Abụ Ọma
Abụ ọma. Abụ Devid. Abụ e ji nyefee ụlọ ya.*
30 Jehova, m ga-eto gị, n’ihi na ị dọpụtala m.
I kweghị ka ndị iro m ṅụrịa ọṅụ n’ihi ihe mere m.+
2 Jehova Chineke m, m besaara gị ákwá ka i nyere m aka, i wee gwọọ m.+
3 Jehova, i sila n’ili* dọpụta m.*+
I dowere m ndụ. I mere ka m ghara imikpu n’olulu.*+
4 Unu ndị na-erubere Jehova isi,+ bụkuonụ ya abụ.
Mmadụ nwere ike ibe ákwá ná mgbede, ma e ruo n’ụtụtụ, ya etie mkpu ọṅụ.+
6 Mgbe obi ruru m ala, m sịrị:
“E nweghị ihe ga-eme ka m daa.”*
7 Jehova, mgbe ị na-emere m amara,* i mere ka m sie ike ka ugwu.+
Ma mgbe i zooro m ihu gị, ụjọ jidere m.+
8 Jehova, ọ bụ gị ka m nọ na-akpọku.+
Ọ bụkwa gị, Jehova, ka m nọ na-arịọ ka i meere m amara.
9 Ọ bụrụ na m nwụọ, olee uru ọ bara? Olee uru ọ ga-aba ma m gbadaa n’olulu?*+
Ájá ọ̀ ga-eto gị?+ Ọ̀ ga-ekwu na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi?+
10 Jehova, biko, gee ntị ma meere m amara.+
Jehova, biko nyere m aka.+
11 I meela ka m kwụsị iru uju gbawazie egwú.
I yipụla m ákwà iru uju m yi ma yiwe m ọṅụ ka uwe,
Jehova Chineke m, m ga-eto gị ruo mgbe ebighị ebi.