4 “Shiol,” “Hedis” Ili nke Ihe Niile Bụ́ Mmadụ; Ili
Hibru, שאול (sheʼohlʹ); Grik, ᾅδης (haiʹdes); Latin, in·ferʹnus; Syriac, shiul
Ebe Iri Isii na Isii Shiol Pụtara
“Shiol” pụtara ugboro iri isii na isii ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Hibru, ya bụ, na Je 37:35; 42:38; 44:29, 31; Ọg 16:30, 33; Di 32:22; 1Sa 2:6; 2Sa 22:6; 1Ki 2:6, 9; Job 7:9; 11:8; 14:13; 17:13, 16; 21:13; 24:19; 26:6; Ọma 6:5; 9:17; 16:10; 18:5; 30:3; 31:17; 49:14, 14, 15; 55:15; 86:13; 88:3; 89:48; 116:3; 139:8; 141:7; Ilu 1:12; 5:5; 7:27; 9:18; 15:11, 24; 23:14; 27:20; 30:16; Ek 9:10; Sọ 8:6; Aịz 5:14; [7:11]; 14:9, 11, 15; 28:15, 18; 38:10, 18; 57:9; Ezi 31:15, 16, 17; 32:21, 27; Ho 13:14, 14; Em 9:2; Jo 2:2; Hab 2:5.
Ebe ndị “shiol” pụtara n’Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ ugboro iri isii na ise ọ pụtara n’ihe odide Hibru nke ndị Masora, tinyere otu ugboro ọ pụtara n’Aịzaya 7:11, bụ́ ebe e dere sheʼaʹlah, ya bụ, “rịọ.” Ma ọ bụrụ na a gbanwetụ ụdaume dị na ya, dị ka nsụgharị dị iche iche nke oge ochie mere, ọ ga-aghọ sheʼoʹlah, “n’ebe Shiol dị,” ma ọ bụ, “na Shiol.” N’ebe niile ọ pụtara, Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ dere okwu Hibru bụ́ sheʼohlʹ “shiol.” N’ọtụtụ ebe, Septuagint Grik sụgharịrị sheʼohlʹ haiʹdes.
Ọ bụ ezie na e nwere ọtụtụ okwu a sịrị na e si na ha nweta okwu Hibru bụ́ sheʼohlʹ, o yiri ka è si na ngwaa Hibru bụ́ שׁאל (sha·ʼalʹ), nke pụtara “ịchọ” ma ọ bụ “ịrịọ,” nweta ya. Nke a na-egosi na Shiol bụ ebe (ọ bụghị ọnọdụ) nke na-achọ mmadụ niile n’akpaghị ókè, n’ihi na ọ na-anabata ụmụ mmadụ nwụrụ anwụ n’ime ya. (Lee Rbi8, ihe e dere n’ala ala peeji na Jenesis 37:35 na Aịzaya 7:11.) Ọ dị n’ụwa, a na-ekwukarị banyere ya mgbe a na-ekwu banyere ndị nwụrụ anwụ, o dokwara anya na ihe ọ pụtara bụ ili nke ihe niile bụ́ mmadụ, ili, ma ọ bụ ebe dịịrị ndị nwụrụ anwụ n’ala (ọ bụghị n’osimiri). N’ụzọ dị iche, okwu Hibru bụ́ qeʹver pụtara otu ili ma ọ bụ otu ebe e liri ozu.—Je 23:4, 6, 9, 20.
Ebe Iri Hedis Pụtara
“Hedis,” nke pụtara ma eleghị anya “ebe a na-adịghị ahụ anya,” pụtara ugboro iri ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik, ya bụ, na Mt 11:23; 16:18; Lu 10:15; 16:23; Ọrụ 2:27, 31; Mkp 1:18; 6:8; 20:13, 14.
N’Ọrụ 2:27, nhota Pita hotara ihe e kwuru n’Abụ Ọma 16:10 na-egosi na Hedis na Shiol bụ otu ihe nakwa na ọ pụtara ili nke ihe niile bụ́ mmadụ (nke dị iche n’okwu Grik bụ́ taʹphos, ya bụ, otu ili). Okwu Latin nke ya na Hedis bụ otu ihe bụ in·ferʹnus (mgbe ụfọdụ inʹfe·rus). Ọ pụtara “ihe dị n’okpuru; ebe dị n’ala,” ihe ọ pụtakwara bụ ili. N’ihi ya, ya na okwu Grik na Hibru ndị ahụ bụ nnọọ otu ihe.
N’Akwụkwọ Nsọ nke si n’ike mmụọ nsọ, okwu bụ́ “Hedis” na “Shiol” na-ekwu banyere ọnwụ na ndị nwụrụ anwụ, ọ bụghị banyere ndụ na ndị dị ndụ. (Mkp 20:13) Okwu ndị a n’onwe ha enweghị ihe ọ bụla na-egosi ịnọ n’obi ụtọ ma ọ bụ n’ihe mgbu.