
“Ọ̀ bụ na amamihe adịghịzi na Timan?+
Ezigbo ndụmọdụ ọ̀ kọla ụkọ n’ọnụ ndị na-aghọta ihe?
Amamihe ha ọ́ baghịzi uru?
8 Ndị bi na Didan,+ gbaanụ ọsọ, gbapụnụ.
Gbaganụ ebe dị n’ime ime zoo,
N’ihi na m ga-eme ka ọdachi dakwasị Ịsọ
N’oge m ga-ata ya ahụhụ.
9 Ọ bụrụ na ndị na-aghọ mkpụrụ vaịn abata n’ime gị,
Ọ̀ bụ na ha agaghị aghọfọ mkpụrụ?
Ọ bụrụ na ndị ohi abịa n’abalị,
Ha ga-ewere naanị ihe ndị ha chọrọ.+
10 Ma m ga-agba Ịsọ ọtọ.
M ga-eme ka a mara ebe niile ọ na-ezo,
Ka ọ ghara inwe ebe ọ ga-ezo.
A ga-egbu ụmụ ya na ụmụnne ya na ndị agbata obi ya.+
Ha agaghịzi adị.+
11 Hapụrụ m ụmụaka gị na-enweghị nna.
M ga-echebe ha ndụ.
Ụmụ nwaanyị isi mkpe nọ n’ime gị ga-atụkwasịkwa m obi.”
12 N’ihi na Jehova kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ndị a na-amaghị ikpe ga-aṅụrịrị ihe dị n’iko na-egosi na iwe ji m, è kwesịrị ịhapụ gịnwa kpamkpam n’ataghị gị ahụhụ? A gaghị ahapụ gị n’ataghị gị ahụhụ, n’ihi na ị ga-aṅụrịrị ihe dị n’iko ahụ.”+
13 Jehova sịrị, “Ejirila m onwe m ṅụọ iyi na a ga-akọcha Bọzra, laa ya n’iyi, jiri ya na-abụ ọnụ. Ihe a a ga-eme ya ga-ejukwa ndị mmadụ anya.+ A ga-alakwa obodo ya niile n’iyi ruo mgbe ebighị ebi.”+
14 E nwere ozi m nụrụ Jehova ziri.
E nwekwara onye ozi e zigara ná mba dị iche iche, ya ana-asị:
“Zukọtanụ, lụso Ịdọm agha.
Jikerenụ ịlụso ya agha.”+
15 “Lee, emeela m ka ị ghara ịbụ ihe ọ bụla n’anya mba dị iche iche,
Meekwa ka ndị mmadụ na-eleda gị anya.+
16 Onye bi n’ebe mgbaba nke dị na nkume dị elu,
Onye bi n’elu elu ugwu,
Ụjọ i mere ka a na-atụ gị
Na mpako nke juru gị obi eduhiela gị.
Ọ bụ eziokwu na ị kpara akwụ́ gị n’ebe dị elu ka ugo,
M ga-akwatu gị ebe ahụ.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
17 “Ihe a ga-eme Ịdọm ga-eju ndị mmadụ anya.+ Onye ọ bụla nke na-agafe n’obodo a ga-ekporopụ anya na-ele ya, na-afụkwa mkpọrọhịhị n’ihi ahụhụ niile a tara ya. 18 Otú ahụ a na-enweghị onye bi na Sọdọm na Gọmọra na obodo ndị dị ha nso+ mgbe e bibichara ha, ka a na-agaghị enwe onye ọbịa ma ọ bụ onye ọ bụla ọzọ ga-ebi n’Ịdọm.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
19 “Otú ahụ ọdụm si esi n’oké ọhịa dị n’akụkụ Osimiri Jọdan apụta,+ ka a ga-enwe onye ga-abịa ibibi ebe a rụsiri ike anụmanụ na-ata ahịhịa n’Ịdọm. Ma, m ga-eme ka onye ahụ si ebe ahụ gbaa ọsọ n’otu ntabi anya. M ga-ahọpụtakwa onye ga na-achị ya. Ònye dị ka m? Ònye ga-amakwa m aka? Olee onye ọzụzụ atụrụ ga-emeli ka m ghara ime ihe m chọrọ ime?+ 20 N’ihi ya, nụrụnụ ihe Jehova kpebiri ime Ịdọm na ihe o bu n’obi ime ndị bi na Timan:+
N’eziokwu, a ga na-akpụrụ ụmụ atụrụ si n’ìgwè atụrụ ha.
Ọ ga-eme ka ebe ha na-ata ahịhịa tọgbọrọ nkịtị n’ihi ihe ndị bi na ha mere.+
21 Mgbe ha ga-ada, ụwa ga-ama jijiji n’ihi ụda ọdịda ha.
A ga-eti mkpu ákwá.
Ụda ya ga-eruchadị n’Oké Osimiri Uhie.+
22 Onye iro ga-efeli ma fedata n’ike buru ihe otú ugo si eburu.+
Ọ ga-agbasakwa nku ya ka o buru Bọzra.+
N’ụbọchị ahụ, obi ga na-akụ ndị agha Ịdọm kpum kpum
Otú ọ na-akụ nwaanyị ime na-eme.”
23 Ihe a ka e kwuru banyere Damaskọs:+
“Ihere emeela Hemat+ na Apad,
N’ihi na ha anụla akụkọ ọjọọ.
Obi awụnyela ha n’afọ.
Oké osimiri na-eme mkpọtụ. O nweghịkwa ike ịda jii.
24 Obi esighịzi Damaskọs ike.
Ọ tụgharịala ka ọ gbalaga. Ezigbo ụjọ ejidela ya.
Ọ nọ n’ahụhụ. Ahụ́ na-egbukwa ya mgbu
Otú ọ na-egbu nwaanyị na-amụ nwa.
25 Gịnị mere na ndị mmadụ agbapụbeghị n’obodo a na-aja mma,
Bụ́ obodo ndị bi na ya na-enwe aṅụrị?
26 Ụmụ okorobịa ya ga-ada n’ámá ya dị iche iche.
A ga-egbukwa ndị agha ya niile n’ụbọchị ahụ.” Ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru ihe a.
27 “M ga-esunye mgbidi Damaskọs ọkụ.
Ọkụ ahụ ga-erepịakwa ụlọ elu Ben-hedad.”+
28 E nwere ihe Jehova kwuru banyere Kida+ na alaeze Hezọ, bụ́ ndị Nebukadneza* eze Babịlọn meriri. Ọ sịrị:
“Bilienụ gaa Kida.
Gbuokwanụ ndị bi n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ.
29 A ga-anara ha ụlọikwuu ha, ìgwè ewu na atụrụ ha,
Ákwà ụlọikwuu ha na ngwongwo ha niile.
A ga-anapụkwa ha kamel ha.
Ndị mmadụ ga na-etikwa mkpu, sị, ‘Ụjọ dị ebe niile!’”
30 Jehova kwuru, sị, “Ndị bi na Hezọ,
Gbaanụ ọsọ. Gbaganụ ebe dị anya. Gbaganụ ebe dị n’ime ime.
N’ihi na Nebukadneza* eze Babịlọn akpaala nkata ihe ọ ga-eme unu.
O chepụtakwala ihe ọ ga-eme unu.”
31 Jehova kwukwara, sị, “Bilienụ lụso mba bi n’udo,
Ndị obi rukwara ala, agha.”
Ha enweghị ibo ụzọ na ihe e ji atụchi ụzọ. Ha bi naanị ha.
32 A ga-achịkọrọ kamel ha,
Chịkọrọkwa ìgwè anụ ụlọ ha.
M ga-achụsasị ha ebe niile,
Ya bụ, ndị kpụrụ ajị ndị dị n’akụkụ ntị ha abụọ akpụ.+
M ga-emekwa ka ọdachi si ebe niile dakwasị ha.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
33 “Hezọ ga-aghọ ọgba nkịta ọhịa.
Ọ ga-atọgbọrọkwa nkịtị ruo mgbe ebighị ebi.
A gaghị enwe onye ọbịa ga-ebi na ya.
A gaghịkwa enwe onye ọ bụla ọzọ ga-ebi na ya.”
34 E nwere ihe Jehova gwara Jeremaya onye amụma gbasara Ịlam+ n’oge Zedekaya malitere ịchị+ Juda. Ọ sịrị: 35 “Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, ‘M ga-agbaji ụta ndị Ịlam,+ bụ́ ebe ike ha dị.* 36 M ga-eme ka ifufe si n’akụkụ anọ nke ụwa fee* n’Ịlam. M ga-ejikwa ifufe ndị a chụsasịa ha. Ọ dịghị mba ndị Ịlam a chụsasịrị achụsasị na-agaghị aga.’”
37 Jehova kwukwara, sị, “M ga-eme ka ụjọ jide ndị Ịlam n’ihu ndị iro ha nakwa n’ihu ndị na-achọ igbu ha.* M ga-ewesa ha ezigbo iwe, mee ka ọdachi dakwasị ha. M ga-emekwa ka mma agha na-achụ ha ruo mgbe m bibichara ha.”
38 Jehova sịrị, “M ga-ebusa ocheeze m n’Ịlam.+ M ga-egbukwa eze ya na ndị isi ya.”
39 “Ma n’oge ikpeazụ, m ga-akpọkọta ndị Ịlam a dọọrọ n’agha.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.