Akwụkwọ Ozi Mbụ E Degaara Timoti
2 Ihe mbụ m na-agwa unu bụ ka unu na-ekpe ekpere maka ụdị mmadụ niile, na-ekele Chineke maka ha, na-arịọsikwa ya arịrịọ ike ka o nyere ha aka. 2 Na-ekpekwanụ ekpere a maka ndị eze na ndị niile nọ n’ọkwá ukwu,+ ka ahụ́ wee ruo anyị ala, anyị ebirikwa n’udo, jiri obi anyị niile na-efe Chineke.+ 3 Ihe a dị mma n’anya Chineke, Onye Nzọpụta anyị.+ Ọ na-anabatakwa ya. 4 Ọ bụ uche ya ka a zọpụta ụdị mmadụ niile,+ ka ha marakwa eziokwu nke ọma. 5 E nwere otu Chineke,+ nweekwa otu onye ogbugbo+ n’etiti Chineke na mmadụ,+ ya bụ, Kraịst Jizọs.+ 6 O ji ndụ ya chụọ àjà, si otú ahụ nye ihe dabara adaba a ga-eji agbapụta mmadụ niile.*+ Ndị mmadụ ga-ekwukwa gbasara ihe a mgbe oge ya ruru. 7 Chineke họpụtara m ka m na-ezisa ihe a,+ bụrụkwa onyeozi.+ Ọ họpụtakwara m ka m kụziere ndị mba ọzọ gbasara eziokwu a+ nakwa inwe okwukwe na Chineke. Ihe a m na-ekwu bụ eziokwu, ọ bụghị ụgha.
8 N’ihi ya, achọrọ m ka ọ bụrụ ụmụ nwoke ga na-ekpe ekpere n’ebe niile unu zukọrọ,* na-eweli aka ha dị nsọ elu,+ n’eweghị iwe,+ n’arụghịkwa ibe ha ụka.+ 9 M chọkwara ka ụmụ nwaanyị na-eji ejiji dị mma, nke na-egosi na ha na-emeru ihe n’ókè ma na-ele ihe anya otú dị mma,* ọ bụghị ịkpawa ụdị isi dị iche iche na iji ọlaedo ma ọ bụ nkume pel na-achọ onwe ha mma ma ọ bụkwanụ iyi uwe dị ezigbo oké ọnụ.+ 10 Kama ha kwesịrị ịna-eme ihe dị mma otú ụmụ nwaanyị ndị na-efe Chineke kwesịrị ịna-eme, si otú ahụ na-achọ onwe ha mma.+
11 Mgbe a na-akụzi ihe, ka ụmụ nwaanyị nọrọ jụụ,* na-erubere ụmụ nwoke isi.+ 12 Enyeghị m nwaanyị ikike izi ihe ma ọ bụ ịchị nwoke, kama ka ọ na-agbachi nkịtị.*+ 13 N’ihi na e bu ụzọ kee Adam tupu e kee Iv.+ 14 Ọ bụghịkwa Adam ka a ghọgburu, kama, ọ bụ Iv ka a ghọgburu kpamkpam,+ ya emebie iwu Chineke. 15 Ma, ịmụ nwa ga-abara nwaanyị uru maka na ọ ga-eme ka ọ ghara ime ihe ọjọọ,+ ma ọ bụrụhaala na o* nwere okwukwe, hụ ndị ọzọ n’anya, dị nsọ, na-elekwa ihe anya otú dị mma.*+