Jọn
1 Okwu ahụ+ nọ ná mmalite,+ Okwu ahụ na Chineke nọkwa,+ Okwu ahụ bụkwa chi.+ 2 Onye a na Chineke nọ+ ná mmalite.+ 3 Ihe niile si n’aka ya dịrị,+ ọ dịghị ọbụna otu ihe e mere ka ọ dịrị ma ọ́ bụghị site n’aka ya.
Ihe e mere ka ọ dịrị 4 site n’aka ya bụ ndụ,+ ndụ ahụ bụkwa ìhè+ ụmụ mmadụ. 5 Ìhè ahụ na-enwukwa n’ọchịchịrị,+ ma ọchịchịrị ahụ akaghị ya ike.
6 Otu nwoke biliri, bụ́ onye e zitere dị ka onye nnọchiteanya nke Chineke:+ aha ya bụ Jọn.+ 7 Nwoke a bịara ịgba àmà,+ ka o wee gbaa àmà banyere ìhè ahụ,+ ka ụdị mmadụ niile wee kwere site na ya.+ 8 Ya onwe ya abụghị ìhè ahụ,+ kama ọ bịara ka ọ gbaa àmà+ banyere ìhè ahụ.
9 Ezi ìhè+ ahụ nke na-enye ụdị mmadụ ọ bụla+ ìhè+ na-abịa n’ụwa. 10 Ọ nọrọ n’ụwa,+ ụwa sitekwara n’aka ya dịrị,+ ma ụwa amaghị ya. 11 Ọ bịara n’obodo a mụrụ ya, ma ndị nke ya anabataghị ya.+ 12 Otú ọ dị, ọ bụ ndị niile nabatara ya+ ka o nyere ikike ịghọ ụmụ Chineke,+ n’ihi na ha nwere okwukwe n’aha ya;+ 13 a mụkwara ha, ọ bụghị site n’ọbara ma ọ bụ site n’ọchịchọ nke anụ ahụ́ ma ọ bụ site n’ọchịchọ nke nwoke, kama ọ bụ site na Chineke.+
14 Ya mere, Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ́+ ma bie n’etiti anyị. Anyị hụkwara ebube ya, bụ́ ụdị ebube nke ọkpara a mụrụ naanị ya+ na-enweta n’aka nna ya; o jupụtakwara n’obiọma na-erughịrị mmadụ na eziokwu.+ 15 (Jọn gbara àmà banyere ya, ee, o tiri mkpu n’ezie—ọ bụ ya kwuru ya—sị: “Onye na-abịa n’azụ m agafewo n’ihu m, n’ihi na ọ dị adị tupu mụ onwe m.”)+ 16 N’ihi na anyị niile nwetara ihe n’ihe o nwejuru enweju,+ ya bụ, obiọma na-erughịrị mmadụ n’elu obiọma na-erughịrị mmadụ.+ 17 N’ihi na e nyere Iwu ahụ site n’aka Mozis,+ e mere ka obiọma na-erughịrị mmadụ+ na eziokwu+ ahụ dịrị site n’aka Jizọs Kraịst. 18 Ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla;+ ọ bụ chi ahụ a mụrụ naanị ya+ nke nọ n’obi+ Nna ya kọwara ya.+
19 Nke a bụkwa àmà Jọn gbara mgbe ndị Juu si na Jeruselem zipụ ndị nchụàjà na ndị Livaị ka ha gaa jụọ ya, sị: “Ònye ka ị bụ?”+ 20 O kwuru ya, ọ gọghịkwa agọ, kama o kwuru, sị: “Abụghị m Kraịst.”+ 21 Ha wee jụọ ya, sị: “Ònyekwanụ ka ị bụ? Ị̀ bụ Ịlaịja?”+ O wee sị: “Abụghị m.” “Ị̀ bụ Onye Amụma Ahụ?”+ O wee zaa, sị: “Ee e!” 22 Ya mere, ha sịrị ya: “Ònye ka ị bụ? ka anyị wee mara ihe anyị ga-aza ndị zitere anyị. Olee ihe ị na-ekwu banyere onwe gị?”+ 23 O wee sị: “Abụ m olu onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị, ‘Meenụ ka ụzọ Jehova kwụrụ ọtọ,’ dị ka Aịzaya onye amụma kwuru.”+ 24 Ọ bụ ndị Farisii zipụrụ ndị ahụ. 25 Ya mere, ha jụrụ ya ajụjụ, sị ya: “Gịnịzi mere i ji na-eme baptizim+ ma ọ bụrụ na ọ bụghị gị bụ Kraịst ma ọ bụ Ịlaịja ma ọ bụ Onye Amụma Ahụ?” 26 Jọn zara ha, sị: “Eji m mmiri na-eme baptizim. Ọ dị onye guzo n’etiti unu,+ onye unu na-amaghị,+ 27 onye na-abịa n’azụ m, ma erughị m eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ onye ahụ.”+ 28 Ihe ndị a mere na Betani n’ofe Jọdan, bụ́ ebe Jọn nọ na-eme baptizim.+
29 N’echi ya, ọ hụrụ Jizọs ka ọ na-abịakwute ya, o wee sị: “Lee Nwa Atụrụ+ Chineke nke na-ewepụ mmehie+ nke ụwa!+ 30 Onye a bụ onye ahụ m kwuru banyere ya, sị, Otu nwoke na-abịa n’azụ m, bụ́ onye gafeworo n’ihu m, n’ihi na ọ dị adị tupu mụ onwe m.+ 31 Mụ onwe m amadịghị ya, ma ihe mere m ji bịa were mmiri na-eme baptizim bụ ka e mee ka onye ahụ pụtara Izrel ìhè.”+ 32 Jọn gbakwara àmà, sị: “Ahụrụ m mmụọ nsọ ka o si n’eluigwe na-efedata dị ka nduru, ọ dịgidekwara n’isi ya.+ 33 Mụ onwe m amadịghị ya, ma Onye ahụ nke zitere m+ ka m jiri mmiri na-eme baptizim sịrị m, ‘Onye ọ bụla nke ị hụrụ ka mmụọ nsọ bịakwasịrị ma dịgide n’isi ya, ọ bụ onye a bụ onye ji mmụọ nsọ na-eme baptizim.’+ 34 Ahụwo m ya, agbawokwa m àmà na onye a bụ Ọkpara Chineke.”+
35 N’echi ya kwa, Jọn na mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ ya guzo, 36 mgbe ọ hụkwara ka Jizọs na-abịa, ọ sịrị: “Lee Nwa Atụrụ+ Chineke!” 37 Mmadụ abụọ ahụ na-eso ụzọ ya nụkwara mgbe o kwuru ya, ha wee soro Jizọs. 38 Jizọs wee tụgharịa, mgbe ọ hụrụ ka ha na-eso ya, ọ sịrị ha: “Gịnị ka unu na-achọ?” Ha sịrị ya: “Rabaị, (nke pụtara, ma a sụgharịa ya, Onye Ozizi,) olee ebe i bi?” 39 O wee sị ha: “Bịanụ, unu ga-ahụ ya.”+ Ha wee jee hụ ebe o bi, ha wee nọnyere ya n’ụbọchị ahụ; ọ bụ ihe dị ka awa nke iri.* 40 Andru+ nwanne Saịmọn Pita bụ otu n’ime mmadụ abụọ ahụ nụrụ ihe Jọn kwuru wee soro Jizọs. 41 Ihe mbụ onye a mere bụ ịchọta nwanne ya, bụ́ Saịmọn, wee sị ya: “Anyị ahụwo Mesaya ahụ”+ (nke pụtara, ma a sụgharịa ya, Kraịst).+ 42 O duuru ya gakwuru Jizọs. Mgbe Jizọs lere+ ya anya, ọ sịrị: “Ị bụ Saịmọn+ nwa Jọn;+ a ga-akpọ gị Sifas” (nke bụ́ Pita ma a sụgharịa ya).+
43 N’echi ya, ọ chọrọ ịgawa Galili. Ya mere, Jizọs hụrụ Filip+ wee sị ya: “Bụrụ onye na-eso ụzọ m.”+ 44 Filip bụ onye Betseida,+ onye obodo Andru na Pita. 45 Filip hụrụ Nataniel+ wee sị ya: “Anyị ahụwo onye ahụ Mozis dere banyere ya n’Iwu ahụ,+ onye Ndị Amụma+ dekwara banyere ya, ya bụ, Jizọs, nwa Josef,+ onye Nazaret.” 46 Ma Nataniel sịrị ya: “Ọ̀ dị ihe ọma ọ bụla pụrụ isi na Nazaret pụta?”+ Filip wee sị ya: “Bịa hụrụ.” 47 Jizọs hụrụ ka Nataniel na-abịakwute ya. O wee kwuo banyere ya, sị: “Lee onye Izrel n’ezie, onye aghụghọ ọ bụla na-adịghị n’ime ya.”+ 48 Nataniel sịrị ya: “Olee otú i si mara m?” Jizọs zara ya, sị: “Tupu Filip akpọọ gị, mgbe ị nọ n’okpuru osisi fig, ahụrụ m gị.” 49 Nataniel wee sị ya: “Rabaị, ị bụ Ọkpara Chineke,+ ị bụ Eze+ Izrel.” 50 Jizọs wee sị ya: “Ọ̀ bụ maka na m gwara gị na m hụrụ gị n’okpuru osisi fig mere i ji kwere? Ị ga-ahụ ihe ka ihe ndị a ukwuu.” 51 Ọ gwakwuru ya, sị: “N’ezie, n’ezie, ana m asị unu, Unu ga-ahụ ka eluigwe meghere, hụkwa ka ndị mmụọ ozi+ Chineke na-arịgo ma na-arịdakwute Nwa nke mmadụ.”+