3 Ma Devid ṅụrụ iyi+ ọzọ, sị: “Ọ ghaghị ịbụ na nna gị maara na ihe m dị gị mma,+ ọ ga-asịkwa, ‘Ekwela ka Jọnatan mata ihe a ka ọ ghara iwute ya.’ Ma, n’ezie, dị nnọọ ka Jehova dị ndụ,+ dịkwa nnọọ ka mkpụrụ obi gị dị ndụ,+ ọ bụ naanị ihe dị ka otu nzọụkwụ dị n’agbata mụ na ọnwụ!”+