17Mgbe Ebram gbara afọ iri itoolu na itoolu, Jehova pụtara ìhè n’ihu Ebram wee sị ya:+ “Abụ m Chineke bụ́ Onye Pụrụ Ime Ihe Niile.+ Jee ije n’ihu m, bụrụkwa onye na-enweghị ntụpọ.+
3 “Ana m arịọ gị arịrịọ, Jehova, biko, cheta+ otú m si jiri eziokwu+ na obi zuru ezu+ jee ije+ n’ihu gị, ọ bụkwa ihe dị mma n’anya gị ka m mere.”+ Hezekaya wee malite ịkwasi ákwá ike.+
3 Eze wee guzoro n’akụkụ ogidi+ wee ṅụọ iyi+ n’ihu Jehova na ha ga na-eso+ Jehova, na ha ga-ejikwa obi ha dum+ na mkpụrụ obi ha dum+ na-edebe ihe o nyere n’iwu+ na ihe àmà ya+ na ụkpụrụ ya+ site n’ịdị na-edebe ihe e kwuru n’ọgbụgba ndụ a nke e dere n’akwụkwọ a.+ Mmadụ niile wee soro ṅụọ iyi ahụ.+