Jeremaya
9 A sị nnọọ na isi m bụ mmiri,
Anya m abụrụ isi iyi nke na-agbapụta anya mmiri,+
M gaara na-ebere ndị obodo anyị e gburu egbu ákwá
Ehihie na abalị.
2 A sị nnọọ na m nwere ebe ndị njem na-arahụ n’ala ịkpa,
M gaara ahapụ ndị obodo m, si ebe ha nọ pụọ,
N’ihi na ha niile na-akwa iko.+
Ha niile na-aghọ aghụghọ.
3 Ha na-adị njikere ịgha ụgha otú onye kwere ụta na-adị njikere ịgbapụ akụ́.
Ihe juru n’obodo a bụ ụgha. E nweghị onye na-akwụwa aka ọtọ.+
Jehova kwuru, sị, “Ha na-esi n’otu ihe ọjọọ gaa n’ihe ọjọọ ọzọ.
Ha ejighịkwa m kpọrọ ihe.”+
4 “Onye ọ bụla n’ime unu kpachara anya n’ebe onye agbata obi ya nọ,
N’ihi na onye agbata obi unu nke ọ bụla bụ onye nkwutọ.+
Unu atụkwasịkwala nwanne unu ọ bụla obi,
N’ihi na nwanne unu nke ọ bụla bụ onye aghụghọ.+
5 Onye ọ bụla na-aghọ onye agbata obi ya aghụghọ.
O nweghịkwa onye na-ekwu eziokwu.
Ha akụzierela ire ha otú e si agha ụgha.+
Ha na-eji ike ha niile eme ihe ọjọọ.
6 I bi n’etiti ndị aghụghọ.
Ha na-aghọ aghụghọ, jụkwa ịmara m.” Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
7 N’ihi ya, Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị:
“M ga-agbaze ha, nyochaakwa ha.+
Olee ihe ọzọ m ga-emere ndị m?
8 Ire ha bụ akụ́ e ji agbagbu mmadụ. Ha jikwa ya aghọ aghụghọ.
Onye ọ bụla n’ime ha na-eji ọnụ ya agwa onye agbata obi ya na udo dị.
Ma n’obi ya, ọ na-agbakọ otú ọ ga-esi zoo chebiri ya.”
9 Jehova kwuru, sị: “Ọ̀ bụ na mụ ekwesịghị ime ka ha zaa ajụjụ maka ihe ndị a?
Ka ọ̀ bụ na mụ* ekwesịghị ịta mba dị otú a ahụhụ maka ihe ha na-eme?+
10 M ga-ebere ugwu dị iche iche ákwá, beekwara ha ákwá arịrị.
M ga-abụrụ ala anụmanụ na-ata ahịhịa ndị dị n’ala ịkpa abụ iru uju,
N’ihi na a gbaala ha ọkụ. E nweghịzi onye na-esi na ha agafe.
A naghịkwa anụ ubé anụ ụlọ na ha.
Nnụnụ na anụ ọhịa dị iche iche agbapụchaala na ha. Ha anọghịzi ebe ahụ.+
11 M ga-eme ka Jeruselem bụrụ ikpo nkume+ na ọgba nkịta ọhịa.+
M ga-emekwa ka obodo ndị dị na Juda tọgbọrọ nkịtị, n’enweghị onye bi na ha.+
12 È nwere onye ma ihe nke ga-aghọta ihe a?
È nwere onye Jehova ji ọnụ ya gwa okwu nke ga-akọ ya?
Gịnị mere ala a ji laa n’iyi?
Gịnị mere o ji kpọọ nkụ ka ala ịkpa,
Nke na e nweghị onye na-esi na ya agafe?”
13 Jehova wee sị: “Ọ bụ n’ihi na ha jụrụ iwu* m nyere ha. Ha edebeghị ya. Ha emeghịkwa ihe m kwuru. 14 Kama, ha kpọrọ ekwo nkụ na-eme ihe dị ha n’obi,+ na-esokwa Bel, otú ndị nna nna ha kụziiri ha ka ha na-eme.+ 15 N’ihi ya, Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘M ga-eme ka ndị a taa ahịhịa na-elu ilu. M ga-emekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsí.+ 16 M ga-achụga ha ná mba ndị ha na ndị nna nna ha na-amaghị.+ M ga-emekwa ka e jiri mma agha na-achụ ha ruo mgbe m bibichara ha.’+
17 Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị,
‘Chebaranụ ihe na-emenụ echiche.
Kpọkọtanụ ụmụ nwaanyị na-abụ abụ iru uju.+
Ziekwanụ ụmụ nwaanyị ndị ọrụ ha bụ ibe ákwá ka ha bịa,
18 Ka ha bịa ọsọ ọsọ beere anyị ákwá arịrị.
Ka anya mmiri si anyị n’anya na-asọdata,
Ka anya mmiri sikwa ná mbubere anya anyị na-agbapụta.+
19 A nụrụ ka a na-ebe ákwá arịrị na Zayọn, sị:+
“Ewoo, nke anyị na-eme agwụla!
Ihere emegbuola anyị!
N’ihi na a chụpụla anyị n’ala anyị, kụtuokwa ụlọ anyị.”+
20 Ụmụ nwaanyị, nụrụnụ okwu Jehova.
Ka ntị unu nụrụ okwu si ya n’ọnụ.
Kụzierenụ ụmụ unu ndị nwaanyị otú e si ebe ákwá arịrị a.
Ka nwaanyị ọ bụla kụziekwara nwaanyị ibe ya abụ iru uju a.+
21 N’ihi na ọnwụ esila na windo anyị bata.
Ọ batala n’ụlọ elu anyị
Ka o gbuchapụ ụmụntakịrị anyị n’okporo ámá,
Gbuchapụkwa ụmụ okorobịa anyị n’ámá obodo.’+
22 Kwuo, sị, ‘Jehova kwuru, sị:
“Ozu ndị mmadụ ga-awụsa n’ala dị ka nsị anụ,
N’enweghị onye ga-ebukọta ha.+
Ha ga-awụsa n’ala ka ùkwù ọka onye na-ewe ihe ubi ka gbutuchara egbutu.”’”
23 Jehova kwuru, sị:
“Ka onye ma ihe ghara ịna-eme ọnụ n’ihi ihe ọ ma.+
Ka dike ghara ịna-eme ọnụ n’ihi ike ya,
Ka ọgaranya gharakwa ịna-eme ọnụ n’ihi akụnụba ya.”+
24 “Kama, onye na-eme ọnụ, ya mewe ọnụ
Maka na ọ ma m, mara ihe gbasara m nke ọma,+
Marakwa na ọ bụ mụnwa bụ Jehova, onye na-egosi ndị bi n’ụwa ịhụnanya,* onye na-ekpere ha ikpe ziri ezi, na-egosikwa ha na m bụ onye ezi omume.+
Ọ bụ ihe ndị a na-amasị m.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.
25 Jehova kwuru, sị, “Oge na-abịa mgbe m ga-eme ka ndị niile e biri úgwù, ma, ha aka bụrụ ndị a na-ebighị úgwù, zaa ajụjụ ihe ha mere,+ 26 ya bụ, ndị Ijipt,+ ndị Juda,+ ndị Ịdọm,+ ndị Amọn,+ ndị Moab,+ na ndị niile na-akpụ ajị ndị dị n’akụkụ ntị ha abụọ, bụ́ ndị bi n’ala ịkpa.+ N’ihi na mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị úgwù, ndị Izrel niile bụkwa ndị a na-ebighị úgwù n’obi.”+