Ilu
18 Onye na-anọ* iche na-achọ ihe ga-abara naanị ya uru.
Ọ naghị anabata ezigbo amamihe.*
2 Onye nzuzu anaghị achọ ịghọta ihe.
Ọ bụ naanị ihe dị ya n’obi ka ọ na-achọ ikwu.+
3 Onye ajọ omume bata, a na-eleda mmadụ anya.
Mmadụ mewe iberiibe, a na-emenye ya ihere.+
4 Okwu na-esi mmadụ n’ọnụ apụta yiri mmiri miri emi.+
Ebe e si enweta amamihe dị ka iyi nke na-asọ asọ.
8 Okwu onye na-ekwutọ mmadụ dị ka nri na-atọ ụtọ.+
A na-elo ya ngwa ngwa, ya abanye n’afọ.+
10 Aha Jehova bụ ụlọ elu siri ike.+
Onye ezi omume na-agbaba na ya, e chebe ya.+
11 Akụ̀ onye ọgaranya bụụrụ ya obodo a rụsiri ike.
N’anya ya, ọ dị ka mgbidi nke na-echebe ya.+
12 Mmadụ na-ebu ụzọ adị mpako tupu ya adaa,+
Mmadụ na-ebukwa ụzọ adị umeala n’obi tupu a kwanyere ya ùgwù.+
13 Ọ bụrụ na mmadụ azaa okwu tupu ya anụ ihe merenụ,
Ọ na-egosi na ọ dị iberiibe, na-emechukwa onwe ya ihu.+
14 Mmadụ ga-edili ọrịa ma ọ bụrụ na obi siri ya ike,+
Ma è nwere ihe mmadụ ga-emeli ma ọ bụrụ na obi dara ya mbà?+
17 Mmadụ na ibe ya nwee okwu, ọ na-adị ka ọ̀ bụ onye bu ụzọ kwuo ihe na-ese na-ekwu eziokwu+
Ruo mgbe onye nke ọzọ bịara gbaa ya ajụjụ.+
19 Ọ na-esi ezigbo ike ime ka obi jụrụ nwanne e mejọrọ karịa otú ọ na-esi ike imeri obodo a rụsiri ike.+
Esemokwu na-ekewakwa ndị mmadụ otú ọnụ ụzọ ámá a tụchiri atụchi n’obodo a rụsiri ike si ekewa ndị nọ n’ime ya na ndị nọ n’èzí.+
20 Ihe mmadụ na-ekwu dị ka nri na-abanye ya n’afọ.+
Ihe ọ bụla ọ na-ekwu ga-adị ya n’isi.
21 Mmadụ nwere ike iji ire ya kwutere onwe ya ndụ ma ọ bụ ọnwụ.+
Ndị ọ na-amasị ikwu okwu ga-anata ụgwọ ihe ha kwuru.+
23 Onye dara ogbenye na-arịọ arịrịọ ma o kwuwe okwu,
Ma onye bara ọgaranya na-eji olu ike asa okwu.